Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Malịte Nke ỌhụrụIhe Atụ

Begin Again

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Mmalite Nke Ọhụrụ

Ọ na-amasị m ịgafete n'afọ ọhụrụ. Dị ka ọ na-amasị m nke ukwuu ịhụ chi ọbụbọ nke ụbọchị ọhụrụ. Ekwenyere m na Chineke kere mgbanwe ndị a iji chetara anyị na Ọ bụ Chineke nke mmalite ọhụrụ.

Chineke pụrụ ike ihe site n'enweghi ihe ọ bụla. Dị ka ite ụrọ, Ọ nwere ike ikpụpụta ihe site n'ngwa na-enweghị isi. Ọ nwere ike iwere obi gị agbọwara agbọwa, nke n'adịghị ọcha na nke rụrụ arụ, wee tụgharịa ya ka ọ bụrụ obi n'enweghi ntụpọ na nke nwere nzube – mee ka ọ zuo oke ọzọ!

Dị ka n'ime Jenesis, ebe Chineke kwụrụ okwu n'ime ihe efu na ọchịchịrị iji kee eluigwe na ala, kpakpando na ụwa anyị. Chineke ji okwu kwụpụta ụwa a ya wee dị adị. Chineke ga ekwụnwụkwa okwu n'ime ọchịchịrị nke ndụ gị, iji wee kepụtara gị mmalite ọhụrụ.

N’ụbọchị ole na ole n'esote, ka m dụzie gị n’ime ọmụmụ ihe gbasara ndị nyeferela Chineke ọgbaghara ha. Ndi ihe n'eme, ọnọdụ gbara ha gburugburu, ma ọ bụ mmetụta adighi achịkwa ọzọ. Ndi na-ekweta na ha nwere ike inweta naanị ihe ngwọta ziri ezi, ndụ n'ezie, ndụ asachapụrụ asachapụ na mmalite ọhụrụ site n'aka Ọkpara Chineke, Jizọs Kraịst (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 1:30).

Ọbụnadi ugbu a, Ọ nwere ike ikwunye okwu n'ime ọgba aghara nke ndụ gị iji nye ya olileanya ọhụrụ, ume ọhụrụ.

Gụọ Abụ Ọma 51:10. Chineke chọrọ ịhụ gị ka ị dị enweghi ntụpọ, ya mere Ọ ji chọọ irụ ọrụ nke ọma n'ịmepụta obi ọhụrụ gị na iweta usoro na ọgba aghara nke ndụ gị. Naanị ihe ị ga-eme bụ iweda onwe gị ala n’ihu Ya na idọbe onwe gị n’okpụrụ ọbụbụeze Ya.

Kwụọ, “Kee n'ime m obi n'enweghi ntụpọ, Chineke, ma mee ka mmụọ igụzọsi ike dị ọhụrụ n’ime m.” Kpee ekpere, "Chineke, mee mmalite ọhụrụ n'ime ndụ m, site na ọgba aghara m niile, kwe ka m malite ọhụrụ.”

Enwere m mmasị maka mmalite ọhụrụ! Dị ka atụmatụ ọgụgụ a. Nwee obi ụtọ ka ị na agụ ya!
Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Begin Again

Afọ ọhụrụ. Ụbọchị ọhụrụ. Chineke kere mgbanwe ndị a iji chetara anyị na Ọ bụ Chineke nke Mmalite Ọhụrụ. Ọ bụrụ na Chineke nwere ike ikwụpụta ụwa ka ọ pụta ìhè, Ọ nwere ike ikwụrụ ọchịchịrị nke di n'ime ndụ gị okwu n'ezie, na-ekepụtara gị mmalite ọhụrụ. Ihụghị mmalite ndi ọhụrụ n'anya! Dị ka igụ atụmatụ a. Nwee obi ụtọ n'igụ ya!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mr. Boris Joaquin, Onye isi ala na Onye isi akụrụngwa nke Breakthrough Leadership Consultancy. Ọ bụ onye nkuzi ukwu na ọkà okwu dị elu maka mmemme ndụ na nka ndị ọzọ dị mfe ime na Philippines. Ya na nwunye ya bụ Michelle Joaquin, ọ nyere atụmatụ ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, bikọ gaa na: http://www.theprojectpurpose.com/