Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nzọpukwu Ọbụla Bụ Nke MbiarụteIhe Atụ

Every Step an Arrival

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Ịnabata Ihe Chineke Na-Eme Ri

Ọtụtụ oge n’akụkọ di n'ime Akwụkwọ Nsọ, anyị na-amụtakwu gbasara onwe anyị n’ịgụ ha karịa ka anyị na-amụta n’akụkọ mgbe ochie. Okwu nke ajụjụ Gidiọn n’amaokwu a na-amali ngwa ngwa ruo egbugbere ọnụ anyị: “Ọ bụrụ na Onye-nwe-anyị nọnyeere anyị, gịnịzi mere ihe a niile ji dakwasị anyị?” (amaokwu nke iri na atọ, rsv).

Chineke dị ka Ọ dị ezigbo anya mgbe ndụ anyị jupụtara na ọnwụ, nhụjuanya, ike ọgwụgwụ, ọrụ ndi n'amasighi anyị, ndị anyị na-aghọtaghị, ọnọdụ anyị na-apụghị ịgbanwe. Anyị na-ege ntị maka azịza nke ajụjụ Gidiọn n'olile anya na anyị nwere ike ịnụ azịza maka nke anyị. Ma dị ka ọ na-emekarị na nhụta dị n'etiti Chineke na ndị mmadụ n'ime Akwụkwọ Nsọ, enweghị azịza ọ bụla, ọ bụghị ihe anyị na-ekewakari dị ka azịza. Kama, e nwere iwu: “Napụta Izrel n’aka Midian” (amaokwu nke iri anọ, msg).

Azịza Gidiọn dị nnọọ ka otu nke anyị ga-adi: “Lee m anya. Ezinụlọ m bụ ndị kasị na-adịghị ike na Manase, abụkwa m onye kasị na-adịghị ike na ezinụlọ m niile” (amaokwu iri na ise, msg). Mana Chineke gọsiri Gidiọn na a gakwaghị enwe nleba anya ọzọ banyere ọdịda ndị gara aga, a gaghị enwe nyochasi banyere ụzọ nke akara aka, a gaghịkwa enwe nyocha nke onwe. Mwalite dị n’aka Chineke, dị ka ọ dịla n’oge Ijipt. Naanị ihe Gidiọn ga-eme bụ irube isi ma kwụsii ike na nkwa ahụ. Naanị ihe ọ ga-eme bụ ije ozi, Chineke ga-eweta mmeri.

Ugbu a, ị nwere ike ileghachi anya azụ n'oge ndụ gị, nyochaa akụkọ ihe mere eme nke ezinụlọ gi, leba anya n'omenala obodo, ma hụ ihe na-eme mgbe mmadụ jụrụ irubere Chineke isi ma jụ ịhụnanya Ya. Nnupụ isi dị mfe ịchọpụta. Otu n'ime ihe ndi mgbaàmà a na-enwekarị bụ idị umengwụ n'ime ezi omume, akọ na uche n'ezughị oke nke na-egbochi nri gị inọba n'ahu gi ofuma, ibu obi amamikpe na-eme ka ike gwụ gị osiiso, na ịda mbà n'obi di nnukwu ala nke na-eme ka ị ghara inwe ike ime ihe ndi okike.

Maka gi onye na-amata ihe mgbaàmà ndị dị otú ahụ n'ime onwe gị, enwere m ozi ọma: Chineke hụrụ gị n'anya, Ọ dịkwa njikere ịgbaghara mmehie gị ma kee ndụ ebighị ebi ọhụrụ n'ime gị. Chineke dị njikere, n'oge a, ịkagbu ihe gara aga, ihichapụ ndekọ, igba ndeju ndi ahu niile edebere maka gị ọkụ. Ọ dịghị ihe i mewọrọ ma ọ bụ ihe ị pụrụ iche n'echiche na-egbọchi gị ịnakwere ihe Ọ na-emere gị ọbụna ugbu a.

Olee mgbe echiche nke adịghị ike nke gị ma ọ bụ ịmara nke ọdịda gara aga ga-eme ka ị ghara ịso ndụzi Chineke?

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Every Step an Arrival

Anyị nwere olile anya na ihe ofufe ise ndị a sitere n’aka Eugene Peterson ga-ewega uche gị na obi gị ebe ọ bụla ha nwere ike iga, ebe ọ bụ na ị nweghị ike ima ihe Mmụọ Nsọ ga-eji agba ume ma ọ bụ ịma aka ma ọ bụ ikasi obi. Ị nwere ike ịhọrọ iji ajụjụ ndị na-atụgharị uche na njedebe nke ofufe ọ bụla iji mepụta ekpere nke gị maka ụbọchị ahụ—n'ezie ọ bụghị dị ka ebe njedebe kama dị ka mmalite maka ihe ndị bịara abịa na-eche gị.

More

Anyi ga-achọ ikele WaterBrook Multnomah maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, bikọ gaa na: https://waterbrookmultnomah.com/books/540871/every-step-an-arrival-by-eugene-h-peterson/