Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịmata Olu Chineke // Mụta Otú Ị Ga-esi Zute YaIhe Atụ

Recognizing God's Voice // Learn to Encounter Him

ỤBỌCHỊ 3 NKE 4

Iche Echiche Ime Na Igakwú N'ime

Mmụọ Nsọ n'ime anyị, nke a bụ ihe anyị nụrụ maka gị:

O nwere ike ọ gaghị adị nwaayọọ, otu M si abịakwute gị. O nwere ike ọ gaghị adị nro—ọ gaghịkwa adị otú ị sịrị tụọ anya ịhụ. N'ihi na enwere M ọtụtụ ihe banyere M, M chọrọ igosi gị, ka M gwa gị. Enwere ebe dịnụ, dị omimi nke ukwuu, M chọrọ iburu gị gaa. E nwere ihe gasị M chọrọ ikpughere gị—mana ọ bụghị anya gị ga-ahụ ihe ndị a M chọrọ ka ị hụ. N'ihi na ebe a bụ ebe M ga-eji echiche gị rụọ ọrụ, ọ bụrụ na gị ekwe M.

Nke mbụ, cheta na ọ bụghị n'ime ìhè ka M bu ụzọ kee gị. Ya mere chee maka ọchịchịrị. Ka ị mechara nke a, gị e chee maka ìhè . . . Ị dị adị tupu Mụ akpụọ gị n'anụ ahụ. Ma ihe M chọrọ igosi gị dị adị, ọbụna ugbu a—na mgbe nile—n’agbanyeghị na ọdịdị ya adịghị n’ụwa a ana ahụ anya. Ihe ana ahụ anya, ka M gwa gị, n'abụ ihe dị irè nye gị site na mmekọrịta gị na ya nwere n'ime uche gị, n'obi gị. Ị nwere ike ịhụ, n'esite n'imi, n'enwe mmetụta ma n'enwe ahụmahụ, n'uche gị, ihe M nyere gị ka Mụ na gị nwekọrịta mmekọrịta na ya. Ma ihe ị na-ahụ, ihe Mụ na gị n'enwekọrita mmekọrịta na ya, ga-ekpughekwuru gị onye M bụ.

Ee, ị nwere ike ịgụ gbasara M. Ee, ị nwere ike inụ olu M n’ime obi gị. Ee, ị nwere ike ikpe ekpere ma soro ma mee nzaghachi site na amamihe M na-enye gị, mana ị chọrọ karịa ihe ndị a? Ị chọrọ ịhụ ihe ị na-echetubeghị n'echiche gị? Ị chọrọ ka M wunye onwe M n'ime uche gị ka i wee nweeahụmahụ ihe ị na-echetụbeghị mbụ? Ị chọrọ ka M nyeregị aka iche ụdị echiche a?

Mechie anya gị, nwa M hụrụ n'anya. Ka M mee gị ka ị daa jụụ. Anyị agabá . . . n'ime ebe dị nnukwu omimi ugbu a. Ka M dubakwuo gị n'ime ebe dị omimi. Ngwa, lee aka M. Ị n'enwe mmetụta ya? A na M enyere gị aka ịnwe mmetụta ya. Hụ ya ugbu a, ejila anya gị. Jiri obi gị hụ ụzọ. Were uche gị hụ ụzọ. Ihe iji n'aka na ị maara ekwesịghịkwa ịdị gị ka ọ bara uru ọzọ. Abụ M mpaghara ụzọ echiche ọhụrụ. Ka M gbawapu, tiwapu n'ụzọ sara mbara, ihe ị kwenyere na ya gbasara M, onye ị ghọtara na M bụ.

Ị kwenyere na abụ M Chi dị mma? Ka M gosi gị otú M si dị mma. Ị kwenyere na abụ M Chi dị ike? Ka M gosi gị nwa ntakịrị ihe M nwere ike ime. Ị kwenyere na M nọnyeere gị, na ọ bụ M na-eweta ọgwụgwọ, na ọ bụ M jigidere kpakpando na ọnwa na mbara-igwe dịnụ karịa ka ị nwere ike ịgụ--na M jigidesiri ha dum n'ọbụ aka M? Achọrọ M ịkpọrọ gị gaa njem mara mma, naanị Mụ na gị. Ma ọ dị mkpa ka ị tụkwasị M obi—ma wusa nkwutọ na obi abụọ ọ bụla n'ala nwa oge. Mechie anya gị . . . Ma ọ bụ gị hapụ ịme nke a . . . A dị M ike ịrụ ọrụ ma anya gị ọ mepere emepe ma ọ kpuchiri ekpuchi . . . Ka anyị gawa.

