Irụ Ụjụ N'Enye Nsogbu N'Obi: Olileanya Maka Oge EzumikeIhe Atụ
Kedu ka ị ga-esi mepụta oge ezumike bara uru nke jupụtara na udo, n'agbanyeghị ihe na-eme na ndụ?
Mgbe ị na-agabiga iru újú, karịsịa mgbe onye ị hụrụ n'anya nwụnahụrụ gị ma ọ bụ mmekọrịta gị na onye ị hụrụ n'anya adịghịzi, ọ bụ ahụmahụ dị ezigbo ufu ịmepụta ihe ndị dị mkpa "iga n'emekari dị ọhụụ"... karịsịa n'oge ezumike. Ọ na-ewekari oge ime n'ezie.
Ọ bụrụ na ị nọ n'ime ọnwa ole na ole mbụ ma ọ bụ afọ mbụ nke onye ị hụrụ n'anya nwụnahụrụ, ọ bụ ihe n'enweghị mgbagha na ị ga-enwe nnukwu obi mgbawa nakwa ị maghị otu ị ga-esi hazie ma ọ bụ mee ihe n'oge ezumike. Ufọdụ nwere ike ya adị ha ka ha ghara ime ihe ọ bụla, ma ya fọdụ ime nhazi bara uru na nke pụrụ iche maka oge ezumike.
Mgbe ụfọdụ, ihe kachasị mma ị nwere ike ime n'oge iru uju bụ inye onwe gị ikike ka gị na Chineke nọrọ jụụ wee soro Ya nọrọ n'oge ezumike n'ụzọ bụ isi, ka ị na-etinye oge n'ekpere n'ọnụnọ Ya, na-anụ ụtọ ịhụnanya Ya.
Ụfọdụ nwere ike ịnụ ụtọ Ekeresimesi dị ka ha na-emebu site n'ime ihe niile na-atọ ụtọ ma ihe ncheta na ihe mmasị ha na-ahụkarị n'anya ime...nke a bụkwa nnukwu onyinye!
Ndị ọzọ nwere ike ịhụ onwe ha n'etiti ọnọdụ abụọ a... ichọ ime ihe mmasị ndị ha na-emebu, ma na-achọkwa ịnọrọ onwe ha n'ihi inwe oge siri ike na inwe mmetụta dị ukwuu nke obi mgbawa.
Ha niile ziri ezi n'ihi na iru uju abụghị ahụmịhe di mfe. Enweghị "ọzịza na-ezighi ezi." Chineke na-eduzi ma na-atuzi iru uju nke ọ bụla n'ụzọ pụrụ iche.
Achọpụtara m n'onwe m na ka m na-elekwasị anya na Chineke na "ezi ihe kpatara maka oge ezumike," otú ahụ ka m na-enwe ike ịnụ ụtọ oge Ekeresimesi. Achọpụtakwara m na mgbe m kpachaara anya na-emere ndị ọzọ ihe n’oge ezumike, ma webata ngwakọta nke ihe mmasị ndị ochie na nke ọhụrụ, oge ezumike adịchaghị abụ oge n'amapụ m obi igabiga.
Kedu otu ị ga-esi emepụta ncheta pụrụ iche maka ezumike mgbe ị na-atụ n'anya ndị ị hụrụ n'anya ma ọ bụ na-enwe ihe ịma aka ndụ?
Ịrịọ Chineke ka Ọ nyere gị aka ilefe anya ihe mgbu ahụ (ma gị ka na-anabata ma na-agabiga obi mgbawa gị na iru uju) ma iji ebumnuche tinye ihe mmasị ọhụrụ ma ọ bụ ihe omume ọhụrụ maka ezumike nwere ike isi ike; mana ọ nwere ike bụrụ ihe inye aka n'ikpeazu...na bụrụ ihe ọgwụgwọ dị itụnanya.
Ihe ndị a bụ ọmụmaatụ ole na ole:
Mgbe m dị obere, echetara m na papa m na-eme ka ezinụlọ anyị niile yiri uwe ura anyị ma anyị adiri otu ahu gaa n'ekirikọta ọkụ Ekeresimesi. Ka m mụsịrị nwa nke m, anyị na-asọpụrụ ihe mmasị a pụrụ iche mgbe niile, anyị na-eyikwa uwe ura anyị mgbe niile na-ekirikọta ọkụ Ekeresimesi. Anyị emela nke a ihe karịrị iri afọ abụọ.
