Ihe Ngosi Nke Ọmụmụ JizọsIhe Atụ
N'oge ochie, mgbe Rom ga-eme ememe mmeri na agha, nkwekọrịta udo ọhụrụ, ma ọ bụ ọmụmụ nke eze ka eze, ha na-ezipụ ndị ozi ka ha zisara onye ọ bụla ha zutere ozi ọma a. Ndị ozi a nwere ọrụ dị mkpa ebe ọ bụ na e nweghị ihe mgbasa-ozi-ọha ma ọ bụ ụzọ esi ezisa ozi n'ụzọ sara mbara n'oge ahụ, dika anyị nwere ugbu a.
Okwu ọnụ bụ otú e si agbasa ozi ọma n’oge Rom. Ugbu a, lee anya na mba Izrel nke ndị Rom wakpọrọ wee n'achi. N'ime ime abalị, n’otu obere obodo, n’etiti ala sara mbara, ìgwè ndị ọzụzụ atụrụ nọ n'agbalị ka ha nwetatú okpomọkụ site na ọkụ ha n'anyá ka ha n'echedo ìgwè atụrụ ha. N'otu ntabi anya, nnukwu ìhè tisara mbara igwe wee mee ka ọ n'egbuke egbuke dị ka chi ọbụbọ ma ùsù ndị mmụọ ozi pụtara wee n'ekwusa ozi ọma na a mụọla eze ọhụrụ.
A bụghị eze ka eze nke Rom, kama ọ bụ Onye Nzọpụta nke ụwa niile.
Mgbe ha nụrụ ozi a, ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ gbarala ọsọ gaa ịhụ nwa ọhụrụ a. Mgbe ha hụchara Jizọs, ha bidoro gazụ̀wa obodo nta ha ahụ wee n'agwa onye ọ bụla ihe ha nụrụ.
Anyị onwe anyị nwekwara otu ozi ọma ahụ nke ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ nwere, anyị onwe anyị kwa kwesịrị ịbụ ndị ana ekwesịghị ikwa aka ka ha zisaa ozi ọma na Onye Nzọpụta nke ụwa abịawo. Ihere emeghị ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ ịkụ aka n’ọnụ ụzọ ndị mmadụ n’etiti abalị izi onye ọ bụla ozi ọma banyere ọmụmụ Jizọs. Anyị nwere ohere ikwusara ụwa niile ozi, a bụghị naanị maka ọmụmụ Jizọs, kamakwa maka ọnwụ na mbilite n'ọnwụ Ya. Dịka n'oge ndị ozi Rom na ndị ọzụzụ-atụrụ, Chineke na-agwa anyị ka anyị gbasaa ozi ọma nke Ọkpara-Ya nye onye ọ bụla nọ n’ógbè anyị na n'ndụ anyị.
Ajụjụ Gasị Maka Ntụgharị Uche:
Kedụ ihe iká nma gasị anyị nwere karịa ndị ọzụzụ-atụrụ ahụ n’ịgbasara ndị mmadụ ozi ọma banyere Jizọs ụbọchị taa?
Olee mmadụ atọ ndị nọ na ndụ gị ị pụrụ ikpere ekpere ma chọọ ohere iji zie ha ozi ọma banyere Jizọs? Kpee ekpere banyere nke ahụ ugbu a.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Otu n'ime ọtụtụ omenala Ekeresimesi ezinụlọ gasị n'eme bụ ikwado wee gosipụta ihe a n'ahu anya gbasara ọmụmụ Jizọs. Ka ọ na-adịkarị, anyị na-ahụ Meri, Josef, ndị ọzụzụ atụrụ, atụrụ gasị, na ndị nwoke-amamihe ahụ ka ha gbara nwa ọhụrụ ahụ gburugburu, nke dina n'ihe e ji etinyere anụ-ụlọ nri. Ọ bụ ihe nkiri mara mma n'echetara anyị maka ọmụmụ Jizọs. Mana ọmụma anyị nke ọma banyere ihe ngosi nke ọmụmụ Jizọs nwere ike ime ka anyị chefuo ọbụbụ-mmadụ nke onye ọbụla nọ n'akụkụ nwa ahụ a mụrụ ọhụrụ, n'abalị ahụ pụrụ iche.
More