Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Ngosi Nke Ọmụmụ JizọsIhe Atụ

The Nativity Scene

ỤBỌCHỊ 2 NKE 4

Burú echiche gị laa na mgbe ị bụ nwata. Kedụ ihe ị chere na ị ga-abụ ma ị ruo afọ ị dị ugbu a? Kedụ ihe ị chere na ndụ gị ga-adị kà na afọ ise na-abịa, afọ iri na-abịa, afọ iri abụọ na ise na-abịa?

Ichè echichè banyere ọdịniru nwere ike iwepụta mmetụta dị iche iche nye ọtụtụ n'ime anyị. Ọ nwere ike ị bụ ihe na-atụ ụjọ ichè echichè banyere ọdịniru ma ọ bụrụ na ị maghị ihe ọzọ ị ga-eme na ndụ gị. Ọ bụrụ na obi gị dị n'otu ụzọ ịchọrọ ịga, ọ nwere ike ịbụ ihe n'enye obi aṅụrị ịrụ ọrụ iji mezuo ebumnuche gị. Mana kedụ ka ọ ga-adị ma ndụ gị gaa ụzọ ị na-atụghị anya ya ma ọlị?

Nke ahụ bụ ọnọdụ Joseph hụrụ onwe ya mgbe mmụọ ozi Onye-nwe-anyị gosiri ya onwe ya ma gwa ya ozi ọma nke bụ na nwa-agbọghọ ọ chọrọ ịlụ ga-amụ nwa nwoke. Eleghi anya, ọ dịghị mgbe Josef chere na ịlụ Meri ga-agụnye ịzụ nwa Chineke dị ka nke ya.

Ọ bụrụ na nke ahụ dị ka nnukwu ọrụ, ọ bụ maka na ọ bụ nnukwu ọrụ n'ezie. Mana Josef bụ nwoke-ezi-omume, n’agbanyekwaghị na anyị ahụghị ọtụtụ ihe banyere ya n’Akwụkwọ Nsọ, anyị na-ahụ na o ji ọṅụ kwere na ọ ga-aga n'iru ịlụ Meri ma zụlite Jizọs dị ka nwa nke ya.

Ọ bụ ezie na ọnọdụ ndị metụtara ọmụmụ Jizọs bụụrụ ndị mụrụ ya ihe ijuanya, Chineke maara rị maka ha. Na ndụ nke onwe anyị gasị, a ga-enwe ọtụtụ ihe na-aghasasị atụmatụ anyị. Ọnọdụ gasị ga-agbanwe n'ụzọ anyị na-atụghị anya, ma ọ bụ ezie na ha ga-eju anyị anya, anyị aghaghị icheta na ọ dịghị mgbe Chineke amaghị na ọnọdụ ndị ahụ ga-eme.

O zubeela ihe nile dika uche-Ya si di ka i n'eje ije n'ime ha. N’otu aka ahụ, Ọ họpụtaghị Meri na Josef na mgberede ka ha bụrụ nne na nna nke nwa Ya nwoke n’ụwa. Ọ họpụtawo gị iji gị wee mee ihe n'agbanyeghị na atụmatụ Ya abụghị ihe ị tụrụ anya maka ndụ gị.

Ajụjụ-Gasị Maka Ntụgharị Uche:

Anyị na-echekarị na Jizọs bụ nwa ọhụrụ ma mechaa wee bụrụ onye nkụzi dị ukwuu, mana gịnị ka i cherè na ị bụ nne ma ọ bụ nna Jizọs dị kà? Ị̀ chè na ọrụ ahụ bụ ihe oke ọñụ?

Olee otu ụzọ Chineke si jiri ọnọdụ ndị bịakwutere gị na mgberede wee mee ihe na ndụ gị n'ụzọ ị na-atụghị anya?

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

The Nativity Scene

Otu n'ime ọtụtụ omenala Ekeresimesi ezinụlọ gasị n'eme bụ ikwado wee gosipụta ihe a n'ahu anya gbasara ọmụmụ Jizọs. Ka ọ na-adịkarị, anyị na-ahụ Meri, Josef, ndị ọzụzụ atụrụ, atụrụ gasị, na ndị nwoke-amamihe ahụ ka ha gbara nwa ọhụrụ ahụ gburugburu, nke dina n'ihe e ji etinyere anụ-ụlọ nri. Ọ bụ ihe nkiri mara mma n'echetara anyị maka ọmụmụ Jizọs. Mana ọmụma anyị nke ọma banyere ihe ngosi nke ọmụmụ Jizọs nwere ike ime ka anyị chefuo ọbụbụ-mmadụ nke onye ọbụla nọ n'akụkụ nwa ahụ a mụrụ ọhụrụ, n'abalị ahụ pụrụ iche.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Youth Commission International maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://yciclubs.com

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara