Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ BụlaIhe Atụ
MMETỤTA EGOSIPỤTARA
"Nna-Anyị Chineke hụrụ gị n'anya."
N’abalị boro ụbọchị Jizọs nwụrụ, Ọ gwara ndị na-eso ụzọ Ya na Nna Ya hụrụ ha n’anya. Okwu ahụ bụ́ “ịhụnanya” n'ebe a adịghị egosi nlebara-anya kwesiri omume ma ọ bụ nke nchefu onwe-onye, iji onwe-onye tuo àjà. Ihe ọ n'ekwu ebe a bụ “mmetụta egosipụtara”—ịhụnanya nke n'eme ka obi dị uju na nke egosipụtara n'uzọ ahụrụ anya. Nke a dị oke mkpa ka a ghọta ya. Ihụnanya nke Nna-Anyị Chineke abụghị nke a na-arụ dịka ọrụ ma ọ bụ nke n'enweghị ihe ụtọ dị na ya. Mbanụ̀, ihe Jizọs n'ekwu ebe a bụ na “Nna-Anyị Chineke hụrụ gị n’anya n'uzọ dị omimi, dị ukwuu na nke n'adịghị nzuzo.” Ịhụnanya a ọ bụghị ihe magburu onwe ya! Ọtụtụ ndị nna nọ n'ụwa a na ụmụ ha enweghị mmekọrịta chiri-anya, ma n'anụ ahụ ma n'ụzọ mmetụta uche. Nna-Anyị nke Elu-Igwe adịghị otu ahụ; mgbe Jizọs nwuru wee bilie ọzọ, Ọ rigoro n'elu-igwe wee si n'ebe ahu wukwasi ndị n'eso ụzọ-Ya Mmụọ Nsọ. Ọ mere ka ndị n'eso ụzọ Ya jupụta na mmụọ nke nnabata nke na ha bidoro tikụwa “Nna!” Site n’oge ahụ gawa n’ihu, ha matara na Nna-Anyị Chineke hụrụ ha n’anya site na mmetuta egosipụtara—jiri ogwe aka ịhụnanya Ya siri ike na nke na-akasi obi. Nke a bụ ihe Jizọs chọkwara maka anyị. Ka anyị rịọ Ya ka O nyere anyị aka ịmata nke a n’ime obi anyị, a bụghị naanị n’ime isi anyị. Ka anyị nwee ahụmahụ mmetụta nke Nna-Anyị Chineke egosipụtara
EKPERE
Ezigbo Onye-nwe-m Jizọs, a na m arịọ Gị ka Ị nyere m aka ka m mata n’ime obi m na Nna-Anyị Chineke n’Onwe Ya hụrụ m n’anya n'uzọ dị omimi, ụzọ dị ukwuu, na nke anya pụrụ ịhụ. N'aha Gị. Amen.
Mụtakwuo ihe na Destiny Image Publishers, ma ọ bụ mụtakwuo maka akwụkwọ na Amazon ma ọ bụ Barnes and Noble.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ndụ nwere ike isi ike, ma mgbe ị na-eche ihe ịma aka ịhụ, ma nọrọ n'mkpa agbamume, ebe kacha mma ịga nweta ha bụ Okwu Chineke. Mana mgbe ụfọdụ ọ na-esi ike ịmata ebe e kwesịrị ile anya kpọmkwem. Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ Bụla gụnyerè akụkụ akwụkwọ-nsọ dị oke mkpa maka onye ọ bụla na-amụ Okwu Chineke ịchọpụta ma gụọ ya n’oge mgbago na mgbada nke ndụ. Tukwasi obi na Chineke ka O nyere gị aka n'oge ihe isi ike gị.
More