Ihe Aga Eme-Eme:

Gị, enyi m, ka a na-akpọ òkù ịga njem mara mma, ugbu a.

Ajụọla gị ajụjụ ụfọdụ:

Ị chọrọ ka Mmụọ Nsọ wunye onwe Ya n’ime uche gị ka ị wee nwee ụdị ahụmahụ ị na-echetụbeghị n'echiche n'mbụ? Ị chọrọ ka O nyere gị aka iche n'echiche ihe anya gị a ka pụghị ịhụ?

Iji mee nke a, ị ga-adị njikere imeghe uche gị na obi gị. Ị ga-adị njikere ịdị mmeghe ịhụ na ịnụ ihe na ịnwe ahụmahụ ihe ị na-enwetụbeghị ahụmahụ ya mbụ . . . Ị dị njikere ikwe ka Mmụọ Nsọ meghee uche gị ka ịnwe ahụmahụ ihe karịa ka ị n'enwe ugbu a . . . ihunanya, ihe ịtụnanya, ịma mma, ọṅụ, na udo, karịa ka ị nweburu na mbụ, ihe ndị a na ihe ndị ọzọ dị mma karịa ka ị sị chee n'echiche?

O nwere ọtụtụ ihe dị mma maka onye ọ bụla n'ime anyị. . . inu, imata, inwe ahụmahụ ya, na ịhụkwu n'anya . . . Ma anyị na-enwetakwa ụtọ ihe ndị a, hụchatụ ha . . . nke ebube Ya, ịma mma Ya, ịhụnanya Ya n'ime ndụ a. Mana ahụmahụ anyị nwere oke. Amamihe anyị nwere oke. Mana Chineke anyị, n'ike Ya na ịhụnanya Ya na ike okike Ya, enweghị oke. Ọ nọ ebe a ugbu a, na-ajụ anyị ma anyị, ka anyị n'agụ ihe a, dị njikere inyefe echiche anyị n'aka Ya. . . ọ bụrụ na anyị, ugbu a, chọrọ ịhụtakwu onye Ọ bụ na ndụ anyị, malite taa, n'oge a!

Mmụọ Nsọ, bụrụ anya anyị ugbu a. Bụrụ ntị anyị. Bụrụ uche anyị nke ísì, ụtọ, na mmetụ aka. Anyị chọrọ ihe Gị karịa. Anyị chọrọ ka Ị tụgharịa nkwenkwe ụgha ọ bụla anyị nwere gbasara Gị, ka Ị gbanwee echiche n'ezighi ezi gbasara onye Ị bụ na ihe Ị nwere ike ime. Ma anyị chọrọ ka Ị meghee obi anyị na uche anyị na echiche anyị ka anyị nwee ike ịhụ Gị, nwee mmetụta Gị, nwee ahụmịhe na mmekọrịta Gị jiri anya nke obi anyị nke nwere ike ime ọtụtụ ihe, nke ukwuu, n'ihe gbasara Gị, karịa naanị ịhụ ụzọ.

Nna Anyị Chineke, webatakwuo anyị n'ime iju-anya na oke-ebube na ima-nma. Ka anyị nwee ahụmịhe nke oke ịhụnanya Gị. N'oge ndị a, anyị na-echeré Gị, jiri nchekwube na obi ụtọ.

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Recognizing God's Voice // Learn to Encounter Him

Olu Chineke nwere ike ịbịa dị ka ntakwunye okwu dị nro ma ọ bụ nnukwu oke ifufe. Isi ihe bụ ịmata ya, otu ọ bụla o siri bịa—na ịtụkwasị obi na Chineke dị mma, na Ọ dị ike karịa ihe ọ bụla n'esogbu anyị. Malite atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị anọ wee bido ịmụta ka ị ga-esi zute Chineke, olu Ya, ọnụnọ Ya —wee sonyere ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwaanyị na-enwe ahụmịhe Rush | Mmụọ Nsọ n'ime Ndụ Ọgbara Ọhụrụ.

More

Anyị ga-achọ ikele Gather Ministries (Loop/Wire) maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://rushpodcast.com