Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ BụlaIhe Nhụchatụ

ỊHỤNANYA KACHASỊ ỊHỤNANYA NIILE
Lee ịhụnanya magburu onwe ya Nna-Anyị Chineke gosiworo anyị!
Ọ dịghị ọn̄ụ dị ukwuu na ndụ karịa ịmara na Chineke bụ Nna hụrụ anyị n’anya, ma ọtụtụ mmadụ, gụnyere ndị nọ n’ime Nzukọ-Kraịst, enwetubeghị ụtọ nke ọn̄ụ a, ana-apụghị iji ọnụ wee kọwaa. Ọtụtụ ndị mmadụ ataala ahụhụ n'aka nna ha nke ụwa a, ya mere ha ji wee n'ahuta Nna-Anyị bi n'eluigwe dịka Ọ dị njọ otu ahụ. Ha wee kpụọ Chineke Nna Anyị n'ime obi ha n'ụdị nna ọjọọ ha nke ụwa a—wee n'ahuta Chineke dị ka nna n'ejighị ụmụ ya kpọrọ ihe ma ọ bụ nna n'adịghị enyere ụmụ ya aka ma ọlị. Ndị ọzọ n'ahuta Chineke dịka Nna n'adịghị aza ụmụ ya òkù ma ọ bụ nna iwe ya dị ọkụ n'ebe ụmụ ya nọ. Nhuta ndị a niile abụghị eziokwu nye ụdị onyinyo Jizọs gosiri anyị maka Nna Ya. Jizọs bịara ikpughere anyị ịhụnanya gabigara ókè nke Nna Ya. Ee Chineke bụ Eze. Ee Chineke bụ Onye-nwe-anyị. Ee Chineke bụ Onyeikpe. Ma nke kacha nke bụ na Chineke bụ Nna hụrụ ụwa a gba aka nne na nna n’anya nke ukwuu, nke na O zitere Ọkpara Ọ mụrụ naanị ya ka Ọ gbanwee ndị ohu ka ha ghọọ ụmụ Ya ma mee ka ndị n'enweghị nne na nna ka ha bụrụ ide ji ụlọ. Nke a bụ ngọzi dị elu karịa ngọzi niile—ịmata na Chineke bụ Nna dị ezigbo mma karịa nna niile nọ n'ụwa. Ọ bụrụ na ị nweghị ezigbo nna n’ụwa a, mara nke a: ị nwere Nna zuru oke n’elu igwe, O gosipụtakwala ịhụnanya Ya dị oké ọnụ nye gị n'ime Jizọs.
EKPERE
Nna m Chineke, a na m ekele Gị n'ihi na Ị bụghị Chi dị anya, Ị bụ Chi Ya na ụmụ Ya nọ na mmekọrịta. Nyere m aka ka mụ na Gị nwekwuo mmekọrịta chiri-anya ka m n'agụ ihe òfùfè ndị a. N'aha Jizọs. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ndụ nwere ike isi ike, ma mgbe ị na-eche ihe ịma aka ịhụ, ma nọrọ n'mkpa agbamume, ebe kacha mma ịga nweta ha bụ Okwu Chineke. Mana mgbe ụfọdụ ọ na-esi ike ịmata ebe e kwesịrị ile anya kpọmkwem. Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ Bụla gụnyerè akụkụ akwụkwọ-nsọ dị oke mkpa maka onye ọ bụla na-amụ Okwu Chineke ịchọpụta ma gụọ ya n’oge mgbago na mgbada nke ndụ. Tukwasi obi na Chineke ka O nyere gị aka n'oge ihe isi ike gị.
More