Nọgidenụ N'ime Jizọs - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Dị Ụbọchị AnọIhe Atụ

Oge a n'ime afọ nwere ike ime ka obi anyị tugaa n'ihe ma ọ bụ oge ndị gara aga nke ndụ anyị. Dịka ihe atụ, ị̀ nwere ike icheta onyinye Ekeresimesi kachasị nye gị obi ụtọ ị nwetatụrụla?
Ọ bụrụ na ị ga echetanwú, wepụta obere oge iji tugaa uche gị na oge aṅụrị ahụ kpọmkwem. Kedụ ụda ma ọ bụ ísì gasị ị na-echeta nke n'oge ahụ? Ị̀ n'echeta ka akwụkwọ ejiri machie onyinye gị ahụ sịrị dị gị n'aka ka ị na-atope yabụ onyinye? Akwụkwọ mmachi ahụ ọ na-acha ka gịnị? Kedụ onye nọ n'akụkụ gị ka ị n'eme ntope a? Ìbanyeghachì n'akụkọ ahụ jiri echiche gị dị ike, na ma eleghị anya n'akpọghachita mmetụta ndị ahụ niile ị nwere n'oge ahụ gara aga.
Ugbu a, kedụ ka ọ ga-adị gị ma i bido gụwa Akwụkwọ Nsọ n'ụzọ dị otù ahụ? Ọ bụ eziokwu, na ị nọghị n'ebe ma ọ bụ jiri anya gị abụọ hụ ihe ndị mere n'Akwụkwọ Nsọ; otu o sila dị, kedụ ka ọ ga-adị gị ma ị jiri anya uche gị gụọ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ tinye onwe gị n'ime akụkọ nke akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị na-agụ?
Iji ịhụ ụzọ, ịnụ ntị, ísìte ihe, ịnụ ụtọ ihe, na mmetụ aka na-agụ Akwụkwọ Nsọ n'enyeaka karịsịa maka ndị na-achọkarị ijikọ Akwụkwọ Nsọ n'ogo oke nghọta, ọkachasị n'oge nke ememme Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Kama isí n'ebe dị anya wee n'elele ihe ndị mere eme n'Akwụkwọ Nsọ, anyị na-abịa nso wee jiri mmetụta-uche anyị n'agụ Ya. Iji mmetụta-uche ise anyị agụ Akwụkwọ Nsọ n'enye anyị ohere iji uche na echiche gasị Chineke nyere anyị wee mee ihe, site n'itinye onwe anyị n'ime akụkọ gasị nke Akwụkwọ Nsọ. Ka anyị na-enwe mmetụta ọmịiko banyere ndị nọ n'ime akụkọ gasị nke Akwụkwọ Nsọ, anyị na-aghọta ihe ndị mere n'oge ha n'ụzọ dịkwu ka nke ahụmahụ. Ọ bụghịzi akwụkwọ nkịtị ka anyị na-agụ; anyị na-ebi n'ime ihe ndị anyị na-agụ ma, site n'ime otú ahụ, kpọte mkpụrụ obi anyị.
Mepee Akwụkwọ Nsọ gị na Matiu 1:18-21. Tupu gị malite ịgụ ya, dị jụụ ma rịọ Chineke ka O dozie obi gị ma duzie echiche gị. Guzie yabụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ.
Were anya uche gị hụ Josef ka ọ nọ n'oké ụra. Mkpọtụ adịghị eme, ikuku n'ekù dịkwa jụụ. Ị̀ hụrụ ka Josef si malie n'ahụ na obi ịma jijiji ka Mmụọ Ozi Chineke pụtara n'ihu ya. Ò tiri mkpu n'ihi ihe oké ịtụnanya ọ hụrụ? Ò wetụrụ onwe ya ala wee gbanwee ka o si debe ahụ? Kedụ ihe ndị nọ n'akpagharí n'uche ya ka ọ na-anụ na Onye Nzọpụta ahụ nke ndị ya n'eche ogologo oge na-abịa? Josef enweghị obi abụọ ma ọlị kama ọ tụkwasịrị Chineke obi imezu nkwa ya. Ọnọdụ obi gị ọ dị ka nke ya?
Rịọ Chineke ka O mejupụta gị jiri ntụkwasị obi na nghọta ahụ Josef nwere mgbe Mmụọ Ozi nke Onye-nwe-anyị bịara zie ya ozi. Rịọ Chineke ka O kpughee akụkụ gasị n'ime ndụ gị ebe O nwere ike iji gị rụọ ọrụ ọma maka alaeze Ya.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ekeresimesi na-abịa! Soro ya n'abịa bụ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa – ikwadebé maka na ime ememe nke ọmụmụ Jizọs. Mana eziokwu ahụ ọ̀ na-efunahú ka a n'eme nkwaghari n'oge ezumike, ịzụta onyinye ahụ zuru okè, ma ọ bụ ịchịkwa nnọkọ erimeri na anụmanụ gasị nke ezinụlọ? N'ọsọ ọsọ nke oge Ekeresimesi, nweta ụzọ ọhụrụ gasị iji soro Okwu Chineke na-akpakọrịta, gá adọtakwu gị nso na Ya n'ikpeazụ. Mee ka mkpụrụ obi gị teta site n'igụ atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a sitere na Abide Bible Journals nke Thomas Nelson.
More