Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Inweghachita Ọñụ GịIhe Atụ

Recovering Your Joy

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Nwee Obi Utọ Na Ndụ Gị

Gụọ 1 Timoti 6:17.

Ị nwere ike ịnọ n'oké nrụgide ugbu a n'ihi akụ na ụba nke uwa a n'ezughi ezu, mana Chineke ka chọrọ ka ị nụ ụtọ ndụ.

Dị ka Onye Kraịst, ị pụrụ ịnụ ụtọ ndụ n’ihi na odighi ọmụma ikpe ọbụla di n'akọnuche gị. Ị nwere ike ịnụ ụtọ ndụ n'ihi na ị nọ ná nchebe n'ime ịhụnanya nke Chineke. Ị nwere ike na-ekpori ndụ na-achị ọchị n'ime Ụlọ ụka. Ị pụrụ inwe ndị enyi na-adịghị aghọgbu gị n’ihi na ha na-amụta ime ka Jizọs, nke ahụ pụtakwara na ha na-amụta ileba anya n’ọdịmma nke ndị ọzọ.

N’ụzọ dị mwute, e nwere ọtụtụ ndị na-achọghị ikwe ka Chineke banye ná ndụ ha n’ihi na ha na-atụ egwu na Ọ ga-eme ka ha hapụ ihe ọ bụla na-atọ ụtọ. Ha na-eche na ịghọ Onye Kraịst bụ otu ihe ahụ ịsị na inwe obi ụtọ agwụla, na ịbụ onye ihe ime mmụọ bụ idi ná nhụsianya.

Ndị mmadụ na-achọ ihe ndi ga-enye ha obi ụtọ ná ndụ, mana nke ahụ pụtara na ha na-arụ ọrụ n'okpuru iwu nke mbelata ihe ndi ha turu anya ha. Ha na-etinyekwu oge, nnukwu ego, na nnukwu ume mana ha anaghị enweta ihe na-atọ ụtọ otu ha chọrọ. Ha na-agagharị na-ajụ, “Ànyị na-ekporikwari ndụ?”

Nke bụ́ eziokwu bụ na, Chineke “na-enye anyị ihe niile n’ụba ka anyị nwee obi ụtọ.” (1 Timoti 6:17b NIV).

Chineke chọrọ ka ị nụ ụtọ ndụ!

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Recovering Your Joy

Ọ bụrụ na ịchọrọ ọñụ na ndụ gị, ị ga-achọta nguzozi n'usoro ihe omume gị. Ụkọchukwu Rick na-ekerịta otu ị ga-esi hazigharịa ntinye gị na mmepụta gị ka nye na nnara gị nyere gị aka nweghachita ọñụ gị, na-abụghị ka ọ funarị gị.

More

Ihe mmụta ofufe a nke e mere na 2014 sitere n'aka Rick Warren. Ikike niile banyere ihe ọbụla eji ihe mmụta ofufe a eme di n'aka Rick Warren. A natakwara ikike iji ihe mmụta ofufe a mee ihe.