Ihe mmasị ọzọ m hụrụ n'anya ime bụ ime achịcha Ekeresimesi ndị kacha amasị nwanne m nwanyị. Mụ elee anya ịhụ onye na-agabiga ihe mgbu n'etiti ezinụlọ m na ndị enyi m, ma mụ eji efere sara asa jupụtara n'achịcha ndị ahu m mere wee mee ha obi ụtọ. Ọ na-amasị m ịgba ndị ọzọ ume n'oge ezumike niile ma nye ha oge nkuru ume ka ha n'eru uju.
Otu nwa agbọghọ nọ n'nzuko m maka iru újú, bụ́ onye nwetara ahụmahụ ọnwụ nke obere nwa ya nwanyị, gwara m na oge ezumike afọ ole na ole mbụ mgbe nwa ya nwanyị nwụsịrị bụ ndị sigburu onwe ha n'ike. Nwa agbọghọ a pụrụ iche na-anabata ka nwa ụmụ ntakiri ọ kporo mmụọ ozi (ọ na-agbalị ịchọta ndị mmụọ ozi a nwere otu ụbọchị ọmụmụ dịka nwa ya nwanyị) site n'Osisi Mmụọ Ozi dị n'ógbè ya wee zụtara nwatakiri ọbụla ọ chọtara nọ n'mkpa ihe onyinye iji sọpụrụ nwa ya nwanyị.
Ọ dịkwa nma nke ukwuu ịmunye kandụl ncheta iji sọpụrụ onye ị hụrụ n'anya. Enwere m otu ezigbo enyi nke na-abịakwute ndị otu iru újú m (ọ bụkwa onye ndu Grief Bites) na-amụnye kandụl ma tinye foto nke nne na nna ya n'akuku kandụl a pụrụ iche. Ọ bụ nnukwu ụzọ isi cheta onye ị hụrụ n'anya oge ezumike ọ bụla.
Rịọ Chineke ka ọ ga-esi masị Ya ka ị nọrọ oge ezumike a. Ọ nwere ike ịbụ oge ezumike n'enweghị nsogbu, nke dị jụụ nke nnọrọ gị na Ya bụ isi...ọ nwere ike ịgụnye gị ibụ isi iyi nke ịhụnanya na agbamume nye ndị ọzọ...ọ nwere ike ịbụ ime ihe mmemme kpọmkwem otu ị si-eme ha oge niile...ọ nwere ike ịbụ nanị gị na ndị ị hụrụ n'anya inọkọ (ma gị enwee ụtọ) site na nnọkọ gị na ha...ọ nwere ike buru ihe kachasị nma isi n'obodo inọ pụọ...ọ nwere ike buru imekota ihe ndị a niile n'otu oge.
Otú ọbula ị si họrọ ime ihe n'oge ezumike, a na m ekpe ekpere na ị ga-amata n'onwe gị mgbe nile otu Chineke si na-eche n'ezie banyere gị. A na m ekpe ekpere na olileanya na ịhụnanya Ya bụ ahụmahụ dị adị nye gị! A achọkwara m ka mmadụ niile nwee ahụmahụ ihụnanya, ọgwụgwọ na udo!
Ka oge ezumike a jupụta na ncheta n'atọ ụtọ n'obi, nke pụrụ iche...na karịsịa OLILEANYA!
Ị nwetala onyinye kachasị mma...mmekọrịta gị na Jizọs Kraịst?
Wepụta oge taa gụọ Luk 2:1-21 na Jọn 3:16 iji toghee Onyinye kachasị mma onye ọ bụla nwere ike inye gị. Jizọs na-eche jiri aka sapere asape ịnabata gị – dịka ị dị – ma gbaghara gị mmehie gị niile. Naanị ihe ị ga-eme bụ ka gị na Chineke kparịta ụka n'eziokwu site n'ịrịọ Jizọs ka Ọ bata n'ime obi gị na ịrịọ Ya ka Ọ mee gị ka ị dị ọhụrụ!!
