Nọgidenụ N'ime Jizọs - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Dị Ụbọchị AnọIhe Atụ

Kwa afọ kalenda mmekọrịta anyị na mmadụ ibe anyị n'eju ọnụ ngwa ngwa ka o ruru oge a na afọ. Erimeri na aṅụmaṅụ anyị na ndị enyi, nnọkọ anyị na ezinụlọ anyị gasị, ọrụ gasị e kenyere anyị n'ebe ọrụ anyị, ememme ihe ụka gasị - echefukwala nri niile a n'esi na nhicha niile a n'eme na azụmahịa niile a n'eme na ndozi na ịchọ mma niile a n'eme. Anyị nọ ná mmegharị ahụ oge niile, nke na-eme ka ịmụrụ anya n'ụzọ ime mmụọ sie ike.
Oge Ekeresimesi a - anyị kwesịrị ịdị ka ehi.
Isi gịnị...ehi?!?
Cheenú banyere ya - ehi na-atagharí ọnụ ụbọchị niile. Ihe ndị n'edozi ahụ́ iji dị ndụ dị̀ ehi mkpa, ya mere ehi ji eji ndidi, jiri nwayọọ nwayọọ na mkpachapụ anya wee na-ata ahịhịa ndị ahụ ha si enweta nri, kama ịna elò nri ọ bụla e nyere ya. N’otu aka ahụ, kama ịna elò nri ime mmụọ anyị kwa ụbọchị, anyị kwesịrị iji nwayọọ n'amị ya, ‘na-ata’ Okwu Chineke ugboro ugboro n’ụbọchị dum. Nke a bụ ihe ndị edemede Akwụkwọ Nsọ na-akpọ ntụgharị uche. Okwu ọzọ bụ ịdị jii wee debe uche n'ofú ihe.
Ebumnobi nke ịdị jii wee debe uche n'ofú ihe bụ izu ike n'iru Chineke. Ige Ya nti kama ikwu okwu. Ịnọ jụụ na emeghị mkpọtụ, karịsịa n'oge a, bụ ihe a ga-eji ezigbo mgbalị wee mee. Mana Okwu Chineke bụ nri dị oké mkpa nye mkpụrụ obi anyị iji dị ndụ. Ka gị na Eziokwu Ya nọ ọdụ wee na-akpakọrịta, gị ana-ekwe ka ọ "gbarie" n'ime mkpụrụ obi gị, ọnịnọ Chineke n'ime ndụ gị na n'ime ụwa gbara gị gburugburu ga-adịkwu ìhè nye gị.
Gụọ Matiu 1:22-25 ugboro abụọ. Chọọ otu okwu ma ọ bụ nkebiokwu pụtara ìhè nye gị.
Ihe ọzọ ị ga-eme bụ, tụgharịa uche n'otu mpaghara nke ndụ gị ị nwere ike ijikọ okwu ma ọ bụ nkebiokwu ahụ ị họọrọ. Gịnị mere i ji họrọ okwu a ma hapụ ndị ọzọ, elee ka ọ si jikọọ na ndu gị? Kedụ ihe kpatara okwu a jiri dọta mmasị gị n'ebe ọ nọ n'oge ugbu a?
Mgbe ị mechara nke ahụ, kpee ekpere, rịọ Chineke ka O mee ka o doo anya ihe Ọ chọrọ ịgwa gị. Jiri nchekwube kpee ekpere ma were ndidi chere nzaghachi Ya.
N'ikpeazụ, gee ezigbo ntị ka gị na Mmụọ Chineke na anọkọ. Bịaghachi na edide ná njedebe ụbọchị. Ọ̀ dị ihe Chineke kpughekwurù gị ka ị nọ n'emekwu ntụgharị uche?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ekeresimesi na-abịa! Soro ya n'abịa bụ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa – ikwadebé maka na ime ememe nke ọmụmụ Jizọs. Mana eziokwu ahụ ọ̀ na-efunahú ka a n'eme nkwaghari n'oge ezumike, ịzụta onyinye ahụ zuru okè, ma ọ bụ ịchịkwa nnọkọ erimeri na anụmanụ gasị nke ezinụlọ? N'ọsọ ọsọ nke oge Ekeresimesi, nweta ụzọ ọhụrụ gasị iji soro Okwu Chineke na-akpakọrịta, gá adọtakwu gị nso na Ya n'ikpeazụ. Mee ka mkpụrụ obi gị teta site n'igụ atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a sitere na Abide Bible Journals nke Thomas Nelson.
More