Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Irụ Ụjụ N'Enye Nsogbu N'Obi: Olileanya Maka Oge EzumikeIhe Atụ

Grief Bites: Hope for the Holidays

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Kedu otu ị ga-esi chọta ma nwee olile anya mgbe ọ dị gị ka ị nweghị olileanya ma oli n'oge ezumike?

Mgbe m gabigachara ọnwụ nwanne m nwanyị n'oge Emume Ekele, hụchaa ọnwụ enyi m nwoke n'oge ezumike Ekeresimesi, funahụcha nne m ochie n'oge ezumike Valentine, funahụkwa nne m ochie ọzọ ụbọchị abụọ tupu Ekeresimesi, na mgbe afọ ole gachara, gabigakwa ọnwụ enyi nwoke nwanne m nwanyị nke ọzọ na Ista, ọ dighị m ka olile anya ọ dị m n'ahu. Ezumike n'oge ọnwụ ha jupụtara n'obi mgbu. Agbalịsiri m ike ịchọta olile anya otu ọ bụla ọ dila, n'ihi oke obi mgbawa.

Ma ị na-enwe mmetụta nke enweghị olileanya n'ihi ọnwụ onye ị hụrụ n'anya, ma ọ bụ na ị na-agabiga ima aka mfunahụ nke ndụ (dị ka ịgba alụkwaghịm, esemokwu ezinụlọ, ọrịa, nsogbu ego, enweghị ọrụ, ma ọ bụ ihe ọzọ mere na-agbawa obi), biko mara na Chineke n'ezie hụrụ gị n'anya ma na-eche banyere gị nke ukwuu.
Ọ ghọtara nke ọma ihe ị na-agabiga ma chọọ inye gị ọgwụgwọ nke mmetụ aka Ya.

Chineke chọro karisia ihe ọbụla ịwụsa gị ịhụnanya Ya bara ụba nke ukwuu na OLILEANYA na-enweghị atụ!

Ma olee otu ị ga-esi chọta olile-anya Ya ma nwee ahụmahụ Ya n'ụzọ zuru ezu?

Malite site n'ịrịọ Chineke ka Ọ gwọọ obi gị...rịọ Ya ka Ọ mee ka olileanya Ya nke na-abịa naanị site na Ya bamie gị n'ime okpukpu...rịọ Ya ka Ọ wukwasi gị ka mmiri ozuzo ịhụnanya Ya dị ịtụnanya!
Rịọ Chineke ka Ọ bufee gị n'oge ezumike na gwa obi gị okwu n'ụzọ miri emi!
Gụọ okwu Ya ma rịọ Ya ka Ọ gwa obi gị okwu n'ụzọ dị ike ka Ọ na-akasi obi gị na mmụọ gị na-agabiga mwute.

N'agbanyeghị ihe ọbula i na-agabiga, Ọ na-eche banyere obi mgbawa gị nke ukwuu, ya mere chọọ ihu Chineke n'oge ezumike a, na mgbe niile, jiri obi gị dum!

Ị GA-achọta Chineke—na OLILEANYA Ya di ọhụrụ—mgbe i jiri obi gị nile chọọ Ya! Ebere Chineke dị ọhụrụ kwa ụbọchị, ya mere rịọ Ya maka ha!
Ọ nọ ebe a maka gị na Ọ ga-enyere gị aka n'oge ezumike a!

Ekpere:
"Ezigbo Jizọs, daalụ maka olile anya! A na m arịọ Gị kpọmkwem ka Ị nye m ezi onyinye nke olileanya ma kwe ka m chọta ma nwee ahụmahụ olileanya Gị na udo Gị n'ụzọ juru eju.
A na m arịọ Gị ka Ị jiri mmetụ ọgwụgwọ gị gọzie obi m ma wụsa m ihunanya Gị. Nna, biko Ị ga-agwọ obi m ma buru m gafee oge ezumike a? A na m ekpe ekpere na Ị ga-agwa mmụọ m okwu n'ụzọ dị ike ka m na-achọ obi Gị (na nduzi) ka m na-agụ Okwu Gị. Nye m ebere Gị dị oke ọnụ ahịa kwa ụtụtụ ma biko kasie mkpụrụ obi m obi kwa ụbọchị. Ekelee m Gị maka ịbụ ezigbo enyi m kachasị! E weere m ka akụ ma hụ n'anya ọbụbụenyi Gị! Ahụrụ m Gị n'anya, Onye-nwe-anyị!
N'aha Gị dị oké ọnụ ahịa ka m na-ekpe ekpere, amen."

Ihe Ofufe a © 2015 bụ nke Kim Niles/Irụ Ụjụ N'Enye Nsogbu N'Obi. Ikike niile iji ya mee ihe dị n'aka onye mere ya. A natara ikike iji ya mee ihe.

Igodo: ụbọchị_abụọ
ụbọchị_abụọ
https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays

https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/2.
Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Grief Bites: Hope for the Holidays

Nye ọtụtụ ndị, oge ezumike bụ oge ọñụ dị ukwuu...ma gịnị na-eme mgbe oge ezumike adighị abu nke ọñụ ma bụrụ ihe ezigbo nsogbu n'ihi oke iru újú ma ọ bụ ọnwụ? Atụmatụ a pụrụ iche ewepụtara maka ogụgụ ga-enyere ndị na-eru újú aka inweta nkasi obi na olileanya n'oge ezumike, ma n'ekesa otu esi emepụta oge ezumike bara uru n'agbanyeghị oke iru uju. Igodo: gbasara gbasara https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/1 https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/1.

More

Anyị ga-achọ ikele Kim Niles, bụ onye dere Ịnweghachita Ume Gị Ọzọ Mgbe Ndụ Kụwapụtara Gị Ya, maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.griefbites.com