Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mee Njem N'ebughí Nnukwu IbuIhe Atụ

Travel Light

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Ịhapụ Mmejọ Emejọrọ Gị

O nwere ike i kpaala àgwà otu a otù oge: Anyị nọ n'adonye ibu n'ime ụgbọala anyị, na-akwado ịga njem okporo ụzọ ịga hụ ndị ezinụlọ anyị bi ebe tere anya, n'oge Ekeresimesi. Mana ntakasi-ahu ekweghị ka m kwuoro di m ma ọ bụ ụmụ m okwu ọma, ma n'oge n'adịghị anya—ike onwe m bịara gwụ m. Dị m hụrụ nke a wee jụọ m n'olu nrọ si m̀ "Gịnị na-eme gị?" O doro anya na àgwà m a akariala ka m si emebu ma anyị na-achọ ịga njem.

Ka anyị gbafechara ọtụtụ kilomita, ebidoro m n'ajú onwe m ajụjụ a dị́ ka ọ baghị uru, Gịnị mere m ji na-echegbu onwe m n'oge a bụ oge ọṅụ n'afọ? Ịmanụ̀ ihe ndị a n'ahụ ma n'eme n'oge dị otu a n'afọ. Ọ bụ oge eji eme emume ọmụmụ Jizọs, nlekọta na mmekọrịta ezinụlọ, ndị enyi, iri erimeri, inye onyinye, ikirí na ịgba egwuregwu futbol, na ịṅụ ihe ọṅụṅụ kokò dị ọkụ togburu onwe ya. Ọ bụ ezumike site na ihe omume anyị na-eme kwa ụbọchị. Kedụzi ihe n'esogbu m?

Echeghị m echiche ogologo oge banyere nsogbu m, tupu m kpebie ịrịọ Chineke ka O gosi m ihe kpatara m ji enye onwe m nsogbu. Okwu ndị na-akpasu iwe na nkatọ gafere otu afọ sitere n'aka onye òtù ezinụlọ m biaghachitara m n'uche.

Ọ bụ̀ n'uche m ka okwu ọjọọ ndị ahu niile bịara nọgide, n'etó ma na-agbà? Oge ahụ m ji anya ụgbọala mere ka m ghọta na ekwerelà m okwu ọjọọ ndị ahụ wee kwe ka ha echiche m ndị n'adịghị nma kwekọọ. E wesara m onwe m iwe n'ihi na m ebilighị otó kwuchie ọnụ onye ahụ n'ekwutọ̀ m, mana iwe kà wee m n'ihi na m buru ibu ihe dị otu a ogologo oge. Nke kacha wee m iwe bụ na m kwere ka ihe dị otú ahụ bido inye ezinụlọ m nsogbu. Mana iwe m niile adịghị ihe bara uru o n'eme iji belata nrụgide m n'enwe.

N'ikpeazụ, ekpebiri m ịmalite kpewere onye ahụ n'eme m ka m nwe mmetụta dị otú a ekpere. O nwere ike ekpere m agaghị agbanwe ha, mana ọ ga-agbanwe ka m si ahụ ha, bụ̀ ihe m chere n’obi m. Ekpebiri m ịmalite ịgba ha ume na igwa ha okwu ọma n'ihi na ikekwe ihe ha kwuru sitere na ka ha si ele onwe ha anya na mwute ha gabigara, dị ka mụ. Nke a bụ ụzọ kacha nma isi meso ihe dị otú a omume. Ụzọ Chineke si ka anyị soro.

Ekpebikwara m ịgbaghara onye ahụ. Jizọs gwara anyị ma gosi anyị otú anyị ga-esi eme mgbaghara. Ọ gbaghaara m. Ugboro iri asaa mejupụta ya ụzọ asaa n'ụbọchị, bụ ugboro ole O kwuru na anyị kwesịrị ịgbaghara ibe anyị. N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, anyị kwesịrị ịgbaghara ibe anyị mgbe ọbụla ọ dị mkpa ime mgbaghara.

Ụgbọala ezinụlọ m dị mfe iji mee njem n'afọ a n'ihi na ebughí m ibu oké egwù na ihe mgbu. Kama ha, apa m ọnịnọ Ya, udo Ya, na ìhè Ya.

Kedụ mmekọrịta dị na ndụ gị n'enye gị nrụgide? Olee ụzọ i ga-esi kwe ka Jizọs dị n'ime ime gị nye gị ezumike maka yabụ nrụgide?

Christi, a bụ m onye n'egbughị ngwongwo wee n'eme njem Ekeresimesi a

Tụlee: Kedụ onye i ga-anọgide n'ekpe ekpere maka ya? Kedụ otu ị ga-esi n'agbaghara yabụ mmadụ?

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Travel Light

N'oge Ekeresimesi jupụtará n'ihe aga eme-eme, ọtụtụ n'ime anyị na-enwe nsogbu na ntakasị-ahụ nke mmekọrịta ezinụlọ, ego ezughị okè, mkpebi ana echezighị echezi wee mee, na ndakpọ olileanya ihe a tụrụ anya ya. Ya mere gaa n'ihu. Kutú obere ume ndụ. Malite Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a nke Life.Church ka ị wee ghọta na ibu ndị a n'anyigbu anyị nwere ike ịbụ ihe ndị Chineke na-agwaghị anyị ka anyị buru. Ọ́ gaghị́ adị mma ma anyị hapụchaa ibu arụ ndị a? Ka anyị mee njem n'egbughí nnukwu ibu.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Life.Church maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.life.church/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara