Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mee Njem N'ebughí Nnukwu IbuIhe Atụ

Travel Light

ỤBỌCHỊ 6 NKE 7

Ịhapụ Nchegbu Na Ịta Onwe Gị Ụta

Enyi m. Echegbula onwe gị maka ya. Ihe ọ bụla ọ bụ, ekwela ka o nyee gị nsogbu.

Ọ dịịrị gị mfe ikwu, bụ ihe i n'echè.

Igwa gị eziokwu, ọ dịghịri m mfe ime. Enwere m nsogbu nchekasị na nrụgide nke OCD kwa ụbọchị. Ọbụna n'ụbọchị ndị m si na ha amagbuola onwe ha, m kà maara na ha dị ebe ahụ, n'azụ uche m, na-eyi m egwù ikunyu ọkụ nke ndụ m. Oziọma dị nụ́, otú ọ dị, bụ na nke ahụ abụghị njedebe nke akụkọ nke ndụ m.

Chineke ekeghị anyị ka anyị bie ndụ anyị n'egwù. Anaghị m ekwu na ọ nweghị ihe n'atụ egwu na ndụ a. Anaghị m ekwu na anaghị m enwe nchegbu nke mmekọrịta mụ na mmadụ ibe m idi mmebi, enweghị ndokwa, ego m ila n'iyi, ohere bara uru ifunahù m, ma ọ bụ ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị arọ. Mana ụdị egwù dị́ otú ahụ, a pará ya, n'etolite wee ghọọ nchegbu maka ọdịnihu n'adịghị akwụsị akwụsị nke n'eduga na mkpebi n'ebute mwute banyere oge gara aga.

Achọpụtala m na ịhapụ nchegbu na-arụkwa ọrụ ime ka mmadụ ghara idí n'ata onwe ya ụta

Nke a bụ igodo iji wee megide nchegbu na ịta ụta: Chineke enyeghị anyị akwara obi iji buru nchegbu na ịta onwe anyị ụta, mana O ji ịhụnanya nye anyị ikike ilekwasị Ya anya wee sị, “Ị nwere ike iburu nke a?” Azịza Ya mgbe niile na-abụ, “Ọ bụ ihe obi ụtọ nye M. A nọ M n'eché ka ịrịọ M maka ya." Mgbe ahụ, anyị na-emeghe aka anyị na-ahapụ ibu arọ ndị ahụ, kwa ugboro, ugboro, na ugboro.

Nke ọzọ, ọ́ dịghị mkpa ka anyị gwa onwe anyị eziokwu na ànyị ga-emejọkwa n'agbanyeghị ka anyị siri nwaa ike anyị? Ihe ọjọọ ndị anyị n'atụghị anya ya nwere ike ime. N’agbanyeghị nke ahụ, ịhụnanya Chineke na-emeri egwù.

1. Chineke anọghị ọdụ n'otu ebe n'eme mkpebi otu Ọ ga-esi mebie ndụ gị. Ihe Ọ n'eme dị iche kara ka i n'eche, igwa gị eziokwu, n'ihi na Ọ hụrụ gị n'anya.

2. Mgbe ihe ọjọọ mere, Chineke bụ Onye kacha mma iji ha kpụzie gị ka i dị nma karịa ka i dị na mbụ. N'ihi na Ọ hụrụ gị n'anya.

Mgbe ị nwere mmetụta nke ụjọ ahụ, dị ka ihe ọjọọ ọ ga-eme na nso nso, ma ọ bụ ma eleghị anya ha abịalarị ma ihe mbụ mmuo gị chọrọ ime bụ ịkwụsị ihe niile i n'eme, chọọ otu ebe nọrọ ala, wee bido chegbuwa onwe gị—emela ha, ma oli. Kama ha, jiri akwara obi ndị ahụ nke Chinekenyere gị wee rute Ya nso site n’ekpere, ịgụ Akwụkwọ Nsọ, na gị na ndị dị ntụkwasị obi ikparịta ụka n’eziokwu.

Gbalịa mee nke a: Kpee ekpere n'olu dara ụda nye Chineke. Gwa Ya kpọmkwem ihe ị na-ata onwe gị ụta maka ya ma ọ bụ ihe n'enye gị nchegbu. Gwa Chineke na ị na-atụkwasị Ya obi maka ha niile. Mgbe ị mechara nke a, chetara onwe gị ụfọdụ eziokwu banyere onye Chineke bụ na onye O mere ka ị bụrụ.

A bụ m Tommy, onye n'ekweghị ka nchegbu wuo m n'ala.

Ụbọchị 5Ụbọchị 7

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Travel Light

N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.life.church/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara