Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Irụ Ụjụ N'Enye Nsogbu N'Obi: Olileanya Maka Oge EzumikeIhe Atụ

Grief Bites: Hope for the Holidays

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Ọñụ ọ ga-ekwe onwunwe n'oge ezumike...karịsịa n'etiti oke iru uju?

Ezi ọñụ ga-ekwe onwunwe n'ezie n'oge iru uju!

E nwere ọdịiche dị n'etiti obi ụtọ na ọñụ nke jupụtara n'olile anya.

Obi ụtọ nwere ike ịdabere na mmetụta uche, echiche, ọnọdụ, na nkwenkwe. A na-enweta ọn̄ụ nke jupụtara n’olileanya site n’ịghọta otú Nna anyị Chineke si hụ anyị n’anya, ịbi ndụ n’ịdị mma Ya, na ịbanye n’udo Ya zuru okè, agbamume ịhụnanya, na ezumike.
Ọ bụ ighọta na Chineke nwere atụmatụ maka obi mgbawa gị, yana ndụ gị, na ịmara na Ọ dịghị mgbe Ọ na-adịghị eji ihe mwute gị niile eme ihe.
N'ikpeazụ, ọ bụ ighọta na a na-enwete ọñụ nke ezumike naanị n'ime Ya!

Tupu ihe iru uju e mee m, echere m na mmemme oge ezumike jupụtara n'ọñụ n'ihi nhazi na ezinụlọ na ndị enyi inwe ezumike "zuru okè." Ọ bụ naanị mgbe m gabigachara ihe iru uju ka m chọpụtara na ọñụ n'enweghi unyi ọbụla nke mmemme oge ezumike bụ naanị na Chineke ka a na-ahu ya.

Chineke bụ ezi ihe di mkpa maka, na n'ime, oge ezumike.
Mmemme Ekele abụghị nanị ụbọchị anyị na-enye ekele maka ndị anyị hụrụ n'anya na ngọzi nke ụwa anyị... Mmemme Ekele bụ ụbọchị ekele dị ukwuu n'ihi otú anyị si nwe ekele n'enweghi atụ maka inwe Chineke nke hụrụ anyị n'anya ma buru anyị n'obi! Anyị nwere ekele maka ihe niile Ọ na-eme n’ime obi anyị na ndụ anyị, anyị nwere ekele maka akụ ebighi-ebi Ọ na-ewu n’ime mkpụrụ obi anyị, na-jupụtakwa na ekele n'ihi anyị na Ya nwere obubu enyi mara nma na nke kacha buru ezi ya!
N'imata na Chineke na-akwadoro anyị ebe anyị ga-ebi na mgbe ebighị ebi, na Eluigwe bụ ebe ndị anyị hụrụ n'anya nọ, burukwa ebe nwere akụ ka ukwuu na nke ka baa uru nye anyị, bụkwa nnukwu ihe iji nye ekele.

Ekeresimesi abụghị isi oge anyị na ndị anyị hụrụ n'anya ịnọkọ, ichọ osisi na ụlọ anyị nma, na-abụ abụ ekeresimesi, ịme achịcha, ma ọ bụ ikiri ihe omume ekeresimesi na TV...Ekeresimesi n'ụdị kachasị ọcha bụ maka Onye Nzọpụta anyị onye hapụrụ ebube nke Eluigwe (inwere ike ichetu maka ihe a?) ka Ọ wee bụrụ mmadụ ịzọpụta mkpụrụ obi anyị...naanị ka Ya na anyị nwee ike inwe mmekọrịta bụ nke naanị anyị na Ya, chiri anya!

Ịhapụ ebube niile na nsọpụrụ ofufe nke Eluigwe—izu okè di ìhè, ọñụ, na ịdị mma zuru okè na nsọpụrụ ndị mmụọ ozi 24/7—iji mepụta ezumike pụrụ iche nke a na-akpọ Ekeresimesi, ka anyị wee nwee ike ịbịakwute Ya n'nwere onwe ma nwee ike anyị na Ya inwe mmekọrịta chiri anya, nke a bụ nke n'efụ m uche kpam kpam! Nke a bụ nke n'eme m ka m na-achọ ilekwasị anya na akụkọ ekeresimesi nke bụ ezie, akụkọ ekeresimesi mara nma nke na-enye olileanya dị egwu! Ọ na-emekwa m ka m na-achọ ịhụ ndị ọzọ n’anya na na-agba ndị ọzọ ume n’ụzọ Ọ si wee hụ m n’anya ma na-agba m ume.

