Ịmata Olu Chineke // Mụta Otú Ị Ga-esi Zute YaIhe Atụ
Otú Ikuku Si Ejeghari (Ma N'eweta Udo)
Mmụọ Nsọ n'ime anyị, nke a bụ ihe anyị nụrụ maka gị:
Ị nụwó olu M ogologo oge. Ị matawó M tupu ị mara na ọ bụ M. Ọ bụ olu nkasi obi mgbe ụjọ nọ n'atụ gị, olu mmesi obi ike mgbe ị nọ n'echegbu onwe gị. Ọ bụ mmanụ ọgwụgwọ maka ọnya, okwu ndị n'aputaghị ka ha bụ okwu—olu ọnụnọ, olu nke so bụrụ akụkụ nke ndụ gị. Kedụ ka ị ga-esi ghara imegharị ahụ ka ikuku n'ekusa n'ihu gị mgbe ọ na-efeghari? Kedụ ka ị ga-esi ị ghaghị ịnwe mmetụta ọbụla ka ịhụnanya n'ekusa ume ya n'ahụ gị?
Abụ M olu ndị n'enweghị ike ikwu okwu, olu ndị na-abụ̀ abụ. Abụ M olu nke udo na olu nke oké ifufe. O bụ M na-ebuli ndị ike gwụrụ elu elu, na-akwadokwa ndị na-aga n'ihu, n'eje ije, n'ahụ ihu M. Ha n'edebe aka ha mmeghe ka ha na-aga. Ha dị ike ịrịgo, na dị nguzosi ike ka ha rigochara.
N'ihi na ndụ nke a abụghị ndụ nke na-eweta mbibi nye obi gị. Mba, nke ahụ agaghị ekwe omume. Ihe na-eweta ihe mgbu, anya mmiri, mbibi, bụ mgbe ọchịchịrị n'efekasi ihe ọjọọ ma udo akaghị bịa. Ọ bụ Nwa M n'eweta udo. Ikuku na-ekpuchi ala dum. N'ihi na ọ na-ewe ihe karịrị obi ike, ihe karịrị ntụkwasị obi, ihe karịrị ịrụsi ọrụ ike iji weta udo. Ikuku—ihe ị n'enwe mmetụta ya ma n'agbaso, bù ihe ndị na-eme ka udo dị. Nwa M nwoke, nwa M nwanyị, ị ma M. Ị nwere ike iweta udo—nye onwe gị, nye ndị ọzọ, nye ụwa gị—n'ihi na ị nwere ike ịmeghachi omume nye ihe dị eziokwu karịa ihe ọ bụla iji anya gị abụọ hụ.
Ị nweela mmetụta ikuku. Ị nweela mmetụta mmụọ M ka Ọ n'eku ume n'ime gị. Ị geela ntị ịnụ Ya, n'ihi na ị ma na Ọ bụ Ya bụ Onye-Inyeaka, na Onye-Nduzi n’ihe niile. Achọrọ M inyere gị aka ịmatakwu M ugbu a. Achọrọ M ime ka ọchịchọ gị maka M bawanye karịa. Mana a hapụrụ M mkpebi nke a n'aka gị. M na-ahapụ gị ka ị tụlee ma ị chọrọ ịgakwu ime n'ịhụnanya gị n'ebe M nọ. N'ihi na ikuku na-ejegharị, ma ọ dịghị ahapụ gị. Ikuku na-ebuli gị elu ma buru gị, ọ bụrụ na ị kwe ka ọ mee otu a.
Ya mere e nwere ọrụ dịnụ ị ga-arụ. Enwere nhọrọ dịnụ nke ịga n'ihu, ịgabà n'ebe miri emi ebe M nwere ike igosikwu gị onye M bụ. Anyị abụọ ga-anọkọ ọnụ n'ejeko ije, ị n'ahụ ya? Ị nọ ebe a ugbu a, Mụ na gị nọ, mkpụrụ obi gị bụrụ nke dị ndụ n'ime mmụọ M bi n'ime gị. Ma gị a n'eto eto, na-abawanye n'ịhụnanya na ntụkwasị obi na ndabere na M. Nhọrọ ọ bụla ị mere ịnụ M. Nhọrọ ọ bụla ị mere iji rute M. Nyefe ọ bụla ị mere ejigideghi ihe ọzọ ọbụla aka na jiri obi meghere emeghe ma gị aka n'aga n'Ihu, ee n'ejewanye ije. Ị na-arịgo na-eje ije na-eme nyefe ma na-enwe mmetụta nke ikuku ka ọ n'ekusa n'ihu gị na ka ọ n'agwa gị okwu nwayọ nwayọọ n'ime mkpụrụ obi gị.
