Ịmata Olu Chineke // Mụta Otú Ị Ga-esi Zute YaIhe Atụ
Ihe Ndị Siri Ike
Mmụọ Nsọ dị n'ime anyị, nke a bụ ihe anyị nụrụ maka gị:
O nwere ike ịbụ otu n'ime ụbọchị mgbe ọ dị ka nsogbu ndụ gị ọ karịrị akari. Ee, ama M. Ị chọrọ enyemaka ịtụgharị ya? Ị chọrọ ichili aka gị elu, obi gị, na nyefe ike ọgwụgwụ, kwụsị ihe dum niile ị n'eme ma si M na ị nweghị ike ịga n'ihu ọzọ, n'ụzọ dị otu a? Ee, ama M. Ekwenyekwara M n'ihe ị kwụrụ, ị pụghị iga n'ihu n'ọnọdụ gị a. Ị pughị ịga n'ihu otu a ị dị. Ị pụghị ịga n'ihu ma ọ bụrụ na M esoghị gị. Ọ bụghị n'ike olileanya—ma ọ bụ site na nnwere onwe—así ka e kwụwe. Ma ama M na ọ bụ ya mere i ji nọrọ ebe a, ọ bụ ya kpatara iji n'eme ndabere, na-ege ntị ugbu a. Ike agwụla gị ime ihe n'onwe gị. Ike agwụla gị ịna agbalị ịgbanwe ihe. Ike agwụla gị, gburugburu, ma gị ana-eche ma mbọ niile ị n'agba ha nwerè ihe oma ha n'amụpụta.
Ezigbo nwa M, cheta, A bụ M Chineke dị mma. A bụ M Chineke dị mma.
Ị nwere ike ịtụkwasị M obi. Aga M egosi gị ụzọ dị iche iji lelee ọnọdụ gị. Anaghị M ekwu maka isí na ihe adịghị otu a hụrụ anya, n'eme ka ọnọdụ gị ọ dị nma mgbe nke ahụ abụghị eziokwu. Ihe ọjọọ dị n’ụwa a. E nwere ihe ọjọọ, onye iro nke na-egbochi ma na-adọpụ uche ma n'adọpụ gị n'ihe bụ ezi ihe. Eziokwu bụ na ee, obibi ndụ siri ike. O siri ike.
Mana A bụ M Chineke dị mma. A bụ M Chineke dị mma. A bụ M Chineke dị mma.
Nwa M nwanyi, nwa M nwoke, n'etiti ihe ojoo a, ị nwere ike ịchọta M? Ọnọdụ ndị chere gị ihu nwere ike ha agaghị agbanwe dị mma, mana otu ị si ele ha anya ga-agbanwe. Obi mgbawa gị nwere ike ịdị ka ọ ga-egwepịa gị, mana nke ahu agaghị eme. Ihe mgbu gị nwere ike ịdị gị ka ọ ga-adị arọ karịa ka ị nwere ike ibu, mana ọ gaghị adị otu ahụ. Ejigidesiri M gị ike. N'ezie. Ka ị n'agụ nke a. Aka M dị gị n'ahụ.
Ya mere gịnị ka a ga-eme gbasara ihe a siri ike? Gịnị ka a ga-eme mgbe ọ dị ka yabụ nsogbu o burù oke ibu, dị ka agaghị achịkwanwu ihe ga-esi na ya pụta, ma njedebe nke ihe nsogbu nke yabụ ụbọchị dị njọ abụghị nke ị n'ahụ? Gịnị ka ị ga-eme banyere ihe nke a dị otu a? Nke mbụ, kwe M ka M makụọ gị. Nke mbụ, kwe M ka M gwa gị na anọ M ebe a. Nke mbụ, kwe M ka M gwa gị na ahụrụ M gị n'anya na ịhụnanya M nwere n'ebe ị nọ bụ ike n'akwado gị ka ị guzosie ike.
Ị nwere ike ịga n’ihu, nwa M obi sịrị ike. Ị nwere ike ịnọgide na-atụkwasị M obi, ebe ị maara na nsogbu a, ihe mgbu a, ihe a siri ike enweghị ihe ọ bụ n'ebe M nọ. Enwere ụzọ dịnụ aga-esi gafee nsogbu a niile. Jide aka M. Aga M ejidesikwa aka gị ike. Anyị abụọ ga-agafeta ọkụ a ọnụ. A ga m echekwa obi gị, ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka M meere gị otu ahụ. A ga M emekwa ka ị nọrọ nso, ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka ike M kwado gị. Ọ bụ gị bụ onye M na-echebe n'aghapụghị aghapụ. Ọ bụ gị bụ onye M n'achọghị ka ọ si n'ihu M pụọ, onye M na-achụso dị ka onye M hụrụ n'anya na onye dị M mmasị. Ị bụ onye nwere ike ime ihe karịrị nrọ ọ bụla ọ rọrọ n'ihi na ọ bụ M rọrọ nrọ ahụ niile. Ọ bụ M ka ọ dịịrị ime ka nrọ M ndị ahụ niile—nrọ ndị ahụ M rọrọ banyere gị—bịa na mmezu.
Ihe Aga Eme-Eme:
Kedụ otu ị ga-esi jeruo ebe ahụ, ebe obi gị kwere na Chineke, bụ Ezigbo Nna gị—nọ ebe a, ka ị n'agụ ihe a—Chineke bụ Onye ị nwere ike ịtụkwasị obi, n'agbanyeghị ihe ọ bụla?
Kedụ ka ị ga-esi jeruo ebe ahụ, ebe obi gị kwere na Jizọs nọnyeere gị n'ime ọkụ?
Kedụ ka ị ga-esi ịmalite ịhụ na Ọ nọnyeere gị, aka Ya bụrụ nke tụkwasịrị n’ubu gị, ma Ya anọgidesie ike n'akụkụ gị, apụghị apụ?
Wepụta oge ole na ole ọzọ chee banyere ebe Jizọs nọ. Gbalịa ịhụ Ya n'ezie. Nwee mmetụta ọnụnọ Ya n'etiti nhụjuanya gị. Chee gbasara ihe Ọ n'eme n'etiti ihe ị na-agabiga. Chee banyere otu Ọ ga-esi buso ihe mgbochi niile gị na ọkụ niile n'enye gị nsogbu agha.
Kwe ka Ọ nye gị foto ọhụrụ, foto otu Ọ si nọnyere gị--n'oge ọ bụla.
Kwe ka Ọ nye gị foto otu Ọ si bụrụ nchekwa gị . . . Ka Ọ si dị mma . . . Na otu ihe nke a ị n'agaịga a bụghị ibu dị ukwu nye gị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Olu Chineke nwere ike ịbịa dị ka ntakwunye okwu dị nro ma ọ bụ nnukwu oke ifufe. Isi ihe bụ ịmata ya, otu ọ bụla o siri bịa—na ịtụkwasị obi na Chineke dị mma, na Ọ dị ike karịa ihe ọ bụla n'esogbu anyị. Malite atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị anọ wee bido ịmụta ka ị ga-esi zute Chineke, olu Ya, ọnụnọ Ya —wee sonyere ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwaanyị na-enwe ahụmịhe Rush | Mmụọ Nsọ n'ime Ndụ Ọgbara Ọhụrụ.
More