Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mee Njem N'ebughí Nnukwu IbuIhe Atụ

Travel Light

ỤBỌCHỊ 7 NKE 7

Gịnị Kpatara Anyị Kwesịrị Iji Mee Njem Ndụ Anyị Ebụghị Ibu?

E kwuwe, ọ̀ dị ihe kpataranụ anyị kwesịrị iji kwusi ka anyị si ebi ndụ? Gịnị kpatara anyị ga-eji hapụ ihe ndị ahụ niile wee mee ije ndụ anyị ebughi ibu?

Ọ bụ n'ihi na atọhapụrụ anyị n'agbụ ka anyị bie ndụ dị nwere-onwe.

Ọ bụ n'ihi na alụmdi na nwunye bụ nkwekọrịta na-adịgide ruo ọgwụgwụ ndụ ndị nọ na ya. 

Ọ bụ n'ihi na ọtụtụ n'ime ụmụ anyị ga-aghọkwa nne na nna ụmụ nke ha. 

Ọ bụ n'ihi na Onye kere ihe niile bụ Onye-ndú anyị.

Ọ bụ n'ihi na ọ dịghị ihe ọbụla dị n'ụwa a bụ nke anyị n'ezie. 

Ọ bụ n'ihi na ọ dịkwa onye ọzọ e mekwara ihe ụfụ, sikwa na ya n'agbake.

Ọ bụ n'ihi na Chineke bụ ụzọ gbaghara anyị.

Ọ bụ n'ihi na ihere ahụ n'enye anyị nsogbu bụ así nke onye iro. 

Ọ bụ n'ihi na Chineke enyewo anyị n'uju ihe ndị kwesiri anyị. 

Ọ bụ n'ihi na Chineke zuru ezu maka ihe niile nye anyị. 

Ọ bụ n'ihi na ime njem n'ụzọ dị otu a na-atọ ụtọ karịa. 

Ọ bụ n'ihi na ọ ga-adị mfe iza Chineke ee na njem ọzọ Ọ ga-akpọ anyị òkù ka anyị malite. 

Ọ bụ n'ihi na ebighị ebi bụ ogologo ije. 

Ọ bụ n'ihi na a mụrụ Jizọs. 

Ọ bụ n'ihi na Jizọs nwụrụ maka nke a.

Ọ bụ n'ihi na e mere ka Jizọs si n’ọnwụ bilie Ya wee gwa anyị ka anyị gaa zie mmadụ niile ozi ọma Ya!

A bụ m Jason, onye na-eje ije ndụ ya ebughi ibu n’ihi—Jizọs

Kpee Ekpere: Adịla m njikere, Chineke m, ime ka Ị kwuru. Biko nye m ike iká na-ahapụ ngwongwo nke m chikọrọ na ndụ m. Achọrọ m ka Ị bụrụ Onye-ndú nke ndụ m. A tụkwasịrị m Gị obi imere m ihe ndị a niile. Amen.

Hụ ọdịnaya ndị ọzọ gbasara ịhapụ ntakasí-ahụ na ịtụkwasị Chineke obi inyere gị aka.  

Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Travel Light

N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.life.church/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara