Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịmata Olu Chineke // Mụta Otú Ị Ga-esi Zute YaIhe Atụ

Recognizing God's Voice // Learn to Encounter Him

ỤBỌCHỊ 4 NKE 4

Otú E Si Adị Atụghị Egwù (N'etiti Ihe Mgbu Gị)

Mmụọ Nsọ n'ime anyị, nke a bụ ihe anyị nụrụ maka Gị:

Ama M na ihe ekwuru siri ike inu. Ama m na obi fụrụ gị ezigbo ufu mgbe ị nụrụ ya. Ọ bụ M mere ka obi gị dị nrọ̀ otu ahụ. Ọ bụrụ na ọ na-ewute gi, mgbe okwu ọjọọ ahụ bịara, nke ahụ abụghị ihe n'adịghị mma. Ọ na-egosi na obi gị abụghị nke siri ike ka okwute; ọ na-egosi na ị kwela M ka M bata; ọ na-egosi na ị kwela M ka M nọrọ.

Kwe M ka M nọrọ.

Mana gịnị ka a ga-eme gbasara ihe mwute ahụ? Gịnị ka a ga-eme mgbe ọnọdụ ihe mgbu ahụ dị otú ọ dị agbanweghị agbanwe, ugboro ugboro? Kedụ ihe a ga-eme mgbe ọ dị ka ọ dịghị ihe na-adị mma, mgbe ọ dị gị ka ebe ịnọ ọ dị ntachi ma ị maghị mgbe ọnọdụ gị ga-adị mma n'ezie? "Gịnị ka m ga-eme ugbu a?" ka ị na-ekwu. "Kedụ ka m ga-esi gaa n'ihu?" ka ị na-arịọ.

Ama m na iwe na ọnụma jụrụ̀ gị obi. Ị chọrọ ka e mezie ọnọdụ mgbu ahụ—ọ dịkwa mma na ịbịakwutere M, ịrịọ M maka enyemaka. Ma gee Mụ ntị ugbu a, ezigbo nwa M. Mgbe ihe mgbu ahụ na-abịa, ọ dị mkpa ka ị ka jigidesie M ike. Cheta na ọ dịghị gị mkpa ịga n'ihu, ịbanye n'ókèala ị n'amaghi ama, ebe ị na-amatabeghị ụzọ ị ga-eche ihu ime ntụgharị.

Tụgharịa. Tụgharịa, ezigbo nwa M. Anọ M ebe a.

Tụgharịa. Tụgharịa, ezigbo nwa M. Anọ M ebe a.

Ahụrụ M gị n'anya, ka M gwa gị. Ọ bụkwa ịhụnanya ahụ ga-enyere gị aka ilekwasịgide M anya. O nwere ike ị gaghị enweta ngwọta dị mfe ebe a—ọ́ siri ike iche otu a ọ bụghị ya? Enwere ike agaghị enwe mgbanwe dị ọsọ ọsọ n'ọnọdụ ihe mgbu a . . . ma nke ahụ nwere ike ịpụta ihe dị mma.

Ihe dị otu aị hụrụ ya ka ihe dị mma?

Ọ dị M nwute na e mejọrọ gị. Mana Ọ bụ M na-elekọta obi gị. Ka M lekọta obi gị. Nyefee M ihe mgbu a. Echegbuzila onwe gị maka ihe ị ga-eme banyere ọnọdụ dị n'etiti gị na onye a n'eme gị ihe mgbu ma buru ụzọ lekwasị anya gị n'ebe M nọ n'ogè esemokwu ahụ ga-eme ọzọ. Mee ihe omume nke ịchọ M mgbe ị na-agwa ha okwu ọzọ. Mee ya kà ị n'ekwusara ha okwu, ọ bụghị mgbe oge ahụ gasịrị. Mee omume nke ịge M ntị mgbe ị na-eche maka ihe ị ga-ekwu. Mee ya n'oge a bịara ikpasu gị iwe ọzọ. A nọnyeere M gị, Mụ onwe M bụ Mmụọ Nsọ bi n'ime gị.

Ahụrụ M gị n'anya, ezigbo nwa M egwù n'adịghị atụ.

