Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Inweghachita Ọñụ GịIhe Atụ

Recovering Your Joy

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Kesaa Oñụ Nke Nzọpụta Gị

Gụọ Ndị Efesọs 2:10.

Ọ bụrụ na ịchọrọ ị nweghachita ọṅụ gị, ị ga 1) ekweta na ọ pụọla, mgbe ahụ gị 2) enyochaa ihe kpatara ya. Nke ọzọ, 3) gị edozie ihe na-adịghị mma, na 4) gị enweta àgwà nke ekele.

Enwere usoro atọ ọzọ iji nweghachita ọṅụ gị nke anyị ga-ekwu maka ya taa.

Nke mbụ, ị ga-eweputa oge ka gị na Chineke na-anọrị kwa ụbọchị.

Ọ nwere ike isiri gị ike iche na Chineke chọrọ ka gị na Ya na-anọrị. Ọ nwere ọtụtụ ihe Ọ na-eme, ọ bụghị ya? Mana n'ebe niile n’ime Akwụkwọ Nsọ, Chineke na-akpọ anyị òkù ịbịa n’ihu Ya. E nwekwara ọṅụ nke na-abịa mgbe anyị na Chineke na-anọkọ n’oge dị jụụ kwa ụbọchị, n’ihi na anyị na-amụta ịnụ olu Ya ma chọpụta ihe Ọ chọrọ ka anyị jiri ndụ anyị mee. Ka gị na Chineke na-anọkwu, otú ahụ ka gị na Ya na-adịkwu ná mma.

Nke abụọ, ịkwesịrị ịchọta ụzọ ị ga-esi nyeghachi. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu nke a ná Ndị Efesọs 2:10: “Ọ kere anyị ọzọ n’ime Kraịst Jizọs, ka anyị wee mee ezi ihe ndị Ọ zubeere maka anyị ogologo oge gara aga.” (NLT) N'oge ihe siri ike, ọ na-adị mfe ịche naani maka onwe gị. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na, ka ị na-elekwasịkwu onwe gị anya, otú ahụ ka ọṅụ ga-na efunahụrụ gị.

Agaala m gburugburu ụwa, anọwokwa m n’ọtụtụ obodo mechiri emechi ebe a na-akpagbu ndị mmadụ n’ihi okwukwe ha na Jizọs Kraịst. Ị ma ihe m chọpụtara? Ndị Kraịst a na-akpagbu bụ ndị kasị nwee ọṅụ n’ụwa. Gịnị kpatara nke a? Ọ bụ n'ihi na ọ pụtara ihe nye ha. Ha abụghị ndị nkịtị, ndị "nara ya ma ọ bụ hapụ ya" Ndị Kraịst. Ikike ife ofufe na nnwere onwe ha n’ime Kraịst pụtara ihe nye ha. Ma, ha na-enwekwa obi ụtọ karịa.

Ịkwesịrị ịchọta ụzọ ị ga-esi nyeghachi. Ozugbo i wepụsịrị uche gị n'onwe gị, ị ga-ahụ na ọṅụ gị na-alaghachita.

Nke ikpeazụ, iji nweghachita ọṅụ gị, ọ dị mkpa ka ịgwa mmadụ banyere Jizọs.

Ọ dịghị ihe ga-eweghachita ọṅụ gị ngwa ngwa karịa gị enweghị ezumike maka nzọpụta nke enyi gị. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na mgbe ọ bụla mmadụ nabatara Onye-nwe-anyị, ha na-eme oriri n'Eluigwe. Ị maara nke ahụ? Luk 15:7 na-ekwu, “A na-enwe aṅụrị karịa n’eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke gbanwere obi ya na ndụ ya” (NCV). Ụbọchị ị zofere akara ahu ukwu, ha meere gị oriri na nkwari n'Eluigwe. Ma ụbọchị ị nyeere mmadụ aka ka ọ mata Onye-nwe-anyị, a ga-enwe oriri n'ime obi gị. Aṅụrị na-alaghachita ka ị na-ekesara ndị ọzọ.

Kpee ekpere a taa:
“Nna, nyere m aka ịji ịhụnanya kwụghachi ịkpọasị, iji ọṅụ kwụghachi iru újú, na iji obiọma kwụghachi enweghị mmasị. Ka ọńụ nke Onye-nwe-anyị pụta ezigbo ìhè n’ihu m nke ga-eme ka ndị mmadụ na-achọ ịmata ihe kpatara ya na ịmata olile-anya nke dị n’ime m. Nyere m aka irube isi n'ihe Ị gwara m ka m mee. Nyere m aka ilekwasị anya na ngọzi Gị di n'ime ndụ m ka m wee nwee àgwà nke ekele maka ikwesị ntụkwasị obi Gị. Weghachite ọn̄ụ nke nzọpụta m ka m wee kesaara ya ndị ọzọ ma nyere ha aka ịchọta ọn̄ụ nke ha site na mmekọrịta Gị na ha. Ekelere m Gị na m nwere ike inwe olileanya na ọṅụ site na Jizọs Kraịst. Amen.”
Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Recovering Your Joy

Ọ bụrụ na ịchọrọ ọñụ na ndụ gị, ị ga-achọta nguzozi n'usoro ihe omume gị. Ụkọchukwu Rick na-ekerịta otu ị ga-esi hazigharịa ntinye gị na mmepụta gị ka nye na nnara gị nyere gị aka nweghachita ọñụ gị, na-abụghị ka ọ funarị gị.

More

Ihe mmụta ofufe a nke e mere na 2014 sitere n'aka Rick Warren. Ikike niile banyere ihe ọbụla eji ihe mmụta ofufe a eme di n'aka Rick Warren. A natakwara ikike iji ihe mmụta ofufe a mee ihe.