Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Inweghachita Ọñụ GịIhe Atụ

Recovering Your Joy

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Añuri N'Agbanyeghị Ịhe Ọbụla

Gụọ Ndị Filipaị 4:6.

Ị nwere mkpa bụ isi maka inwe ọṅụ ná ndụ gị. Ndụ na-enweghị ọṅụ dị nrugide, dị nnukwu arọ, na mmegbu. Nnyocha e mere egosiwo n’ezie na ka ọṅụ anyị na-enwe ná ndụ anyị, ka anyị na-arụpụtakwu ihe. Agụrụ m otu akụkọ dị na “Akụkọ US na Akụkọ banyere Uwa” nke kwuru na ụlọ ọrụ na-ewe “ndị ndụmọdụ ọṅụ” ka ha wulite ọṅụ ná ndụ ndị mmadụ ka ndị ọrụ wee na-arụpụtakwu ihe. Ọ bụ ezie na ị na-enwekwu ume, na-emepụtakwu ihe, na-arụpụtakwu ihe mgbe ị nwere ọṅụ na ndụ gị.

N’akwụkwọ nke Ndị Filipaị dị mkpirikpi — dị nanị isi anọ n'ogologo — Pọl ji okwu ahụ bụ́ “ọṅụ” mee ihe ugboro iri na isii. Ihe dị ịtụnanya bụ, na Pọl edeghị akwụkwọ a mgbe ọ nọ ezumike na Caribbean. Ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Rom, na-eche ka e gbuo ya. N'ụbọchị ndị kasị njọ ná ndụ ya, ọ dere akwụkwọ kasị mwulite obi na Akwụkwọ Nsọ.

Na Ndị Filipaị, Pọl nyere anyị ihe ndị na-ewulite ọṅụ isii bụ́ ndị ga-enye aka ịgbasa nkụda mmụọ anyị na iwelite ịda mbà nke obi anyị. Iji mee ka ha dị mfe icheta, emewo m ha dika mkpụrụ edemede nke ihe ncheta — OBI ỤTỌ. Taa, anyị ga-eleba anya na ndi atọ nke mbụ.

J: Tụfucha ihe mwute niile banyere ndụ gị gara aga.
"Itụfu" pụtara "ịhapụ dị ka ihe na-abaghị uru, ịmafu, ikpochapụ, iwepụ." Pọl kwuru na ọ bụrụ na ị chọrọ ịnụ ụtọ ndụ, e nwere ihe ụfọdụ ị ga-ewepụ n’ihi na ha na-eme ka ike uwa gwụ gị ma na-anyịgbu ndụ gị. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu ka ị chefuo ihe ndi ina-ata onwe gị ụta maka ha, n'ihi na ọ bụ ihe Chineke na-eme — Ọ na-ahọrọ ịgbaghara mmehie gị ozugbo i kwupụtachara ha. Isi mmalite nke ọṅụ bụ ịhapụ ihe ndị gara aga. Ndị Filipaị 3:13 na-ekwu sị: “Otu ihe m na-eme bụ ichefu ihe dị n’azụ ma na-agbalisi ike m iru ihe dị n’ihu.” (GN).

O: Wepụ nchegbu niile maka ọdịnihu gị.
Ọ bụrụ na ị ga-anụ ụtọ nke ugbu a, ị ga-ahapụrịrị nchegbu niile gbasara ọdịnihu gị. Nchegbu, n'enweghị mgbagha ọbula, bụ ihe kacha nke ha niile egbu ọṅụ. Ị nweghị ike inwe ọṅụ ma dịkwa nchegbu n'otu oge. Ihe mgbochi Pọl nyere bụ amaokwu ndị a: “Echegbula onwe gị banyere ihe ọ bụla; kama, na-ekpe ekpere banyere ihe niile. Gwa Chineke ihe dị gị mkpa, ma-keleekwa Ya maka ihe niile Ọ meworo. ”(Ndị Filipaị 4:6 NLT). Ị nwere ike na-echegbu onwe gị ma ọ bụ ị nwere ike ikpe ekpere.

Y: Nyefee onwe gị maka nzube Chineke.
Ọ bụrụ na ị na-akwagharị, ọ bụrụ na ị maghị ebe i si bịa ma ọ bụ ebe ị na-aga ma ọ bụ ihe mere i ji nọrọ ebe a, n'ezie ị gaghị enwe ọṅụ ọ bụla na ndụ gị. Odi anyị niile mkpa inwe ihe karịrị anyi ka anyị ji wee biri. Nke ahụ bụ ihe na-enye anyị ọṅụ. Ibi ndụ maka onwe gị adịghị eweta ọṅụ.

Ọbụnadi mgbe ihe niile funahụrụ Pọl n’ezie, e nwere otu ihe a na-apụghị ịnapụ ya— bụ́ nzube ya ná ndụ. Pọl na-ekwu na Ndị Filipaị 1:21, “N’ihi na nye m, ịdị ndụ bụ Kraịst na ịnwụ anwụ bụ uru” (NIV).

Ọ bụrụ na ị chọrọ ibi ndụ nke jupụtara n’ọṅụ, i kwesịrị ibanye ná nzube Chineke maka ndụ gị. Mgbe ị malitere ibi ndụ maka ebumnuche e ji wee mee gị, ndụ ga-edo anya, ọṅụ adịkwa mfe ịchọta.
Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Recovering Your Joy

Ọ bụrụ na ịchọrọ ọñụ na ndụ gị, ị ga-achọta nguzozi n'usoro ihe omume gị. Ụkọchukwu Rick na-ekerịta otu ị ga-esi hazigharịa ntinye gị na mmepụta gị ka nye na nnara gị nyere gị aka nweghachita ọñụ gị, na-abụghị ka ọ funarị gị.

More

Ihe mmụta ofufe a nke e mere na 2014 sitere n'aka Rick Warren. Ikike niile banyere ihe ọbụla eji ihe mmụta ofufe a eme di n'aka Rick Warren. A natakwara ikike iji ihe mmụta ofufe a mee ihe.