MgbagharaIhe Atụ
Mgbaghara Chineke chọrọ ka ị nọrọ n'udo, n'atụghị egwu, jupụta n'okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ọ bụghị ya? Ọ gaghị achọ ka ị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ ka iwe ju gị n'obi. Amaokwu gasị n'ekwú maka mgbaghara dị́ n'ime Akwụkwọ Nsọ na-akụziri gị ka ị ga-esi bụrụ onye ime mgbaghara n'adịghị enye nsogbu.
Mmadụ n'ekwu, siN'agbanyeghị na ọ kwetara na o mejọrọ m, ịgbaghara ya na-esiri m ike.
Chineke a n'ekwu, siAdila ntachi-obi ime mgbaghara. Gbaghara ugboro ugboro. Dị ka M. Luk 17:3-4
Mmadụ n'ekwu, sị Kedụ ka m ga-esi agbaghara onye na-amaghịdị na ihe ọ na-eme adịghị mma?
Chineke a n'ekwu, si Agbagharala M ndị kpọgidere M n’obe. Ha amaghịkwa na ihe ha nọ n'eme bụ ihe ọjọọ. Luk 23:34
Mmadụ n'ekwu, siAdị m ezigbo iwe n'ebe ha nọ. Ha ji mkparị na àgwà-ọjọọ SAA m ahụ.
Chineke a n'ekwu, si Imeso ha àgwà-ọma bụ ụzọ kachasị mma isi kwụghachi ha ụgwọ, oge niile. Dị ike amara n'obi. Dị ka M. Ndị Efesọs 4:32
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Mgbaghara. Ka anyị leba anya n’amaokwu ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ. Chineke chọrọ ka ị nọrọ n'udo, n'atụghị egwu, jupụta n'okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ọ bụghị ya? Ọ gaghị achọ ka ị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ ka iwe ju gị n'obi. Amaokwu gasị n'ekwú maka mgbaghara dị n'ime Akwụkwọ Nsọ na-akụziri gị ka ị ga-esi bụrụ onye ime mgbaghara n'adịghị enye nsogbu. Amamihe na-abịa site na ịtụgharị uche na Okwu Chineke.
More