Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nzọpukwu Ọbụla Bụ Nke MbiarụteIhe Atụ

Every Step an Arrival

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Nka Nke Mkpụrụ Obi

Mgbe ihe mere nke anyị n'enweghị ike ịkọwa, anyị na-ekwu na nke ahụ bụ ọrụ ebube. Elewe anya n'udi nkọwa ahụ, ọtụtụ ihe onye n'eme majiiki na-eme ga-abụụrụ m ọrụ ebube, amakwaara m nke ọma na ha abụghị. Ọrụ ebube, site na ọdịnala Akwụkwọ Nsọ, abụghị ihe anyị na-aghọtaghị kama ọ bụ ihe e meere anyị nke anyị n'enweghị ike ime n'onwe anyị. Ọrụ ebube bụ ihe na-arụ ọrụ. Ọ bụ ihe Chineke na-emere anyị ma ọ bụ ihe Chineke na-emere anyị site na ndị ọzọ na anyị nke anyị n'enweghị ike ime onwe anyị.

Ọ kwere omume na ị nwere ike ghọta ya, ma ọ bụrụgodị na i ghọtara ya, nke ahụ agaghị eme ka ọ kwụsị ịbụ ọrụ ebube. Okwu ahụ apụtaghị nke ahụ karịrị nghọta anyị kama ọ bụ nke ahụ karịrị ike anyị. Ya mere n'ụzọ ahụ enwere m ike, mgbe m na-apụ n'ụtụtụ ma hụ anyanwụ ka ọ na-abịa n'elu mbara igwe, mụ ekwụọ si, "Nke a bụ ọrụ ebube." Ihe m kwuru ga-abụkwa eziokwu dika akwụkwọ nsọ kwadoro. Ututu ọ bụla bụ ọrụ ebube.

Ya mere, kedu ka isi si ele anya gị ịhụ ọrụ ebube nke ụbọchị ọ bụla? Kedu ka ị ga-esi na-azụ onwe gị n'ime ọzụzụ ahụ nke nwere ike imezi ihe mgbawa nke ụwa ka ị nwee ike ịnụ ụda egwu mmụọ ozi na-abụ abụ ebube Chineke n'elu?

Ị nwere ike itinye uche gị, mmụrụ anya nke uche gị, ọchịchọ ịmata ihe gi na ọgụgụ isi gị. Ige ntị abụghị naanị ọrụ nke ihe ndi eji aku egwu nke anu ahu; ọ bụ nka ime mmụọ nke mkpụrụ obi.

Ekwela ka nwata nọ n'ụlọ anụ duhie gị. Ọ bụ nwata, ma Ọ si n’ezinụlọ Mozis onye amụma, Ọ na-agwakwa gị okwu taa. Ọ na-ekwu ihe e mere ka ọ chịa ndụ gị, iji duga gị n'ụzọ ndụ ọhụrụ, ihe nwere ike ịkpalite nzaghachi nke nwegasiri ihe ndị ebighi ebi na ya. Ọ na-ekwu na Chineke hụrụ gị n'anya, na Chineke nabatara gị, na ndụ gị nwere ihe ọ pụtara ruo mgbe ebighị ebi ma nwekwa akara aka.

Ana m anụ ka ị na-ekwu na ị nụla ihe ndi ahụ niile n'mbu? Mba, nke ahụ bụ okwu na-agbawasi, na-enye ndu, mara mma. Ozugbo ị nụrụ ya, ị nwekataghị nụ ihe ochie ọzọ. Ihe niile ga-adị ọhụrụ. Nke ahụ bụ ụdị ihe na-ada ụda ọhụrụ mgbe ọ bụla a nụrụ ya.

Gịnị bụ otu ihe ị ga-eme taa iji mee ka obi na uche gị kwekọọ n'ọrụ ebube nke ọnụnọ Chineke n'ime ndụ gị?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Every Step an Arrival

Anyị nwere olile anya na ihe ofufe ise ndị a sitere n’aka Eugene Peterson ga-ewega uche gị na obi gị ebe ọ bụla ha nwere ike iga, ebe ọ bụ na ị nweghị ike ima ihe Mmụọ Nsọ ga-eji agba ume ma ọ bụ ịma aka ma ọ bụ ikasi obi. Ị nwere ike ịhọrọ iji ajụjụ ndị na-atụgharị uche na njedebe nke ofufe ọ bụla iji mepụta ekpere nke gị maka ụbọchị ahụ—n'ezie ọ bụghị dị ka ebe njedebe kama dị ka mmalite maka ihe ndị bịara abịa na-eche gị.

More

Anyi ga-achọ ikele WaterBrook Multnomah maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, bikọ gaa na: https://waterbrookmultnomah.com/books/540871/every-step-an-arrival-by-eugene-h-peterson/