Ibi ndụ n'okwukweIhe Atụ
Onye ziri ezi ga-ebi ndụ nke okwukwe
Ihe nke atụkwasịrị n'ebe onye kwere ekwe na njem ya nke eluigwe bụ okwukwe. Okwukwe bụ ya bụ nnukwu ike na ihe bara uru nke ndị kwere ekwe n'ime Kraịst. Okwukwe na-arụ ọrụ dị mkpa n'ịgbaziri anyị na ụdịdị ndụ anyị na ebi. Akwụkwọ Nsọ kwuru n'akwụkwọ Efesọs 2:8, N'ihi na ọbụ amara ka e jiworo zọpụta unu, site n'okwukwe, nkea esiteghikwa n'onwe unu, ọ bụ onyinye Chineke. Ọ bụ site n'okwukwe ka ndị kwere ekwe si enwetakwa ihe dị mkpa niile nke Kraịst mejupụtaworo anyị. Site n'ihe dị mkpa a, a zọpụtala ihe onyinye niile enyere anyị n'efu bụ site n'amara Chineke agbaputawo anyị site n'ihe digasi mkpa nke okwukwe. Okwukwe anyị a, kwere na Kraịst ma Kraịst ịnọ n'ime dịka okwukwe anyị. N'akwụkwọ Hibru 11 bụ ebe edepụtara ihe nlereanya anya maka nwoke na nwaanyị ndị biri ndụ nke okwukwe. Nkea gụnyere Abraham, Enoch, Noah, Sera, Isaac, Jecob, Josef, Moses, Rahab, Pita dgz. Otu agwa gbara ọkpụrụkpụ anyị ga-ahụ na ndụ ndị a biri ndụ okwukwe bụ ntụkwasị obi na ịba ime na Chineke na okwu ya.
Isi mbido nke okwukwe bụ ikwere na àgwà Chineke - ọ bụ onye osi ọ bụ. Ebe ọgwụgwụ n'ikwenye na nkwa niile O kwuru. Mgbe anyị kwetara na Chineke nwere ike imezu nkwa ya niile mgbe anyị ahụbeghị nkwa ndị ahụ na mezu, anyị na ezipụtakwa okwukwe. Okwukwe bụ ego nke onye kwere ekwe ji akwado ihe nketa alaeze nke e mebere site n'amara.
Ụmụ Izrel ndị Chineke họrọ jụrụ ịbanye n'ala ekwere H na nkwa maka na ha ekwenyeghị na nchekwa a nke Chineke. Ha ekwenyeghị na Chineke ga-enyere ha aka ị nweta ala ekwere ha na nkwa. Akwụkwọ Hibru 4:6 kwuru: Ya mere ebe ọ fọdụrụ ka ụfọdụ ba n'ime ya, ndị e buru ụzọ zie ozi ọma abaghịkwa n'ime ya n'ihi ekwenyeghị ekwenye. N'ụbọchị taa nkwa nke Chineke nye ndị kwere ekwe dabere na Kraịst. Enweghị ntụkwasị obi na Chineke mgbe niile na-egbochi anyị ị nata ndabere nke a na-ahụta sọsọ na Kraịst. Ndabere anyị na Kraịst na-ebido mgbe anyị tụkwasịrị Chineke obi ka ọmejupụta ọdị mma ya na ịmejupụta ọrụ nke ọ malitere ịrụ n'ime anyị.
Ihe nke kacha na mmetụta nke okwukwe na onye kwere ekwe bụ inye ka ezumike. Ihe mkpagbu niile na ihe ịma aka niile nke ndụ agaghị akwụsị onye nke tụkwasịrị Chineke obi. Chineke chọrọ ka anyị banye n'ezumike na n'udo ya. Ihe nzaghachi anyị bụ ka anyị bie ndụ n'okwukwe ụbọchị nniil.
Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Ndi Rom 4:16, Hibru 4:9-11, 2Pita 1:1
Ekpere: Nna m, e kwenyere na nkwa niile ikwere m, nyere m aka ụbọchị niile ibi ndụ n'okwukwe, n'aha Jizọs.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Atụmatụ e wepụtara gbadoro ụkwụ na mkpughe nke ihe niile maka onye kwere ekwe na njem ezi ọnọdụ nwa oge n'elu ụwa. Ibi ndụ n'okwukwe, bụ arịlịka nke mmadụ nke a kpọọ nwa nwere okwukwe, mgbe Nna ya ukwu ga-abiaghachite.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg