Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mee Njem N'ebughí Nnukwu IbuIhe Atụ

Travel Light

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Ịhapụ Ihe Niile … Kpam Kpam

Ị nyatụbelá nnukwu akpa n'azụ wee gaa njem dị anya? Ọ bụ ihe n'enye nnukwu ọṅụ ma na-eduga, oge ụfọdụ, ná ebe gasị mara ezigbo nma ile anya. Mgbe i nya nnukwu akpa n'azụ wee n'eme njem gị nke mbụ, ị na-achọpụta n'egbughị oge na ihe niile i wetara bụ nke i na-ebu. Ruo ogologo oge. Nke na-abụkarị n'elu ugwu. Ọtụtụ ndị n'eme njem a nke ibu nnukwu akpa n'azụ ma na ọ bụghị ihe niile i chọrọ ibu ka i n'eweta. Ndị nwere nkà n'ụdị njem a ma na ọ bụghị ihe niile iche dị gị mkpa ka i n'eweta maka yabụ njem.

Ihe ọbụla i n'eweta maka yabụ njem bara nnukwu uru.

Nke a adịghị nnukwu iche nye obibi ndụ, ọkwà ya? Ọtụtụ mgbe, m na-agbalị iburu ihe Chineke na-achọghị ka m buru. Amaara m nke ọma na ọ bụghị uche Chineke ka m buru adịghị-nma nke ezinụlọ m, nsogbu ego, ịta ụta m n'eme onwe m n'ihi mkpebi ọjọọ gasị m mere, ihe ndị niile m n'emezụghị n'ọrụ m n'aru, na ibu ọbụla na-abaghị uru m chọrọ ibukwasi onwe m ụbọchị taa.

Chineke kwuru ezoghí ọnụ ka anyị nye Ya nsogbu na ibu arọ anyị niile (1 Pita 5:7) na ka anyị hapụ ihe niile n'eme ka ije ndụ anyị na-akpụ n'ala (Ndị Hibru 12:1). Ọ bụ ihe itunanya na Chineke chọrọ n'ezie ka anyị tufuo ihe niile n'adola anyị azụ. Mana gịnị kpatara Chineke jiri chọọ ka anyị jee ije ụwa a apaghí ngwongwo? Gịnị mere O jiri n'agbalisí ike inara anyị ụjọ anyị, ihere anyị, ihe gasị n'eri anyị ahụ, ịta ụta anyị n'eme onwe anyị, na njigidesi-ike na-abaghị uru anyị ji n'achọ ichikwá ndụ anyị?

Mgbe ị na-ahazi akpa gị iji gaa njem ibu nnukwu akpa na-azụ, ihe ọbụla i n'etinyeghị n'akpa gị bụ ohere ihe ọzọ ga-anọchi. Chineke chọrọ inwekwu ohere na ndụ anyị maka Onwe Ya.

Nke ahụ bụ nyé na nnara dị ịtụnanya ma ọ bụrụ na i chee banyere ya; anyị na-enye Chineke ibu anyị, Ya enye anyị Onwe Ya. Anyị n'enye Ya ọchịchịrị anyị Ya enye anyị ìhè Ya. Nchegbu anyị maka udo Ya. Iwe anyị maka ọṅụ Ya. Nwute anyị maka nnwere-onwe Ya. N'agbanyeghị nke ahụ, ka anyị na-ebuwanye ibu sitere na Ya, ka ije ndụ anyị na-adịkwu mfe.

Kedụ ụfọdụ ibu ndị i bụkọjụrụ̀ ka i n'eme nje m ndụ gị bidoro inyigbu gị? Ọ bụghị iwu na i ga-aká n'apa ha. Ị nwere ike inyefe ha Chineke ka i natajuó ihe ọma sitere na Ya. Kedụ ihe ịchọrọ iburu na-abụghị nke gị iburu? Kedụ otù ị ga-esi tụkwasị Chineke obi maka ụdị ibu dị otú ahụ? Kedụ ihe ịma na ọ dị gị oké mkpa mana inweghí ike ma ọlị ipara ya? Olee otú ị ga-esi kwe ka Chineke na ndị ọzọ nyere gị aka para ụfọdụ ibu?

A bụ m Matt, onye na-agbake agbake site n'ibugbu onye ya n'ibu

Kpee Ekpere:Chineke, ejikerela m inakwere nkwa Ị kwere m. M ga-amalite ịtụkwasị Gị obi maka(tinye ibu ndị niile ipa na ndụ gị n'enye gị nsogbu). Daalụ maka ipa m na ịkwado m. Amen.

Gee ntị nụtá ozi ndị ọzọ ma nweta akụrụngwa gbasara nke a.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Travel Light

N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.life.church/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara