Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nzọpukwu Ọbụla Bụ Nke MbiarụteIhe Atụ

Every Step an Arrival

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Ezi Ofufe

Eleghị anya nkebi ahịrịokwu ndị a na-adịghị ahụkebe n’abụ ọma a bụ “Wujuo ubi a kọrọ akọ, mee ka mmiri ozuzo jupụta n'ụnyi ubi dị ka ihe mgbụjisi ma mee ya nziza ka ọ toputa ma mia mkpụrụ” (Abụ Ọma 65:10, msg). Mmetụta nke ọbụ abụ bụ nke uba pụtara ìhè. Ọ hụru ka afọ na-ebili na ndụ ọhụrụ nke oge ihe otuto dị ka eze nwanyị ekpunyere ka okpu eze ihe icho nma nke Chineke, yi ihe otuto ọhụrụ nke ubi di ka uwe, ìgwè atụrụ gbasara n'ugwu na ndagwurugwu ana-ejere ya ozi. Ka anyị na-ege ọbụ abụ ka ọ na-ekwu okwu mara nma banyere ihe ebube ndị a, ọ gaghị abụ ihe ahụkebe ma ọbụrụ na anyị amalite ịchọ ka anyị nọro ebe ahụ.

Ọ bụ ezie na abụ ọma a ekwughị kpọmkwem ihe ọ bụla banyere ya, oge e dere ya jupụtara n’ịdọ aka ná ntị banyere nwoke ahụ ga-eji ihe ndi Chineke kere nọchie anya ụlọ ụka ma na-eme ofufe ya n’ebe ahụ kama n’ememe ụlọ nsọ ma ọ bụ ụlọ ụka. Mkpali ahụ ka a na-ahu ugbu a n'ime nwoke ahụ nke na-ekwu na ya nwere ike ife Chineke ofufe nke ọma n'ile anya na ọdịda anyanwụ mara mma karịa ikpe ekpere ndi di ochie n'ime ụlọ ụka n'enweghị ebe esi anara ikuku. Ọ nwere ike ife ofufe ka mma, ma ihe ọ nwere ike ipụta bụ na ọ naghị efe Chineke kama ọ bụ anyanwụ ka ọ na-efe ma ọ bụ, ma eleghị anya, mmetụta ya onwe ya banyere anyanwụ.

Ofufe Ndị Kraịst bụ nke ido oge na eluuwa nsọ. Nke ahụ anyị na-ele anya, biri n'ime ya, ejighịkwa ya kpọọ ihe na ndụ anyi n'ebi kwa ụbọchị ka etikọnyechara n'oge awa ofufe nke Ndị Kraịst ka anyị wee hụ ihe kasi ukwuu na ebighi ebi nke mpụta ya. Ofufe na-enye oge na eluuwa nke ụwa nkịtị nnukwu ụrụ. Ọ dịghị onye pụrụ, ma ọ bụ nke ga-achọ, ibi n'ụwa nke ofufe siri ike mgbe niile. Ma ofufe na-eme ka ihe niile Onye Kraịst na-eme dị nkọ.

Onye Kraịst na-apụ n'oge awa nke ofufe maara na ịhụnanya, olile anya, okwukwe, otuto, ngọzi na amara na-enye ndịiche dị ntakiri, na nkeji ole na ole, nke na-eme mgbanwe ebighi ebi na ndụ. Onye Kraịst na-efe ofufe dị ka onye na-eme mgbatị ahụ nke ikuku n'osisi mgbati ya. Ọ na-ahụ ihe oge na eluuwa pụtara. Mgbe ọ laghachiri na mbara igwe nkịtị ya, a ga-enwe ịdị nkọ na izi ezi nye mmetụta ya na omume ya ndị na-anọghị ebe ahụ na mbụ.

Olee mgbe ahụmahụ ofufe gbanwere otú i si enwe mmekorita gi na ndị ọzọ na Chineke ozugbo ọ gwụchara?

Ọ bụrụ na ị nwere mmasị na usoro ofufe ụbọchị ise a nke Eugene Peterson, mee gaa lelee akwụkwọ Eugene, Nzọmụkwụ Ọ Bụla Bụ Mbiaru .

Okwu Chukwu

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Every Step an Arrival

Anyị nwere olile anya na ihe ofufe ise ndị a sitere n’aka Eugene Peterson ga-ewega uche gị na obi gị ebe ọ bụla ha nwere ike iga, ebe ọ bụ na ị nweghị ike ima ihe Mmụọ Nsọ ga-eji agba ume ma ọ bụ ịma aka ma ọ bụ ikasi obi. Ị nwere ike ịhọrọ iji ajụjụ ndị na-atụgharị uche na njedebe nke ofufe ọ bụla iji mepụta ekpere nke gị maka ụbọchị ahụ—n'ezie ọ bụghị dị ka ebe njedebe kama dị ka mmalite maka ihe ndị bịara abịa na-eche gị.

More

Anyi ga-achọ ikele WaterBrook Multnomah maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, bikọ gaa na: https://waterbrookmultnomah.com/books/540871/every-step-an-arrival-by-eugene-h-peterson/