Ịhụnanya na Alụmdi-Na-NwunyeIhe Atụ
Ọ bụ ihe kwere nghọta ihe kpataranụ anyị adịghị ewere di ma ọ bụ nwunye anyị dị ka nwanne anyị nwoke ma ọ bụ nwanne anyị nwaanyị, mana akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, nke gụnyere nnukwu amaokwu gbasara alụmdi na nwunye, malitere na ichetara anyị niile ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n'anya dịka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị n'ime Kraịst. Mgbe unu gụkọchara akụkụ Akwụkwọ Nsọ a n’olu dara ụda, kparịtanụ otú isi ihe ndị ọ na-ekwu si metụta mmekọrịta unu. Tulee nu otú ọ si dị mfe n'ezie imeso ndị enyi unu bụ Ndị Kraịst omume ọma karịa ndị unu na ha so biri n'ime ụlọ. Unu abụọ kpee ekpere gwanu Chineke okwu banyere ihe atụ nke ịhụnanya Kraịst nke O zubere ka alụmdi na nwunye unu bụrụ. Rịọnu Ya ka O duzie unu abụọ ka unu bụrụ ndị ndụ ha na-arụtụ aka n'ịhụnanya Chineke na-adịghị agbanwe agbanwe.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Site n’ilekwasị anya n’alụmdi na nwunye anyị site n'ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ, anyị na-enye Chineke ohere ikpughe nghọta ọhụrụ banyere mmekọrịta anyị na ime ka njikọ anyị sikwuo ike. Atụmatụ ihe ọgụgụ a na-egosipụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị nlekwasị anya na echiche gasị dị kem kem kwa ụbọchị iji malite mkparịta ụka na ekpere gị na onye i lụrụ ga n'eme. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị́ ụbọchị ise bụ nkwekọ n'eteghị aka iji nyere gị aka tinye uchu na mmekọrịta gị dị ruo ọgwụgwụ nke ndụ a. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee finds.life.church
More
Anyị ga-achọ ikele Life.Church maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ nke Ịhụnanya & Alụmdi-na-nwunye. Maka ozi ndị ọzọ gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha bụ: www.life.church