Ọ bụrụ na ị ga-achọkwu olile anya na agbamume, A na m akpọ gị òkù ka ị gụọ atụmatụ ọgụgụ anyị ndị ọzọ:
• Iru Uju N'Enye Nsogbu N'Obi: Ịchọta Akụ N'Ime Ihe Isi Ike • Iru Uju N'Enye Nsogbu N'Obi: Ụzọ Ohụrụ Iji Too N'Ime Iru Uju •Iru Uju N'Enye Nsogbu N'Obi: Nkpughe Obi-Abuo •Ibụ Abụ Gabiga Oke Ifufe
Anyị na-enyekwa agbamume kwa ụbọchị na blọọgụ na ibe Facebook anyị, kwa:
•www.griefbites.com
•www.facebook.com/GettingYourBreathBackAfterGrief
Ị bara uru nke ukwuu ma Chineke na-eche banyere iru újú gị n'ụzọ di omimi! A na m echekwa maka iru uju gị, na-ekpekwa ekpere ka Chineke jiri ịhụnanya gwọọ obi gị na ndụ gị!
Na-echeta mgbe niile otu Chineke si hụ gị n'anya! Ọ hụrụ gị n’anya nke ukwuu nke na Ọ na-abụ abụ n’isi gị ma na-añụrị ọñụ nke ukwuu n’ihi gị site n’obi jupụtara n’añụrị! Ị bụ ọñụ obi Ya! Echefukwala otú Ọ siri hụ gị n'anya ma nwee obi ụtọ n'oge ezumike a nke ọma gị na Ya!
“Ezigbo Nna Nke Eluigwe Kachasi Jupụta N'Amara, a na m arịọ Gị ka ị rụọ nnukwu ọrụ n’ime obi onye ọ bụla taa na n’ụbọchị ndị na-abịa abịa. Mgbe ha rukpuru na mwute, a na m arịọ Gị ka Ị were ịhụnanya Gị kechie ha ka uwe ma kasie ha obi. Mgbe ụbọchị siri ike, a na m arịọ Gị ka Ị buru obi mgbawa ha na ibu ha dị arọ. A na m ekpe ekpere ka Ị tinye n'ime okpukpu onye ọbụla OLILEANYA Gị dị oke ọnụ ahịa, bụ ihe akụ.
Biko nye ha onyinye nke oge ezumike pụrụ iche bara uru, ọkachasị oge ha na Gị. Ọ bụrụ na ha anabatabeghị Gị dị ka Onye-nwe ha na Onye Nzọpụta ha, a na m ekpe ekpere ka Ị duzie ha ma tuzie ha ruo Onyinye Kachasị Elu mgbe ọ bụla—Gị! Anyị hụrụ Gị n'anya, Onye-nwe-anyị, na-ekelekwa Gị n'ihu maka ihe niile Ị ga-eme. N'Aha Jizọs ka anyị na-ekpe ekpere, amen!"
Ihe Ofufe a © 2015 bụ nke Kim Niles/Iru Uju N'Enye Nsogbu N'Obi. Ikike niile iji ya mee ihe dị n'aka onye mere ya. A natara ikike iji ya mee ihe.
Igodo: ụbochi_ise
ụbọchị_ise.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Nye ọtụtụ ndị, oge ezumike bụ oge ọñụ dị ukwuu...ma gịnị na-eme mgbe oge ezumike adighị abu nke ọñụ ma bụrụ ihe ezigbo nsogbu n'ihi oke iru újú ma ọ bụ ọnwụ? Atụmatụ a pụrụ iche ewepụtara maka ogụgụ ga-enyere ndị na-eru újú aka inweta nkasi obi na olileanya n'oge ezumike, ma n'ekesa otu esi emepụta oge ezumike bara uru n'agbanyeghị oke iru uju. Igodo: gbasara gbasara https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/1 https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Kim Niles, bụ onye dere Ịnweghachita Ume Gị Ọzọ Mgbe Ndụ Kụwapụtara Gị Ya, maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na:
www.griefbites.com