Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Inweghachita Ọñụ GịIhe Atụ

Recovering Your Joy

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Ịchọta Ọṅụ Gị Ịfunahụrụ

Gụọ Ndị Rom 14:17.

Kedu ihe kacha dị gị mfe ifunahụ? Ugogbe anya gị? Igodo gị? Uche gi?

Ihe kachasị mfe ifunahụ bụ ọṅụ gị. Ị nwere ike ifunahụ ya site na otu oku ekwentị ma ọ bụ email, leta ma ọ bụ mkparịta ụka. Ị nwere ike ile mgbasa ozi na TV ma funahụ ọṅụ gị. Ọ bụ ihe kacha mfe n'ụwa ifunahụ. Makwa ọtụtụ ndị mmadu nọ n'ọtụtụ ọnọdụ na-agba izu ipụnara gị ya.

Mgbe ụmụ Chineke ejupụtaghị n'ọṅụ, ọ na-eme ka Chineke dị ka Onye Ọjọọ. Ndị Kraịst ahụ na-agbakasi n'iwe bụ ndị ajọ àmà. Ha dị ka e mere ha baptizim n’ime mmanya kugburu onwe ya n'ilu n’ihi na ọ dịghị mgbe ọnụ ọchị di n'ihu ha. Ma nke ahụ bụ nke na-eme ka Chineke dịka Onye Ọjọọ.

Gịnị kpatara nke a? Ọ bụ n'ihi na Chineke chọrọ ka anyị jiri ihu anyị bụrụ ndị akaebe.

Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na e nwere ike iji okwu atọ chịkọta ndụ n'ime Kraịst: ịdị mma, udo, na ọṅụ. Ndị Rom 14:17 kwuru sị: “Alaeze Chineke abụghị nke ihe anyị na-eri ma ọ bụ ihe anyị na-aṅụ, kama ọ bụ nke ibi ndụ nke ịdị mma na udo na ọṅụ n’ime Mmụọ Nsọ” (NLT).

Otú ọ dị, nke bụ́ eziokwu bụ na, ị pụrụ ifunahụ ọṅụ gị ngwa ngwa, e nwekwara ọtụtụ puku ụzọ ị ga-esi funahụ ya. E nwere puku kwuru puku ihe ndi na-egbu ọṅụ ná ndụ nke ga-anapụ gị ọṅụ gị, nke mere na onye dị ka Jeremaịa, onye amụma Chineke, pụrụ ikwu nke a n’Abụ Ákwá 5:15, “Ọ dịghị ọṅụ ọ bụla fọdụrụ n’ime obi anyị.” (GW).

Amaghị m ma ọ bụ ebe ahụ ka ị nọ taa, mana ọ bụrụ na onwekatala mgbe ị nwere ahụmahụ nke oge ahụ ebe ọ dị gị ka ị funahụrụ ihe ahu n'amuke ọṅụ n'ndu gị nakwa ị dịghị Chineke nso dịka ị na-adịbu na ị nọ n'ebi ndụ dika onye n'enweghị ọṅụ ma ọ bụ olileanya ọbụla, o di mkpa ka ị mara na ọ di ezigbo mfe inweghachita ọṅụ gị.

Yabụ, kedu ka ị ga-esi nweghachita ọṅụ gị?

Nzọụkwụ nke mbụ ị ga-eme bụ ikweta na ị funahụrụ ọṅụ gị.

Naanị leba anya n’oge gara aga n'ndu gị ma jụọ onwe gị ajụjụ ole na ole: Ò nwetụla oge ná ndụ gị mgbe ị nọ Chineke nso karịa ka ị nọ ugbu a? Ọ̀ dịtụla oge na ndụ gị mgbe ị na-aṅụrị ọṅụ n’ime Onye-nwe-anyị karịa ka ị na-enwe ugbu a?

Ugbu a bụ oge ime mgbanwe. Mana ị ga-amalite site n'ikweta na ị funahụrụ ihe ị nwere n'oge gara aga. Ị nwere ike ịjụ Chineke banyere ya; Ọ na-eche inyere gị aka. Devid kpere ekpere nke a n’Abụ Ọma 51:12: “Weghachitere m ọṅụ nke nzọpụta Gị” (NIV).
Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Recovering Your Joy

Ọ bụrụ na ịchọrọ ọñụ na ndụ gị, ị ga-achọta nguzozi n'usoro ihe omume gị. Ụkọchukwu Rick na-ekerịta otu ị ga-esi hazigharịa ntinye gị na mmepụta gị ka nye na nnara gị nyere gị aka nweghachita ọñụ gị, na-abụghị ka ọ funarị gị.

More

Ihe mmụta ofufe a nke e mere na 2014 sitere n'aka Rick Warren. Ikike niile banyere ihe ọbụla eji ihe mmụta ofufe a eme di n'aka Rick Warren. A natakwara ikike iji ihe mmụta ofufe a mee ihe.