Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ BụlaIhe Atụ
ỌKPỤKPỌ-ÒKÙ NKE ELUIGWE
"M ga-abụ Nna nye gị."
Gịnị bụ amaokwu kachasị dị uru n'ime Akwụkwọ Nsọ? Ọtụtụ mmadụ ga-aza sị n'obù, “Jọn 3:16: Chineke hụrụ ụwa a n’anya nke ukwuu nke na O nyere Ọkpara Ọ mụrụ naanị-Ya.” Otú o sila dị, amaokwu a siteré n’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ọgbakọ Kraịst dị na Kọrịnt, pụkwara ịdị ezigbo mkpa n'ụdị ahụ. N’otu ụzọ, enwere ike ịchịkọta atụmatụ na ebumnobi nile nke Chineke n’okwu ndị a, “M ga-abụ Nna nye gị.” Nke a bụ ebumnobi Chineke kemgbe Adam na Iv mehiere n’ime ogige Iden. N'ihi mmehie Adam na Iv, ụmụ mmadụ si na ịhụnanya Nna-Anyị Chineke kewapú. Ihe pụtara na ya bụ na, anyị ghọrọ ụmụ gba aka nne na nna n'ime mmụọ—ndị ha na Chineke apughịzi imekorita dị ka Nna na ụmụ. Mana ekele diri Jizọs, Onye gbanwere ihe niile! Jizọs bụ azịza nye ọnọdụ mgbei anyị. Ọ bịara n’ụwa a iji nwụọ maka mmehie anyị ma kpọbata anyị n'ime ezinụlọ nke Nna-Anyị Chineke dị n'ụwa a. Ugbu a, anyị nwere ike ịkpọ Chineke “Nna” ma zuru ike n'ogwe-aka ịhụnanya Ya. N’akwụkwọ òfùfè ndị a, Jizọs na-akpọ anyị òkù inye ọkwụ ndị a na-anaghị anwụ anwụ azịza: “M ga-abụ Nna nye gị."
EKPERE
Ị meela, Chineke m, maka ọkpụkpọ-òkù Gị ịbịaru Gị nso ka m wee mara Gị ka Nna. Eji m obi m nile n'asi “Ee,” ka m na-amalite ịgụ usoro akwụkwọ òfùfè ndị a. N'aha Jizọs. Amen.
Mụtakwụọ ihe na Destiny Image Publishers, ma ọ bụ mụtakwuo maka akwụkwọ na Amazon ma ọ bụ Barnes and Noble.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ndụ nwere ike isi ike, ma mgbe ị na-eche ihe ịma aka ịhụ, ma nọrọ n'mkpa agbamume, ebe kacha mma ịga nweta ha bụ Okwu Chineke. Mana mgbe ụfọdụ ọ na-esi ike ịmata ebe e kwesịrị ile anya kpọmkwem. Okwu Chineke Maka Mkpa Ọ Bụla gụnyerè akụkụ akwụkwọ-nsọ dị oke mkpa maka onye ọ bụla na-amụ Okwu Chineke ịchọpụta ma gụọ ya n’oge mgbago na mgbada nke ndụ. Tukwasi obi na Chineke ka O nyere gị aka n'oge ihe isi ike gị.
More