Nzọpukwu Ọbụla Bụ Nke MbiarụteIhe Atụ

Ụka Nke A Na-Ahụ N'Anya
Ka Sọlọmọn guzoro n’ihu ụlọ nsọ ọhụrụ ahụ, ọ jụrụ ajụjụ anyị niile na-aju n’otu oge ma ọ bụ mgbe ọzọ: “Ọ̀ ga-abụ n'ezie na Chineke ga-abanye n’ógbè anyị?” (1 Ndị Eze 8:27, msg).
Obi abụọ a wakporo Sọlọmọn, mana ọ gara n'ihu kpee ekpere. Ọ kpere ekpere ka Chineke nụ ndị mmadụ ma ha bịarute n’ụlọ a kpee ekpere, ka Chineke ña ntị ná mkpa ha abalị na ehihie, na mgbe Ọ nụrụ ha ka Ọ gbaghara.
Atughariala obi abụọ ndị ahụ site n’ụdị dị iche iche site n’aka Sọlọmọn gbadara anyị. Ma anyị, dị ka Sọlọmọn, agawọ n’ihu kpee ekpere. Mkpesa ezi uche dị na Chineke ibi n'ụwa n'ụlọ ekpere, rụọ na Chineke izute anyị n'ebe ana-efe ofufe, enwebeghị ike ịlanarị ihe akaebe nke ahụmahụ na okwukwe. A sị ka e kwuwe, ọgụgụ isi bụ otu n'ime ule ndị kasị nta idi ndabere nke ihe ndi a n'ahu n'ìhè. Ajụjụ nke ekweghi ekwe "Ọ nwere ike ịbụ?" ka a zara site n’uche di omimi karịa, ahụmahụ sara mbara, na okwukwe nke ìhè na-asị, “Ee, n’ezie!”
N’ekpere Solomọn n’ebe a anyi n'agu, anyị pụrụ ịhụ ebe atọ nke ihe ndị a na-ahụ anya bụ ihe mbufe ihe ndị a na-apụghị ịhụ anya, ha bụkwa ebe ndị anyị ka na-etinye aka na ha taa. Nke mbụ metụtara akụkọ ihe mere eme. Solomọn webatara n'ime ekpere ya ncheta nke nnukwu nzute Chineke n'umu Izrel nwere n'oge gara aga. Ncheta na-ezughi ezu bụ ihe mmebi nye ekpere anyị.
Nke abụọ metụtara mgbaghara. Ọtụtụ mgbe anyị na-ekpe ekpere anyị dị ka ụzọ anyị nwere ike isi mee ka Chineke donyere anyị ukwu. Mana ụka a na-ahụ anya bụ ihe megide nye nke ahụ. Mgbaghara bụ oge mgbanwe n’ekpere, mgbanwe site n'ịpụ n'ịchọ ụzọ nke onwe anyị n’aka Chineke wee nyefee Ya ndụ anyị ka Ọ wee mee uche Ya n’ime ndụ anyị.
Ebe nke atọ ka Solomọn kpọrọ aha n’okwu bụ́ onye ala ọzọ, nke a pụkwara ịsụgharị “onye si esi bia.” Mgbe mmasị anyị dị naanị na anyị onwe anyị, ezinụlọ anyị, na obere ndị enyi anyị nwere, anyị na-efunarị nghọta niile gbasara nnukwu ụka nke Kraịst na ụwa Kraịst na-achọ iwebata n'ime mmekọrịta Ya na ha.
E nwere ike iji okwu atọ chịkọta ihe mmụta atọ di n'ekpere Sọlọmọn: akụkọ ihe mere eme (Ọrụ Chineke n’oge gara aga), mgbaghara (ntụgharị site na onwe onye nye uche Chineke), na ndị ọzọ (ma ọ bụ ndị si esi bịa). Kpee ekpere n'ìhè nke okwu kasị na-agwa gị okwu n'ime onwe gị ugbu ugbu a.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anyị nwere olile anya na ihe ofufe ise ndị a sitere n’aka Eugene Peterson ga-ewega uche gị na obi gị ebe ọ bụla ha nwere ike iga, ebe ọ bụ na ị nweghị ike ima ihe Mmụọ Nsọ ga-eji agba ume ma ọ bụ ịma aka ma ọ bụ ikasi obi. Ị nwere ike ịhọrọ iji ajụjụ ndị na-atụgharị uche na njedebe nke ofufe ọ bụla iji mepụta ekpere nke gị maka ụbọchị ahụ—n'ezie ọ bụghị dị ka ebe njedebe kama dị ka mmalite maka ihe ndị bịara abịa na-eche gị.
More