Ihe Ngosi Nke Ọmụmụ JizọsIhe Atụ

Ndị ikpeazụ anyị n'ahụ anya na ihe ngosi nke ọmụmụ Jizọs bụ ndị nwoke-amamihe ahụ ma ọ bụ ndị mejai. Ọ ga-abụ na ha bụ ndị ọkà mmụta n'abụghị ndị Juu n'elele ihe jupụtara na mbara igwe, ndị hụrụ kpakpando ahụ ka ọ pụtara n’ígwé n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs. Ha maara na ihe ahụ ha hụrụ n'egosi nnukwu ihe dị egwù na mgbanwe mere n'eluigwe na ụwa. Ha mere njem iji mata ebe ihe a dị ukwu si malite ma eleghị anya ha wee nụ akụkọ gbasara ọmụmụ Jizọs ka ha n'eme njem ha. Ya mere ha jiri gakwuru Eze Herọd n’ihi na ha chọrọ izute eze ọhụrụ a ka ha kwanyere Ya ùgwù na fee Ya òfùfè.
Herọd, bụ eze ndị Rom họpụtara ugbu a ịchị ndị ụmụ Izrel, enweghị obi ụtọ chaa ịnụ na e nwere eze bịara ịgba ọnọdụ na ọchịchị ya mgba. Nke a bụ ihe dị iche n'etiti Herọd na ndị nwoke-amamihe ahụ: ebe Herọd hụrụ ihe ga-emekpà ọchịchị ya na ọnọdụ ya, ndị nwoke-amamihe ahụ hụrụ olileanya. Herọd ahụghị Jizọs, dị ka Onye-Nzọpụta pụrụ ịzọpụta ya, kama ọ hụrụ Ya dịka onye bịara ịgba ọchịchị ya n'elu ụmụ Izrel mgba na onye bịara imegide onyinyé-iwu ya dị ka eze. Ọ marala Herọd ahụ ị bụ onye n'enye iwu dịka eze na onye na-agwa ndị mmadụ ihe ha ga-eme. Ọ chọghị irubere Ọkpara Chineke isi. Ma n’agbanyeghị na a zụliteghị ndị nwoke-amamihe ahụ n'ụzọ ife Chineke, ha maara na ọmụmụ Jizọs gosipụtara ihe dị oké egwù na dị ezigbo ịtụnanya. Ha hụrụ olileanya ma nwee oke ọñụ mgbe ha nụrụ akụkọ banyere Jizọs.
Ndụ anyị n'ezute otu nhọrọ ahụ. Mgbe anyị nụrụ banyere Jizọs ma ghọta Oziọma ahụ, Ọ nà-aghọ̀ Onye-Nzọpụta anyị na Eze anyị. Nke ahụ pụtara na anyị na-ahapụ ikike anyị ime nhọrọ gasị gbasara ndụ anyị. Anyị n'ebizi ndụ anyị ugba a tụkwasị obi na anya na Eze Jizọs, a bụghị na onwe anyị. Ya mere, ajụjụ dịnụ bụ̀, ị dị kà Herọd? Ị̀ na-ahụ Jizọs dị ka ihe bịara imekpa ndụ gị, ighasasị ndụ gị, inye ndụ gị nsogbu ma ọ bụ ịtụgharị atụmatụ gị niile? Ma ọ bụ ị̀ dị ka ndị nwoke-amamihe ahụ, bụ́ ndị hụrụ Jizọs dị ka olileanya nye ndụ ha?
Ajụjụ Gasị Maka Ntụgharị Uche:
Gịnị ka ị cherè mere ndị nwoke-amamihe ahụ jiri wepụta obi ha niile mee njem ahụ dị oké anya iji chọta Jizọs?
Kedụ akụkụ-gasị nke ndụ gị ọ n'esiri gị ike ịhapụ ma ọ bụ ịnyefe n'aka Jizọs kpam kpam?
Ị̀ na-ahụ Jizọs dịka nsogbu nye gị ma ọ bụ dịka olileanya maka ndụ gị?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Otu n'ime ọtụtụ omenala Ekeresimesi ezinụlọ gasị n'eme bụ ikwado wee gosipụta ihe a n'ahu anya gbasara ọmụmụ Jizọs. Ka ọ na-adịkarị, anyị na-ahụ Meri, Josef, ndị ọzụzụ atụrụ, atụrụ gasị, na ndị nwoke-amamihe ahụ ka ha gbara nwa ọhụrụ ahụ gburugburu, nke dina n'ihe e ji etinyere anụ-ụlọ nri. Ọ bụ ihe nkiri mara mma n'echetara anyị maka ọmụmụ Jizọs. Mana ọmụma anyị nke ọma banyere ihe ngosi nke ọmụmụ Jizọs nwere ike ime ka anyị chefuo ọbụbụ-mmadụ nke onye ọbụla nọ n'akụkụ nwa ahụ a mụrụ ọhụrụ, n'abalị ahụ pụrụ iche.
More