Ihe Ngosi Nke Ọmụmụ JizọsIhe Atụ
O siri ike iji anya uche n'eme ncheta nke ihe ngosi nke ọmụmụ Jizọs hapụ icheta otu n’ime ndị kasị dị mkpa, Meri bụ nne Jizọs. Ọ bụ site n'aka nwa agbọghọ a dị ịtụnanya ka Ọkpara Chineke ga-abanye n'ụwa Ọ ga otu ụbọchị zọpụta site n'ọnwụ Ya n'obe.
Mana atụmatụ nke Chineke dị iche na atụmatụ nke Meri. Ikwu eziokwu, ọ ga-abụ na Meri lere anya otú ndụ ya ga-esi gbanwee n'ụbọchị ahụ Gebriel gwara ya na ọ ga amụ nwa. Atụmatụ ya bụ ịlụ Josef ma soro ya malite ezinụlọ nke aka ha. E kwuwe, olee otú ọ ga-esi mụọ nwa ebe ọ kà bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke?
O yighị ihe ga-ekwe omume na Meri ga-amụ nwa, mana Gebriel kọwaara ya na Chineke pụrụ ime ka ihe na-agaghị ekwe omume kwe omume, na ọ ga-atụ ime site n'ike nke Mmụọ Nsọ, na nwa ọ ga-ebu n'afọ ya ga-abụ Ọkpara Chineke!Meri tụlere atụmatụ nke ya megide atụmatụ Chineke nwere maka ndụ ya. Ọ gwara mmụọ ozi ahụ, “Abụ m ohu Onye-nwe-anyị, ka okwu gị bịa na mmezu na ndụ m.” Omume ya na ihe o kwuru ọ dịghị ịtụnanya?
Meri dị njikere ịhapụ atụmatụ ya na ọchịchọ ya gasị wee gbaso ọkpụkpọ-òkù nke Chineke maka ndụ ya. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ ihe ihere ịbụ nwaanyị bu afọ ime mana ọ lụbeghị dị, bụrụkwa ezie na Josef nwere ike ọ gaghị ekwete nkọwa ya gbasara ọnọdụ ya, ọ tụkwasịrị obi na atụmatụ Chineke dị mma karịa atụmatụ o nwere maka onwe ya.
Na ndụ nke anyị, ka anyị chetakwa nke a. Anyị nwere atụmatụ na echiche dị iche iche maka ndụ anyị, mana anyị enwekatakwala chefuo na Chineke pụrụ ime karịa ka anyị nwere ike iche n'echiche.
Ajụjụ Gasị Maka Ntụgharị Uche:
Olee otú i cherè na obi dị Meri mgbe mmụọ ozi ahụ guzorò n’iru ya?
Olee atụmatụ Chineke nwere maka gị nke na-adabaghị ná atụmatụ gị?
Kpee ekpere ka Chineke nye gị ụdị okwukwe Meri nwerè ka ị tụkwasị obi na Chineke dị ike karịa ka ị pụrụ iche n'echiche.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Otu n'ime ọtụtụ omenala Ekeresimesi ezinụlọ gasị n'eme bụ ikwado wee gosipụta ihe a n'ahu anya gbasara ọmụmụ Jizọs. Ka ọ na-adịkarị, anyị na-ahụ Meri, Josef, ndị ọzụzụ atụrụ, atụrụ gasị, na ndị nwoke-amamihe ahụ ka ha gbara nwa ọhụrụ ahụ gburugburu, nke dina n'ihe e ji etinyere anụ-ụlọ nri. Ọ bụ ihe nkiri mara mma n'echetara anyị maka ọmụmụ Jizọs. Mana ọmụma anyị nke ọma banyere ihe ngosi nke ọmụmụ Jizọs nwere ike ime ka anyị chefuo ọbụbụ-mmadụ nke onye ọbụla nọ n'akụkụ nwa ahụ a mụrụ ọhụrụ, n'abalị ahụ pụrụ iche.
More