Irụ Ụjụ N'Enye Nsogbu N'Obi: Olileanya Maka Oge EzumikeIhe Nhụchatụ

Mgbe mmadụ na-agabiga ọnwụ nke mmekọrịta, n'ihi ọnwụ nke onye ọ hụrụ n'anya, ịgba alụkwaghịm, ma ọ bụ esemokwu ezinụlọ, ọ na-adị ka enweghị ma oli olileanya, ọñụ na ekpo m ọkụ nke n'atọ obi ụtọ n'oge ezumike.
Otu n'ime ajụjụ ndị siri ike na nke na-agbawa obi nke onye na-eru uju nwere ike ịnwe n'oge a siri ike bụ, "Olee otu m ga-esi mee emume nke ezumike a ma ka na-echeta ma na-asọpụrụ ndị m hụrụ n'anya bụ ndị ha na Chineke na-enwe añụrị n'Eluigwe ugbu a?"
Ajụjụ ọzọ na-agbarisi obi mmadụ (onye na-agabiga ọnwụ nke onye ọ hụrụ n'anya, ịgba alụkwaghịm, ma ọ bụ esemokwu ezinụlọ) nwere ike inwe bụ, "Olee otu m ga-esi bie ndụ m n'ezumike a mgbe m na-enwe mmetụta oke mwute, oleekwanu otú m ga-esi gabiga oge ezumike a mgbe m na-atụ uche onye m hụrụ n'anya nke ukwuu?"
Oge ezumike bụ oge sigbụrụ onwe ya n'ike nye ndị na-eru uju n'ihi ọnwụ onye ha hụrụ n'anya, ịgba alụkwaghịm, ma ọ bụ esemokwu ezinụlọ ma ọ bụ nkewa.
Ndị na-eru uju na-atụ uche ndị ha hụrụ n'anya nke ukwuu, na oge ezumike na-echetakwara ha ọtụtụ ihe banyere ndị ahụ; ma ugbu a, ihe ncheta ndị ahụ magburu onwe ha maka ezumike ndị gara aga nwere ike iweta oke obi mgbawa.
Ihe mmasị ndị ahu eji kpọrọ ihe na-ewute ugbu a ma na-afụ obi ezigbo ụfụ n'ihi na onye a hụrụ n'anya anọghịzi ebe a, ma ọ bụ na ọ chọghịzi, ịkerita n'ha.
Achọputala m na ịgafe ụbọchị ndị siri ike na nke obi mgbawa nke ezumike na-eme naanị site n'amara nke Chineke...jiri ịhụnanya Ya kwa ụbọchị, enyemaka Ya, na agbamume Ya.
Rịọ Chineke ugbu a ka Ọ kasie gị obi ma gwọọ obi gị, na-rịọkwa Ya ka Ọ wụsa gị agbamume ka ị na-aga n'oge ezumike...nzọụkwụ kwa nzọụkwụ...ụbọchị kwa ụbọchị...otu oge na otu oge...mmemme kwa mmemme. Ọ nọ n'akụkụ gị ebe ị nọ, Ọ ga-ebukwa gị ka nwa.
Yabụ kedu ihe onye na-eru uju ga-eji emume ndị ahu ya na onye ọ hụrụ n'anya nwuru anwu n'emekari wee mee?
Ọ bụrụ na ị chọrọ ị na-eme emume ndị ahu ị na-emebu, n'ụzọ ọ bụla, mee ha...ma enwela obi amamikpe maka ikwe ka onwe gị nwee ọñụ. Ndị ị hụrụ n'anya nwere obi ụtọ ma hụ n'anya otu ị si jupụta n'ọñụ mgbe ha nọ ebe a. Ha ka ga-enwe mmasị ịhụ ka ị jupụtara n'ọñụ ọzọ, ọbụlagodi ka ị na-agabiga iru uju gị.
Ọ bụrụ na ọ dịghị gị ka ị ga-eme ihe ndị ahu ị na-emebu, kwanyere iru uju gị ugwu site n'inye onwe gị nnwere onwe inwe mmetụta ihe ndị dị gị mkpa inwe mmetụta. Biko enwela obi amamikpe maka mkpa ọ dị gị inwe oge ezumike nke n'enweghị nsogbu ọbụla na nke dị nwayọọ.
Ha abụọ bụ azịza kwesịrị ekwesị maka iru uju.
Biko echela na a manyere gị ime ma ọ bụ inwe mmetụta ọ bụla, ma ọ bụ kwe ka nrụgide mee ka ị mee ihe ọ bụla na-adịghị asọpụrụ ebe ị nọ na usoro iru uju gị.
Ụfọdụ ndị na-eru uju nwere ike ịchọ ime ihe masịrị ha na onye ha hụrụ n'anya nwuru anwu na-eme dị ka ụzọ isi cheta ha na ịkwanyere ha ùgwù, ebe nke ahụ nwere ike ibu ihe oke mwute nye ufodu ndị n'oge ugbu a.
Gwa ndị ị hụrụ n'anya fọdụrụnu ma kerita otu obi dị gị site n'ịkọwa otu ọ si emetụta gị. Rịọ ha maka ịhụnanya na nkwado ha n'oge ezumike.
Jiri ọtụtụ nkwado gbaa onwe gị gburugburu!
Ọ bụrụ na enwere ụlọ ụka dị gị nso nwere ogbako nkwado maka iru uju, dị ka GriefShare ma ọ bụ Grief Bites, eji m obi m niile n'agba gị ume ka ị sonyere ha taa.
Enwere oge maka ihe niile, gụnyere ịchọ ka-enye gị agbamume na nkwado, ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi iburu gị gafee oge ihe ọ bụla ị na-agabiga na ndụ. Sọpụrụ Chineke na iru uju gị.
Kwee ka Chineke duzie ma tuzie iru uju na obi mgbawa gị, rịọkwa Ya ka Ọ gosi gị otu ị ga-esi dozie n'ụzọ zuru oke ihe mmasị ndị ahu gị na onye ị hụrụ n'anya nwuru anwu na-emebu, na dozie oge ndụ gị a nke ọma.
Ụbọchị abụọ na-esote, a ga m enye atumatu otu ị ga-esi bie ndụ n'oge iru uju gị n'oge ezumike, na otu ị ga-esi nwe udo na mepụta oge bara uru n'oge ezumike nke iru uju gị.
Kpọbata Chineke, ugbu ugbu a, ka Ọ bụrụ enyi a nabatara nke ọma n'oge ezumike na n'ụbọchị ndị na-abịa.
Ekpere:
"Ezigbo Nna Nke Eluigwe Jupụtara N'Amara Nke Kachasị, a na m ekele Gị n'ihi n'agaghị m agabiga ezumike a naanị m. Ana m ekele Gị site n'obi ekele miri emi maka ịnọ ebe a maka m mgbe niile na ịhụ m n'anya, na mgbe ọ bụla, ịhapụghi ma ọ bụ gbahapụ m.
Abba Nna biko nyere m aka ubochi niile ka m na-agabiga iru uju na obi mgbawa m. Nyere m aka ka m cheta site n'ịhụnanya na nkwanye ùgwù ndị m hụrụ n'anya, ka m hapụ ihe ọ bụla na-ejide obi m ka ọhụ, na hụ ịdịmma na ngozi Gi nke ọma n'ime ahụmahụ oke ifufe nke m na-enwe na ndụ.
Ahuru m Gi n'anya, Onye-nwe-anyị, ana m etokwa Aha Nsọ Gi. N'aha Jizọs ka m na-ekpe ekpere, Amen."
Ihe Ofufe a © 2015 bụ nke Kim Niles/Iru Uju N'Enye Nsogbu N'Obi. Ikike niile iji ya mee ihe di n'aka onye mere ya. A natara ikike iji ya mee ihe.
Igodo: ụbọchị_ato
ụbọchị_ato.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nye ọtụtụ ndị, oge ezumike bụ oge ọñụ dị ukwuu...ma gịnị na-eme mgbe oge ezumike adighị abu nke ọñụ ma bụrụ ihe ezigbo nsogbu n'ihi oke iru újú ma ọ bụ ọnwụ? Atụmatụ a pụrụ iche ewepụtara maka ogụgụ ga-enyere ndị na-eru újú aka inweta nkasi obi na olileanya n'oge ezumike, ma n'ekesa otu esi emepụta oge ezumike bara uru n'agbanyeghị oke iru uju. Igodo: gbasara gbasara https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/1 https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays https://my.bible.com/reading-plans/1964-grief-bites-hope-for-the-holidays/day/1.
More
Anyị ga-achọ ikele Kim Niles, bụ onye dere Ịnweghachita Ume Gị Ọzọ Mgbe Ndụ Kụwapụtara Gị Ya, maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na:
www.griefbites.com