Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MgbagharaIhe Atụ

Forgiveness

ỤBỌCHỊ 1 NKE 4

Mgbaghara Ka anyị leba anya n’amaokwu ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ. Chineke chọrọ ka ị nọrọ n'udo, n'atụghị egwu, jupụta n'okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ọ bụghị ya? Ọ gaghị achọ ka ị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ ka iwe ju gị n'obi. Amaokwu gasị n'ekwú maka mgbaghara dị́ n'ime Akwụkwọ Nsọ na-akụziri gị ka ị ga-esi bụrụ onye ime mgbaghara n'adịghị enye nsogbu.

Mmadụ na-asi: Ama m na a kpasuru m ya iwe, mana ọ bụ uche m na ọ ga-echefu ya.  Ma ...

Chineke na-ekwu, si Ọ gaghị adị ka ị chere. Ndị mmadụ na-ejigide ka gọm ihe ndị na-ewute ha. Ilu 18:19


Mmadụ n'ekwu, si Ị ghọtaghị ihe ọjọọ niile dị okè m mere! Mgbaghara abụghị maka m.

Chineke a na-ekwu, siAbụ M Chineke nke “Oghere Ọzọ”. Adịghị M agbanwe-agbanwe. A na M agbaghara, ugboro ugboro. Maịka 7:18-19


Mmadụ n'ekwu, si Ee, e mejọrọ m ya n'ezie, mana enweghị m ike ịgakwuru ya ugbu a. 

Chineke a na-ekwu, siỌ bụrụ otu ahụ, ofufe na nrubeisi ị n'enye M abụghị nke eziokwu. Gakwuru onye ahụ ị mejọrọ ka gị na ya kpezie. Matiu 5:23-24 

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Forgiveness

Mgbaghara. Ka anyị leba anya n’amaokwu ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ. Chineke chọrọ ka ị nọrọ n'udo, n'atụghị egwu, jupụta n'okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ọ bụghị ya? Ọ gaghị achọ ka ị na-echegbu onwe gị ma ọ bụ ka iwe ju gị n'obi. Amaokwu gasị n'ekwú maka mgbaghara dị n'ime Akwụkwọ Nsọ na-akụziri gị ka ị ga-esi bụrụ onye ime mgbaghara n'adịghị enye nsogbu. Amamihe na-abịa site na ịtụgharị uche na Okwu Chineke.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele MemLok maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.memlok.com/wp/

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara