Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ BụlaIhe Atụ

God's Word For Every Need

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

ỤMỤ CHINEKE

Ihe nke a ọ bụghị ihe magburu onwe ya—a kpọrọ anyị ụmụ Chineke!

N'ihe òfùfè nke anyị gụchara, anyị hụrụ na Chineke bụ Nna nke setịworo ịhụnanya Ya dị ebube n'ebe anyị nọ. Ozugbo o kwuchara nke a, Jọn Onyeozi chetaara anyị na anyị, o bụrụ na anyị ahọrọ iso Jizọs, ga-abuzi ndị a na-akpọ “ụmụ Chineke.” Nke a bụ ndị anyị bụ n'ezie. Nke a bụ ezigbo njirimara anyị. Ka anyị si ahuta onwe anyị adịghị ndabere na ọrụ anyị n'arụ. Uru nke onwe anyị adịghị ndabere na ihe niile anyị chitaworo n'ụwa a. Mbanụ̀, ezi njirimara anyị dị mgbakwasị-ụkwụ na ihe ka adịgide adịgide na dị nchebe. Kedụ ntọala ka mma karịa mkpughe bụ isi nke Agba Ọhụrụ—na ndị niile maara Jizọs bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị esi n'ezi wee kpọbata n'obi eze nke Nna-Anyị Chineke? Ị n'ahu onwe gị otu ahụ? Ọ bụrụ na ị dịghị ahụ onwe gị otu ahụ, ka m kpalie mmụọ gị ka ị wulite njirimara gị n'eziokwu a. Ka m gbaa gị ume ka i wee mee ihe Jọn Onyeozi kwuru n’ebe a ma “meghee anya gị, lekwasị ya anya.” Chee echiche, tụgharịa uche, tụlee eziokwu a ma nwee ọṅụ ka ọṅụ n'ịma-mma ya mgbe ị mechara. Ị mee otu a, ị ga-enwe mmesi obi ike mgbe niile n'uzọ dị omimi nà nchekwa gị dị n'ọnọdụ gị dịka nwa Chineke, ọ bụghị n'ọrụ gị.

EKPERE

Ezigbo Nna m, achọrọ m inye Gị otuto na Ị hụrụ m n’anya maka onye m bụ—nwa nke Chineke. Daalụ maka ihe ùgwù a. N'aha Jizọs. Amen.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

God's Word For Every Need

Ndụ nwere ike isi ike, ma mgbe ị na-eche ihe ịma aka ịhụ, ma nọrọ n'mkpa agbamume, ebe kacha mma ịga nweta ha bụ Okwu Chineke. Mana mgbe ụfọdụ ọ na-esi ike ịmata ebe e kwesịrị ile anya kpọmkwem. Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ Bụla gụnyerè akụkụ akwụkwọ-nsọ dị oke mkpa maka onye ọ bụla na-amụ Okwu Chineke ịchọpụta ma gụọ ya n’oge mgbago na mgbada nke ndụ. Tukwasi obi na Chineke ka O nyere gị aka n'oge ihe isi ike gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị Destiny Image Publishers maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.destinyimage.com