Ihe Aga Eme-Eme:

Kedụ ka anyị ga-esi na-aga n'ihu? Mgbe anyị n'agabiga ihe mgbu? Mgbe esemokwu karịrị̀ ihe eche n'ọbụ . . . Mgbe mmadụ mere anyị ihe fụrụ anyị ụfụ . . . Mgbe anyị kwuru ihe dị njọ n'esighị anyị n'obi. . . ma ọ bụ na ihe ọjọọ ndị ahụ anyị kwuru si n'obi anyị pụta n'ezie, mana obi anyị tara anyị ezigbo ụta ka anyị kwụchara ya . . . Mgbe anyị n'enwe nnukwu obi mgbu n'ihi okwu ọjọọ gasị anyị gwara onwe anyị . . . Mgbe ọ n'ara anyị ezigbo ahụ ime mgbaghara . . . ịgbaghara onwe anyị ma ọ bụ onye ọzọ.

Kedụ ka anyị ga-esi mara ihe ọzọ anyị ga-eme . . . ihe anyị ga-ekwu?

Kedụ ka anyị ga-esi nọrọ ná mmekọrịta—ma chọta mmasị na obi ike ịhụ n'anya—mgbe iwe na ọnụma jụrụ̀ anyị obi . . . ike gwụrụ anyị n'ezie . . . egwù ana atụ anyị banyere ihe nwere ike ịbịa?

Ihe ndị a bụ ezigbo ajụjụ . . . ajụjụ ndị dị mkpa. Mana ajụjụ ká dị mkpa bụ: Kedụ ka anyị ga-esi mee ka obi anyị ghara isi ike ka nkume? N'ihi na ọ dị mfe n'ezie ịbanye n'ọnọdụ ịzoghara onwe anyị, ịdị nchịkwa gbasara ihe ndụ anyị na ichebe onwe anyị, imechi obi anyị ka ihe ghara iwute anyị ọzọ, imechi obi anyị n'ebe Chineke nọ.

Mana, ugbu a, bụ oge kpọmkwem Chineke kacha dị anyị mkpa.

Ka anyị tụgharịa chee Chineke ihu, ugbu a. Anyị niile n'otu, ka anyị tụkwasị ịdị mma Ya obi, ike Ya, idi ike Ya ime ihe, njikere Ya itinye aka n'ihe ọbụla gbasara ndụ anyị. Ka anyị meghee obi anyị ma rịọ Ya ka O chebe ha, kama anyị ịgbalị ime ya n'onwe anyị. Ka anyị nyekwa Ya ọnọdụ ihe mgbu a. Nyefee Ya ha dum kpam kpam—ihe mgbu niile, iwe na ọnụma nile; ọgbaghara niile, ihe niile ahụ n'afu ụfụ n'obi.

Nyefee Ya ha dum. Ma chere. Chere nzaghachi Ya. Lee ma gee ntị maka ihe Jizọs na-eme. N'ihi na nzaghachi Ya bụ ihe anyị na-eché. Ọ bụ ihe dị anyị mkpa ugbu a.

Jizọs, ahụrụ m Gị n’anya. Atụkwasara m Gị obi. Ịdị ike karịa ime ihe banyere ihe mgbu m a. Ị bụ onye obiọma. Ị bụ Onye oké amamihe, Ị dị mma n'ezie. Ị hụrụ m n'anya. Ị ma m karịa ka m maara onwe m. Ị chọrọ ka m nwee ihe kachasị dị mma nye m. Ya mere, m jiri tụkwasị Gị obi. Enwere m ntụkwasị obi na ngwọta Gị gasị nye ọnọdụ m na ihe mgbu m. Atụkwasara m Ụzọ Gị obi. Ana m ege ntị maka ya ugbu a. Ya mere, nyere m aka ịhụ Gị, nyere m aka ịhụ Ụzọ Gị, ma nyere m aka ime ka obi m dị oghe nye Gị. . .

Nweta ahụmịhe nke Rush Pọdkastị—wee zute Mmụọ Nsọ na ndụ ọgbara ọhụrụ ị n'ebị ụbọchị taa.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Recognizing God's Voice // Learn to Encounter Him

Olu Chineke nwere ike ịbịa dị ka ntakwunye okwu dị nro ma ọ bụ nnukwu oke ifufe. Isi ihe bụ ịmata ya, otu ọ bụla o siri bịa—na ịtụkwasị obi na Chineke dị mma, na Ọ dị ike karịa ihe ọ bụla n'esogbu anyị. Malite atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị anọ wee bido ịmụta ka ị ga-esi zute Chineke, olu Ya, ọnụnọ Ya —wee sonyere ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwaanyị na-enwe ahụmịhe Rush | Mmụọ Nsọ n'ime Ndụ Ọgbara Ọhụrụ.

More

Anyị ga-achọ ikele Gather Ministries (Loop/Wire) maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://rushpodcast.com