Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịhụnanya na Alụmdi-Na-NwunyeIhe Atụ

Love and Marriage

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Onwe gị dị ochie agaghị adị mma n'ụzọ i si chee dị ka onye onwe gị nke ọhụrụ lụrụ. Akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-ama anyị aka ka anyị wepụ àgwà ọjọọ ndị na-eguzogide n'ụzọ nke alụmdi na nwunye dị mma, ma yikwasị àgwà nke Kraịst. Ọ bụ ezie na ihe ọgụgụ a na-eme kà ọ dị mfe dị ka iyirì uwe, gị na onye i lụrụ gụkọọ ya ọnụ ma gee ntị maka otu àgwà mmehie ahụ kachasị sie ike iwepụ na otu àgwà ahụ n'asọpụrụ Chineke i n'enwe ezigbote nsogbu na ya ịyikwasị n'onwe gị dị ka uwe. Kwupụta ụzọ gasị ị dara mbà n'iyikwasị àgwà na-asọpụrụ Chineke dị ka uwe, ma rịọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ka ọ gbaghara gị. Kpekoonụ ekpere ọnụ ka Chineke nye unu mkpebi siri ike ịyikwasị agwa Ya ugboro ugboro dị ka uwe kwa ụbọchị.
Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Love and Marriage

Site n’ilekwasị anya n’alụmdi na nwunye anyị site n'ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ, anyị na-enye Chineke ohere ikpughe nghọta ọhụrụ banyere mmekọrịta anyị na ime ka njikọ anyị sikwuo ike. Atụmatụ ihe ọgụgụ a na-egosipụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị nlekwasị anya na echiche gasị dị kem kem kwa ụbọchị iji malite mkparịta ụka na ekpere gị na onye i lụrụ ga n'eme. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị́ ụbọchị ise bụ nkwekọ n'eteghị aka iji nyere gị aka tinye uchu na mmekọrịta gị dị ruo ọgwụgwụ nke ndụ a. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee finds.life.church

More

Anyị ga-achọ ikele Life.Church maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ nke Ịhụnanya & Alụmdi-na-nwunye. Maka ozi ndị ọzọ gbasara Life.Church, gaa na webụsaịtị ha bụ: www.life.church

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yiri Nke A Ị Gụchara