Ịhụnanya na Alụmdi-Na-NwunyeIhe Atụ
A na-eji okwu ahụ bụ ịhụnanya eme ihe n'ọtụtụ ụzọ dị iche iche. Mana Onye Ya-Onwe-Ya bụ ịhụnanya na-enye anyị nkọwa doro anya gbasara ịhụnanya n’ime Okwu Ya. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-ama anyị aka ịhụ n'anya ruo n'ọkwá Chineke nyere--dịka Ọ siri hụ anyị n'anya. Nke a bụ ndepụta siri ike nye anyị, ihe e nweghị ike imenwu ma ọlị ma ọ bụrụ na ịhụnanya Chineke adịghị eru ka mmiri n'ime na site n'anyị. Mgbe gị na di ma ọ bụ nwunye gị gụkọtachara akụkụ Akwụkwọ Nsọ a n'olu dara ụda, gwanụ onwe unu ihe kacha egosipụta ịhụnanya nye unu. Gị na onye i lụrụ kpekotanụ ekpere ka Chineke mụbaa ike unu ịhụ onwe unu n'anya jiri ịhụnanya Ya.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Site n’ilekwasị anya n’alụmdi na nwunye anyị site n'ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ, anyị na-enye Chineke ohere ikpughe nghọta ọhụrụ banyere mmekọrịta anyị na ime ka njikọ anyị sikwuo ike. Atụmatụ ihe ọgụgụ a na-egosipụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị nlekwasị anya na echiche gasị dị kem kem kwa ụbọchị iji malite mkparịta ụka na ekpere gị na onye i lụrụ ga n'eme. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị́ ụbọchị ise bụ nkwekọ n'eteghị aka iji nyere gị aka tinye uchu na mmekọrịta gị dị ruo ọgwụgwụ nke ndụ a. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee finds.life.church
More
Anyị ga-achọ ikele Life.Church maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ nke Ịhụnanya & Alụmdi-na-nwunye. Maka ozi ndị ọzọ gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha bụ: www.life.church