Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mee Njem N'ebughí Nnukwu IbuIhe Atụ

Travel Light

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

Ịhapụ Ngwóngwó

N'oge gara, ahụrụ m ngwóngwó n'anya nke ukwuu, kachasị uwe a n'eyi n'ahụ. Ngwóngwó kwa ngwóngwó, uwe, na akpụkpọ-ụkwụ gasị, m na-atụ anya ihe m ga-azụ́ ọzọ, na-adọ akpịrị n'ihe ndị ọzọ yi na-ahụ. Abịara m ghọta na ihe ndị a niile bidoro nochiwe anya mmekọrịta mụ na Chineke n'enwe kwa ụbọchị na ka m si efe Ya. 

Ndị Rom 12:1 ná nsụgharị The Message na-ekwu, sị, “Were ndụ i n'ebi kwa ụbọchị, ihe nkịtị i n'eme—dịka ihi ụra gị, iri nri, ije-ozi, na njegharị i n'eme kwa ụbọchị—buru ha debe n’ihu Chineke dị ka onyinye.”

Ya mere, a nwara m ihe ịma-aka nke ndụ nye onwe m: E goghí m uwe na akpụkpọ-ụkwụ ruo otu afọ! 

Jizọs na-agwa anyị okwu ọtụtụ mgbe banyere otu anyị si akwá ngwóngwó na ndụ anyị. Na Luk 12, Ọ kwuru maka ya n'ụzọ doro ezigbo anya.

… “Lezienụ anya! Lezienụ anya ka unu ghara ime ụdị anyaukwu ọ bụla; inwe ihe n'uju agụnyeghị na mmadụ n'ebị ndụ bara uru.” Luk 12:15 NIV 

Amụtara m ọtụtụ ihe n’ime otu afọ. Aghọtara m na ngwóngwó ahụ niile m n'akwajú abụghị naanị ibu arọ nye m. Irurú ministrị zuru mba ụwa ọrụ, aha ya bụ Tearfund, mere ka m hụ ka nrụpụta n'ìgwè ngwóngwó m, kachasị ụfọdụ ndị ahụ a n'ebelatara m ọnụ-ego ha, nwere ike ịna enye ndị agbata obi m zuru ụwa ọnụ ezigbo nsogbu na mmekpa ahụ. Ka m n'amụtakwu banyere otú ụmụnna na ụmụnne m ndị ahụ si arụsi ọrụ ike jiri obere ihe ha nwere, ihere ngwóngwó ahụ niile m kwajụrụ bidoro mewe m.

Ka agụụ m inwe ngwóngwó belatara, agụụ m nye Chineke na ihe Ya bidoro tolitewa. Echere m na m ga-efunahú ihe n'ihi ngwóngwó m niile m hapụrụ, mana enwetara m ọtụtụ ihe karịrị ihe n'aka Chineke. Ọ bụghị ụdị "ihe" n'adoro ma kpokoba dịka ugwu na-abaghị uru, ọ bụ ụdị nke na-eme ka ị nwere onwe gị. 

Enwerè m ike ịgba gị ume site n’okwu m tụgharịrị nke si n’aka Pọl Onyeozi? N'agbanyeghị nnukwu nrụgide sitere n'aka ọha na eze ka anyị nọgide n'eri ma n'azụ́ ihe ọbụna ma ọ dị anyị mkpa ma ọ dịghị—ọ bụ maka nnwere-onwe ka Jizọs jiri mee ka anyị nwere onwe anyị. Guzosie ike, ebe ị matara nke a, ekwela ka ejiri ngwóngwó na-abaghị uru nyee ndụ gị nsogbu ọzọ.

Ugbu a, ebidola m izu efe ọzọ, mana uche m dị ya. Adịkwa m ekele karịa ka m dị na mbụ. Ịma-nma efe na nkà ejiri kwaa ya bụ ihe na-amasị m ugbu a. Abụghịzi m onye mmefù, m na-agbalịsi ike ịkwanyere onye mere ihe m n'ego ùgwù, site n'ime mkpebi bara uru ka m n'ego ya. Ebe m n'edokwá efe ejuzighi eju site n'uwe, mana ndụ m jupụtara n'ihe mara mma. Nke kacha ihe niile, ma m kwuwe, maka ịhapụ ngwóngwó m niile, bụ ohere o kepụtara n'ime ndụ m ka jiri fewe Onye kacha eme ihe mara mma n'ụwa dum òfùfè. 

A bụ m Sarah, onye na-enwere onwe ya site n'aka ngwóngwó

Kpee Ekpere: Chineke m, è nweela ụzọ ọbụla m siri kwe ka ngwóngwó nochie anya mụ́ ịhụ Gị n'anya na ịhụ onye agbata obi m n'anya?  

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Travel Light

N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.life.church/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara