Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nọgidenụ N'ime Jizọs - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Dị Ụbọchị AnọIhe Atụ

Abide in Jesus - 4-Day Advent Devotional

ỤBỌCHỊ 1 NKE 4

Ekeresimesi nọ ebe a! Ebe ọ bụ oge ọṅụ mgbe Ndị Kraịst n'eme ememe ọmụmụ Jizọs, nrụgide, nchekasị, na usoro ọrụ nke n'enweghị ezumike nwere ike ikpuchi ọṅụ dị n'oge ahụ nke n'eme ka tankị ime mmụọ anyị tọgbọrọ chakoo. Olee otú anyị ga-esi teta mkpụrụ obi anyị ma mụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ n’oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa?

Otu ụzọ anyị nwere ike isi “nọrọ na nché,” dị ka Jizọs kwuru n’ilu ​​Ya na Mak 13, bụ omume ime mmụọ nke ịdetụ ihe.

Ịdetụ ihe na-enyere anyị aka ịtụgharị uche n'ihe anyị na-agụ - a bụghị nanị iji ghọta ihe anyị gụrụ kama ọ bụkwa ka anyị na agụmagụ anyị nwee mkpakọrịta. Ịdetụ ihe ndị n'abata anyị n'uche ka anyị na-agụ Akwụkwọ Nsọ bụ mkparịta ụka dị oghe, nke eziokwu anyị na Chineke n'enwe. Anyị nwere ike gbaa mgba megide obi abụọ na egwù anyị gasị, chọọ ndụmọdụ Chineke, ma kpughee àgwà na omume ndị anyị kwesịrị ịgbanwe. Enweghị ụzọ ziri ezi ma ọ bụ ụzọ n'ezighị ezi maka ime ndekọ n'ihi na ihe a bụ nke a n'eme ka o si masị gị.

Gbalịa mee ihe a: sapée Akwụkwọ Nsọ gị gaa na Mak 13:32-37, mana agubelà ya. Nke mbụ, jiri ekpere malite, na-arịọ Chineke ka Ọ gwa gị okwu na kpughee Onwe-Ya site n'Okwu Ya. Kpee ekpere ka ị nwee obi meghere emeghe na mụrụ anya maka ihe Ọ nwere ike n'agwa gị. Mgbe ị mechara ihe ndị a, guzie akụkụ Akwụkwọ Nsọ Mak. N'ikpeazụ, jiri akwụkwọ iji eme ndekọ dị gị nso, tụgharịa uche ma dee ihe na ajụjụ ndị a metụtara Okwu Chineke ị gụrụ:

  • Gịnị mere Jizọs ji nye ndị n'eso ụzọ Ya iwu ka ha "Lezie anya! Mụrụ anya! (v. 33)? Kedụ otu i si edebe iwu a?
  • Olee otú ime ncheré gbasara Ọbịbịa Jizọs si anụ gị òkù n'obi? Ugboro ole ka ị n'eji mkpachapu-anya wee n'echè banyere ya n'oge mkwaghari a? Kedụ ihe ị ga-eme iji mụrụ anya na lezie anya n'Ekeresimesi a?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Abide in Jesus - 4-Day Advent Devotional

Ekeresimesi na-abịa! Soro ya n'abịa bụ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa – ikwadebé maka na ime ememe nke ọmụmụ Jizọs. Mana eziokwu ahụ ọ̀ na-efunahú ka a n'eme nkwaghari n'oge ezumike, ịzụta onyinye ahụ zuru okè, ma ọ bụ ịchịkwa nnọkọ erimeri na anụmanụ gasị nke ezinụlọ? N'ọsọ ọsọ nke oge Ekeresimesi, nweta ụzọ ọhụrụ gasị iji soro Okwu Chineke na-akpakọrịta, gá adọtakwu gị nso na Ya n'ikpeazụ. Mee ka mkpụrụ obi gị teta site n'igụ atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a sitere na Abide Bible Journals nke Thomas Nelson.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele HarperCollins/Zondervan/Thomas Nelson maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.thomasnelsonbibles.com/abide-bible-journals/