Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Malịte Nke ỌhụrụIhe Atụ

Begin Again

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Ahụmahụ Okporo Ụzọ Damaskọs

Ntụghari nke Sọl n'okporo ụzọ Damaskọs ka a kọghariri ọtụtụ oge ma bụrụ ihe atụ nke ọtụtụ ntụgharị - ndị amara nke Mmụọ Nsọ metụrụ aka ha wee malite ọhụrụ. Ndụ Pọl gbanwere mgbe ọ tinyere okwukwe ya n'ime Jizọs. Chetakwa na Pọl ka a kpọburu Sọl. Ekwena ka aha abụọ ndia gbagwọjụọ gi anya.

N'ime Ọrụ Ndi Ozi Isi nke Itọlụ: amaokwu nke mbu rụọ nke abụọ ndị na-eso ụzọ Kraịst ka a kpọrọ ndị "Ụzọ" n'ihi na Ndị Kraịst na-ekwu na okwukwe n'ime Jizọs bụ "naanị Uzọ" nke nzọpụta (Gụọ Jọn 14: 6). Pọl bụ onye ndú okpukpe ndị Juu dị mpako, ọ chọghịkwa ikweta na okpukpe ya ezighị ezi.

Sọl bu ọnwụ n'obi ya zọpụ njem n'ụzọ Damaskọs - iga kpagbụọ ndị n'eso "Ụzọ" ahụ. N’ụzọ Damaskọs, Sọl hụrụ ìhè nke n'ekpu ìsì, nke na-egbuke egbuke karịa anyanwụ ehihie. Ọ wee nụ ka otụ olu na-asị ya: "Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbụ m?" (Ọrụ Ndi Ozi 9:4). Mgbe Sọl jụrụ imata onye na-agwa ya okwu, olu ahụ zara, sị, “Abụ M Jizọs, onye i na-akpagbụ. Ugbu a bilie banye n'ime obodo, a ga-agwakwa gị ihe ị ga-eme.” (Ọrụ Ndi Ozi 9:5-6).

Ananayasi ekwetaghị na Sọl ekwerewọ na Jizọs. N’amaokwu nke iri na otụ, Onye-nwe-anyị gwara Ananayasi na ịhụ Sọl ka ọ na-ekpe ekpere ga-abu ihe ngọsi na ọ gbanwewọ.

Sọl kpụrụ ìsì! Chineke wedara Sọl ala ka ọ wee ghọta otu osi chọsie Jizọs ike. Mgbe mmadụ nwere ezigbọte obi nke nkụda mmụọ, Jizọs n'abịarụ nso. Dị ka Ọrụ Ndi Ozi 9: 19b-22 si kwụọ, Sọl nwere mgbanwe dị ka nke otu nari na iri asatọ n'ime ndụ ya, mgbanwe pụrụ nnukwu iche.

Nke a bụ nkọwa Pọl banyere ihe mere ya — na nye anyị ndị kwere na Kraịst — Gụọ 2 Ndị Kọrint 5:17. Ọ bụghị ọtụtụ ndị mmadu nwere ahụmahụ dị ịrịbama nke “ahụmahụ okporo ụzọ Damaskọs” dị ka Sọl, ma anyị niile kwesịrị inwe ike ikwu, sị: “Ndụ m agbanwewọ kemgbe m matara Jizọs Kraịst.” Ị nwere ike ikwụnwụ nke ahụ? Ị nwere ike ịkerita oge Chineke wedara gị ala iji mee ka ị bịarụọ Ya nso?

N’oge nke egwu ahụ, ịta ụta na mmepe nghọta, Sọl ghọtara na Jizọs bụ n’ezie Mezaịa ahụ, nakwa na ya bu Sọl enyeerela aka gbụọ mmadụ ma tụọ ndị aka ha dị ọcha mkpọrọ. Sọl ghọtara na n’agbanyeghị nkwenkwe ya mbụ dị ka onye Farisii, ọ matawọ nke bụ́ eziọkwụ banyere Chineke ma marakwa na ya nwere iwu irụbere Ya isi.

N'oge ahụ Sọl ghọrọ n'ezie, n'enweghị mgbagha, nwoke ọhụrụ. A mụrụ ya ọzọ. Ọ wee họrọ icheta nke ọma akara awa nke mgbanwe ahụ site n'iwepụ aha Hibru ahụ bụ Sọl zawazie Pọl – ka ọ wee malite ọhụrụ.
Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Begin Again

Afọ ọhụrụ. Ụbọchị ọhụrụ. Chineke kere mgbanwe ndị a iji chetara anyị na Ọ bụ Chineke nke Mmalite Ọhụrụ. Ọ bụrụ na Chineke nwere ike ikwụpụta ụwa ka ọ pụta ìhè, Ọ nwere ike ikwụrụ ọchịchịrị nke di n'ime ndụ gị okwu n'ezie, na-ekepụtara gị mmalite ọhụrụ. Ihụghị mmalite ndi ọhụrụ n'anya! Dị ka igụ atụmatụ a. Nwee obi ụtọ n'igụ ya!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mr. Boris Joaquin, Onye isi ala na Onye isi akụrụngwa nke Breakthrough Leadership Consultancy. Ọ bụ onye nkuzi ukwu na ọkà okwu dị elu maka mmemme ndụ na nka ndị ọzọ dị mfe ime na Philippines. Ya na nwunye ya bụ Michelle Joaquin, ọ nyere atụmatụ ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, bikọ gaa na: http://www.theprojectpurpose.com/