Malịte Nke ỌhụrụIhe Atụ
![Begin Again](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F2049%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Onye Nzọpụta Nke Sameria
Nke a bụ eziokwu na-azọ ndụ: Onye na-erụkpụ na mmiri bụ onye irọ kachasi nke onwe ya. Ka ha ka nwere ike ina agbakasi n'ime mmiri, abịarụkwala ha nso. Ha nọ n'ụjọ ma ha ga-ejigide gị wee mee ka mmiri rie unu abụọ. Ịga eche rụọ mgbe ike niile gwụchara ha. Naanị mgbe ahụ ka ha dị njikere ikwe ka ị zọpụta ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndi ọ bụla chọrọ Onye Nzọpụta nke ukwuu na ndụ ha.
Gụọ Luk 10:25-37 ọzọ. Ajụjụ a: “Gịnị ka m ga-eme ka m wee keta oke ndụ ebighị ebi?” Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ nnọọ bụrụ “ezi onye agbata obi” na a ga-azọpụta gị? Bụrụ ezigbo mmadu dika Nne Theresa? Mba, a pụghị ịgụnye anyị n’ndi ezi omume site n’irube isi n’Iwu nke Mọzis (Gụọ Ndị Rom 3:20). Ihe e bu n’obi n’ozizi Jizọs bụ ịnọgidesi ike na-akwali ndị na-ege Ya ntị na nkwubi okwu a na-apụghị izere ezere bụ́ na naanị olileanya nzọpụta ha nwere bụ Onye Nzọpụta.
“Ya mere, zuo oke, ọbụna dịka Nna unu nke Eluigwe si zuo oke.”
(Matiu 5:48)
“Abụ M mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye kwere na Mụ ga-ādi kwa ndu ọbụrụgọdi na ọ nwụru.” (Jọn 11:25)
"Abụ M ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna M ma ọ́ bụghị site na Mụ.” (Jọn 14:6)
N'ime Luk 10:27 a na-asị hụ Chineke n’anya na hụ ndi mmadụ n’anya. Kedu otu ịhụ onye agbata obi gị n'anya n'ezie dị? Odi ka enweghị ọdịmma onwe, iji ihe onye nwere chụọ àjà nke megidere omenala na ọgụgụ isi.
"Gaa mee otu ihe ahụ." ( Luk 10:37) Ọ fọrọ nke nta ka ọ pụta na ị ga n'eme nke a n’akwụsịghị akwụsị. Ụdị ịhụnanya maka ndị agbata obi nke Chineke chọrọ – ọ bụrụ na a ga-eji Iwu kwadọọ anyị dika ndi ezi omume. Ònye bụ onye na-eme ebere? “Ndị okpukpere chi” dị ka onye nchụàjà ma ọ bụ onye Livaịt?
Okpukpe gị agaghị azọpụta gị! Onye a na-atụghị anya ya, onye Sameria, mechara pụta bụrụ Onye Nzọpụta.
Ị nwetụla nkụda mmụọ n'ime ọlụlụ mbụ? Ị bepụtala okwu ndi yiri otu a n'akwa nye Onye Nzọpụta Nke Sameria n’ihi na ị ma, na Ọ bụ olileanya ikpeazụ gị?
“Jizọs, Nwa Devid, meere m ebere!” Bartemaeus kpụrụ ìsì
(Mak 10:47)
“Chineke, Ị bụ Chineke m; Aga m āchọ Gi nke-ukwuu; akpịrị kpọrọ mkpụrụ obi m nkụ maka Gị, anụ ahụ́ m na-agụkwa agụụ maka Gi n’ala kpọrọ nkụ na nke ike gwụrụ, ebe mmiri na-adịghị.
(Abụ Ọma 63:1-2)
Ma ọ bụ na ị maara onye ọ bụla nke na-ajụ ịnabata Kraịst n'ihi na Ọ bụghi azịza otụru anya ya maka mkpa nke ụwa ya na-adighi adigide? Onye ikwu ma ọ bụ enyi nke ị na-agwa ogologo oge ka ha nabata Kraist. Wepụta oge kpeere nwoke ahu ma obu nwaanyi ahu ekpere ugbu a.
Dị ka onye na-agafe na ndagwurugwu gbara ọchịchịrị, nke dị mmiri mmiri ma jiri osisi bu ọkụ n’aka. Gbalịa ka ọ nwere ike, ebe niile dị mmiri mmiri nke mere na ọkụ ekweghi imunye. Ma mgbe ị kpere ekpere, ifufe nke Mmụọ Nsọ na-amalite ife ma takọọ mmiri ndi ahu. Ozugbo ozugbo, e nwee mgbanwe! Ọkụ amalite ire n’ime obi ndị nwoke na ndị nwanyị – ha ebụfee ya ndị ọzọ – rụọ mgbe ndagwurugwu ahụ dum ga-enwụrụ ọkụ n’ihe Chineke! Nke ahụ bụ ihe di mkpa banyere ekpere.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
![Begin Again](/_next/image?url=https%3A%2F%2Fimageproxy.youversionapi.com%2Fhttps%3A%2F%2Fs3.amazonaws.com%2Fyvplans%2F2049%2F1280x720.jpg&w=3840&q=75)
Afọ ọhụrụ. Ụbọchị ọhụrụ. Chineke kere mgbanwe ndị a iji chetara anyị na Ọ bụ Chineke nke Mmalite Ọhụrụ. Ọ bụrụ na Chineke nwere ike ikwụpụta ụwa ka ọ pụta ìhè, Ọ nwere ike ikwụrụ ọchịchịrị nke di n'ime ndụ gị okwu n'ezie, na-ekepụtara gị mmalite ọhụrụ. Ihụghị mmalite ndi ọhụrụ n'anya! Dị ka igụ atụmatụ a. Nwee obi ụtọ n'igụ ya!
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Mr. Boris Joaquin, Onye isi ala na Onye isi akụrụngwa nke Breakthrough Leadership Consultancy. Ọ bụ onye nkuzi ukwu na ọkà okwu dị elu maka mmemme ndụ na nka ndị ọzọ dị mfe ime na Philippines. Ya na nwunye ya bụ Michelle Joaquin, ọ nyere atụmatụ ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, bikọ gaa na: http://www.theprojectpurpose.com/