Nọgidenụ N'ime Jizọs - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Dị Ụbọchị AnọIhe Atụ

N'agbanyeghị na ọ bụ oge kacha mma n'afọ, dị ka egwú Ekeresimesi ahụ na-ekwu, a kà nwere mkpa ọ dị ikpe ekpere - mkpa ọ dị nke inye Chineke ekele maka ngozi Ya nile ma ọ bụ naanị ịrịọ maka enyemaka Ya n'ihazi ihe ma ọ bụ ijikwa ihe isi-ike nke oge ezumike a nwere ike iweta. Ekpere na-akpọté mkpụrụ obi anyị ka anyị mara maka ọnịnọ Chineke, ikwesị ntụkwasị obi Ya na ebe-mgbaba Ya.
Mana ọ dịtụla mgbe ị maghị ihe ị ga-ekpe n'ekpere? Ó nwere ike ịbụ na ekpere gị adịghịzi enwu gị òkù n'obi ma ọ bụ na ọ dịghịzi ihe ọhụrụ ị n'ekpe n'ekpere, ọ̀ dịkwá gị ka àga-asị na ị n'ekpe ekpere n'ezighị ezi? Obi ike gị n’ekpere gị ga-ewusi ike mgbe iji Okwu Chineke n'ekpe ekpere.
Akwụkwọ Nsọ jupụtara n’ekpere! Site na Jenesis ruo Mkpughe, anyị na-ahụ ekpere anyị nwere ike ibirì iji mee ka ndụ ime mmụọ anyị dị ndụ. Arịrịọ-ekpere ndị ahụ n'egosipụta ụdị mmetụta na ahụmahụ ọ bụla a pụrụ ichetụ n'echiche - legodi anya na Akwụkwọ Abụ Ọma!
Ka anyị na-agụ akụkọ, akụkọ ihe mere eme, abụ, na ilu gasị nke Akwụkwọ Nsọ n’ihu Chineke ma n'ege ntị n'ihe Mmụọ Nsọ na-agwa anyị, anyị ga-achọpụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara ndụ anyị, ụwa, na ndị anyị maara. Ka oge na-aga, ọ ga-abụ ihe n'adịghị ara ahụ ịtụgharị echiche ndị a ka ha bụrụ ekpere ozugbo.
Gụọ Luk 2:8-18. Kedụ otú i si nụ ma nwee ahụmahụ nke ozi ọma Jizọs? N’ime akụkọ a, otu mmụọ-ozi pụtara gosi otù ndị ọzụzụ-atụrụ n'arụsi ọrụ ike onwe ya ma kwupụta na ihe dị mkpa n'eme na Betlehem (v. 11). Ya mere ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ jiri gaa n’Obodo Devid, bụ́ ebe ha chọtara Jizọs, Meri na Josef. Ozugbo ha hụrụ Nwatakịrị ahụ, ha gagharịrị wee na-agwa onye ọ bụla ha maara gbasara ọmụmụ Jizọs na ihe ndị mmụọ ozi kwuru gbasara Ya (v 17-18).
Kedụ otù ị ga-esi na-akpa àgwà ka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ, na-agwa onye ọ bụla banyere Jizọs, karịsịa n’oge a n’afọ? Kpee ekpere ka Chineke rụọ ọrụ n'ime obi ndị ị maara. Bụrụ onye na-ege ntị nke ọma na enyi karịa ikpe ndị mmadụ ikpe. Gosipụta ozizi nke ozi-ọma site n'ije-ozị, a bụghị naanị ikwu okwu n'Ekeresimesi a. Kpee ekpere ka ọdịdị nke ndụ gị na mmekọrịta gị gasị nye aka dọta ndị mmadụ nso na Jizọs.
Iji mụtakwuo maka omume ime mmụọ nke ikpe Okwu Chineke dịka ekpere yana omume ndị ọzọ a kpọtụrụ aha na atụmatụ ihe ọgụgụ a, lelee Abide Bible Journals sitere n'aka Thomas Nelson .
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ekeresimesi na-abịa! Soro ya n'abịa bụ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa – ikwadebé maka na ime ememe nke ọmụmụ Jizọs. Mana eziokwu ahụ ọ̀ na-efunahú ka a n'eme nkwaghari n'oge ezumike, ịzụta onyinye ahụ zuru okè, ma ọ bụ ịchịkwa nnọkọ erimeri na anụmanụ gasị nke ezinụlọ? N'ọsọ ọsọ nke oge Ekeresimesi, nweta ụzọ ọhụrụ gasị iji soro Okwu Chineke na-akpakọrịta, gá adọtakwu gị nso na Ya n'ikpeazụ. Mee ka mkpụrụ obi gị teta site n'igụ atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a sitere na Abide Bible Journals nke Thomas Nelson.
More