Ị ma M. Ị maara M. Achọrọ M ka ị matakwuo M.
Ihe Aga Eme-Eme:
Ọ bụ ihe nnukwu mmasị nye anyị inweta udo ọ bụrụgodị nke ntakịrị. Ọ bụghị ya?
Udo dị ka ọ dị ụkọ n'ụbọchị ugbu a, n'ime ndụ n'enweghị ezumike anyị n'ebị ugbu a, nye ụwa anyị bi n'ime ya n'eme ihe ọsọ ọsọ.
Ma nke a bụ ihe ekwesịrị ịma gbasara udo . . . anyị enweghị ike ịchọta ma nweta ya n'onwe anyị. Anyị enweghị ike ịrụ ọrụ gbasara ma nweta udo n'onwe anyị. Mbọ nke onwe anyị apụghị inye anyị udo nke anyị chọrọ. Ọ gaghị enye anyị ezi udo. . . n’ime obi anyị. A dịghị esi otu ahụ enweta udo, n'agbanyeghị ihe ọbụla edere n'akwụkwọ enyemaka onwe-onye.
Ya mere, ka anyị bụrụ ndị n'adịghị eme ihe ndị ụwa na-agbaso kama ka anyị were ụzọ dị iche.
Ka anyị . . . kama ịchọ udo n'onwe ya . . .chọọ ịmatakwu Chineke. Ka anyị mụta ịnatakwụ ihe nke Chineke, ka udo Ya wee bụrụ nnọọ udo anyị. . . n'etiti oke ịrụ ọrụ anyị.
Ka anyị lekwasị anya na mmetụta na ịmata Mmụọ Nsọ ka Ọ na-emeghari n’ime anyị ụbọchị taa, Ya bụ́ ume nke Chineke n’ime anyị.
Ya mere, anyị nwere nhọrọ anyị pụrụ ime. Ị nwere nhọrọ ị ga-emenwu.
Ịga n'ihu. Ma ọ bụ ịnọrọ ebe ị nọ. Ịgakwu n'ime. Ma ọ bụ gị ká nọrọ ebe ị n'enweghị nsogbu ọbụla.
Ma ọ bụ gị mee nhọrọ ịgbalịsi ike ịnọgide na-achịkwa ihe niile nke ndụ gị ka ị ghara inwe mgbanwe ọbụla.
N'oge ọ bụla, ọ bụ naanị gị n'eme yabụ nhọrọ . . . ịdị nọnyere Ya ka Ọ ji gị mee ihe ga-abara gị uru, ime ihe ọbụla obi gị si gị mee, ma ọ bụ gị nọrọ emeghị ihe ọbụla.
Nọrọ jụụ nkeji ole na ole, ma tụgharịa obi gị na uche gị nye Chineke. Otu O ga-esi gwa gị okwu ugbu a nwere ike ọ gaghị abụ ihe ị tụrụ anya na ọ ga-abụ . . . E kwuwerị, O jupụtara na ihe ịtụnanya, ma nke a, dị ka mgbe niile, bụ mmalite ije omimi gị na Ya. . .
“Ikuku ga-ebuli gị elu ma burú gị, ọ bụrụ na gị kwe ya ka ọ mee otu a.”
Eze Jizọs, bịa . . .
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Olu Chineke nwere ike ịbịa dị ka ntakwunye okwu dị nro ma ọ bụ nnukwu oke ifufe. Isi ihe bụ ịmata ya, otu ọ bụla o siri bịa—na ịtụkwasị obi na Chineke dị mma, na Ọ dị ike karịa ihe ọ bụla n'esogbu anyị. Malite atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị anọ wee bido ịmụta ka ị ga-esi zute Chineke, olu Ya, ọnụnọ Ya —wee sonyere ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwaanyị na-enwe ahụmịhe Rush | Mmụọ Nsọ n'ime Ndụ Ọgbara Ọhụrụ.
More