Dịka Ọ si jiri ịhụnanya Ya nye onye ọ bụla n’ime anyị, a na m agbalị icheta iji ịhụnanya na-enye ndị ọzọ n’oge ezumike, nakwa, site n’inye ndị m hụrụ n’anya gbara m gburugburu onyinye nke ịhụnanya, agbamume, ncheta pụrụ iche, na omume ije ozi iji gosi ha otú m si jupụta n'ekele n'ezie maka ha.

Chee echiche otu ị ga-esi nye ezinụlọ gị na ndị enyi gị ihe bara uru n'oge ezumike a.
Ọ ga-enye aka ime ka obi gị dị arọ dị mfe, ma nye gị ohere ịgọzi obi onye ọzọ ka ị na eme ya.

Mgbe m na-eche maka ezi mpụta nke ekeresimesi, ọ na-akpo m ka m were oge ekeresimesi chọọ obi Chineke, na-enwe mmemme nke ọñụ a n'ahu site n'Ya, na-amatakwu onye m nwere ike ịkọrọ maka Ya na kesara ịhụnanya Ya.

Ọ nwere ike ọ gaghị ewepụ kpam kpam obi mgbu dị ugbu a, mana ọ nwere ikike ime ka ndị kwere ekwe niile ju n'ezi ọñụ ka anyị na-aghọta àjà dị ịtụnanya Chineke chụworo n'ihi ihe a kpọrọ mmadụ...naani ka anyị na Ya wee nwee obubu enyi nke asi n'adighị, dị ịhụnanya na buru ezi ya!

Ịmata na ezi ọñụ bụ ihe a pụrụ inweta, ọbụna n’etiti ihe isi ike, bụ onyinye nke nanị Chineke pụrụ ike n’ime obi anyị.

Taa, rịọ Chineke ka Ọ nye gị onyinye ọñụ agọziri agọzi ma rịọkwa Ya ka Ọ mee ka nke a bụrụ ahụmahụ nye gị n'ezie n'oge niile nke ezumike.
Tụlee ịjụ Chineke onye ị nwere ike igọzi n'oge ezumike a, nakwa, site n'ịhụnanya na agbamume gị.

Ekpere:
"Nna Nke Eluigwe, ekelee m Gị nke ukwuu maka ihe niile Ị meere mụ na ezinụlọ m—n'oge gara aga, ugbu a, na n'ọdịnihu—na-ekelekwa Gị maka ihe niile Ị ga-anọgide na-emere anyị mgbe niile!
Biko mee ka obi anyị ju eju n'ọñụ Gị karịrị nke mmadụ! Nyere anyị aka ka ọñụ Gị na-enwu n'ime obi anyị n'oge ezumike a. Mee ka ọnụnọ Gị dị ìhè nke ọma, yana ịhụnanya, olile anya, agbamume na nkasi obi Gị! A na m eto Gị na anyị nwere ike inweta ọn̄ụ nke Chineke n’agbanyeghị na ụfọdụ nọ n’oké obi mgbawa na ihe mgbu. Mgbe ọ bụla anyị na-enwe nkụda mmụọ ma ọ bụ mfunahụ olile anya n'oge ezumike a, mee ka obi anyị jupụta n'ịhụnanya na ọnụnọ Gị! Mee ka anyị jupụta ọhụrụ na OLILEANYA!
Nyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ịbụ ngwa agbamume, olile-anya, ihunanya, oñụ, na udo nye ndị niile Ị debere n’ụzọ anyị.
Anyị hụrụ Gị n'anya, Onye-nwe-anyị! N'Aha Jizọs, Amen."

Ihe Ofufe a © 2015 bụ nke Kim Niles/Iru Uju N'Enye Nsogbu N'Obi. Ikike niile iji ya mee ihe dị n'aka onye mere ya. A natara ikike iji ya mee ihe.


Igodo: ụbọchị_ano
ụbọchị_ano.
Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Grief Bites: Hope for the Holidays

Nye ọtụtụ ndị, oge ezumike bụ oge ọñụ dị ukwuu...ma gịnị na-eme mgbe oge ezumike adighị abu nke ọñụ ma bụrụ ihe ezigbo nsogbu n'ihi oke iru újú ma ọ bụ ọnwụ? Atụmatụ a pụrụ iche ewepụtara maka ogụgụ ga-enyere ndị na-eru újú aka inweta nkasi obi na olileanya n'oge ezumike, ma n'ekesa otu esi emepụta oge ezumike bara uru n'agbanyeghị oke iru uju. Igodo: gbasara gbasara https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/1 https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/1.

More

Anyị ga-achọ ikele Kim Niles, bụ onye dere Ịnweghachita Ume Gị Ọzọ Mgbe Ndụ Kụwapụtara Gị Ya, maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.griefbites.com