Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibi ndụ n'okwukweIhe Atụ

Ibi ndụ n'okwukwe

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Ndụ nke Okwukwe

Ịkpọ oku nke ndị otu Kraịst bụ ịkpọ oku nke ibi ndụ n'okwukwe. Ndụ nke okwukwe bụ ndị nke na-, ezipụta ntụkwasi obi n'ihe dị ukwu nke Chineke na-enye nke ga-eme ka anyị biri n'ụwa a.

Okwukwe bụ ebe ihe dịgasị mkpa anyị na-atụ anya dị. Ọ bụ ya bụ inwe okwukwe n'ime onye nwe anyị, ntụ kwasị obi, nkwekọrịta, ezigbo ihe ahụ dị mkpa, nke na-enye aka maka ihe anyị na-atụ anya ya. Ntọala nke na-akwado ihe anyị na-atụ anya. Ndị niile kwere na Kraịst, bụ ndị emejupụtara n'ihe a na-atụ anya ya maka na Kraịst bi n'ime anyị bụ ebube nke ihe ịtu n'anya anyị. Anyịwa inweta ihe niile anyị na-atụ anya ya, anyị ga-agba mbọ bụrụ ndị na-ebi ndụ nke okwukwe. Okwukwe abụghị sọsọ na'ikwere na Chineke kama ọ bụkwa irubere Chineke isi, na ịnapụta mee ka Chineke mezuo okwu ya. Mgbe mmadụ na-agbanyeghi mgbọrọgwụ n'ime amamiihe nke okwu Chineke na ụdịdị nke Chineke, okwukwe onye ahụ nwere ike ọ gaghị esi ike n'ihu mmekpa ahụ. Otu n'ime ihe ndị mejupụtara okwukwe bụ aamamiih.

Mgbe Jizọs na-agwa otu n'ime onye na-eso ụzọ ya bụ Pita n'akwụkwọ Luk 22:31-32, "Ya mere Jizọs kwuru sị Saịmọn, Saịmọn lee ekwensu rịọtara ka ọ yochaa gị dịka ọka wit, ma mụ onwe m rịọrọ arịo na ekpere banyere gị, ka okwukwe gị ghara ịda ada, gị onwe gị, mgbe ị ga-echegharaịwọrị gị mee ka ụmụnna gị guzosie ike. Ihe niile ekwensu chọrọ na ndụ ndị kwere ekwe bụ ka okwukwe ha nwere na Chineke daa. Mgbe okwukwe gị dara ndụ gị ga-abụkwa ihe dara ada. Okwukwe nke onye kwere ekwe dịka mgbe mkpụrụobi nọ n'ime ahụ. Mgbe mkpụrụobi dara, anụ ahụ anwụ. Mgbe okwukwe anyị dara, emeela ka ọ na-awagharị n'ụzọ nke ọnwụ. A maara Abraham dịka onye ama ama n'okwukwe n'ebe ụmụ Chineke nọ, nwunye ya bụ Sera bụ nwa aga ruo ihe dịka afọ iri abụọ na ise ma na-obutereghi ya ihe mgbagwoju anya na nkwa Chineke site n'ekweghi ekwe, kama o mere ka okwukwe ya sie ike ma na-enye Chineke otito. Jizọs bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, nkwa niile o kwere gị nwere ike ọ biabeghị na mezu, ha niile ga-abịa na mezu ma ọ bụrụ na ikwusighi n'ụzọ.

Mụ onwe m, ndụ m bụ ihe ọgbugba ama banyere ndụ nke okwukwe. Chineke gwara m sị m na m gaa tinye onwe m kpam kpam n'ijere ozi, mgbe m nwere ohere dị iche iche ịnweta ọọr. A maghị m ka m sị na-adị ndụ, ma na site n'ebere Chineke enweghị ihe obi ilo mmiri n'isogide ya. O karịla ihe dịka afọ isii Chineke na-anọgide na-emere m mkpa m niile ma na-egboro ezinaụlọ m mkpa anyị niile.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Ndị Rom 4:19, Hibru 11:6, Jemes 1:6-8, Hibru 11:1.

Ekpere: Nna m nyere m aka ka m na ebi ndụ nke okwukwe n'aha Jizọs.

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ibi ndụ n'okwukwe

Atụmatụ e wepụtara gbadoro ụkwụ na mkpughe nke ihe niile maka onye kwere ekwe na njem ezi ọnọdụ nwa oge n'elu ụwa. Ibi ndụ n'okwukwe, bụ arịlịka nke mmadụ nke a kpọọ nwa nwere okwukwe, mgbe Nna ya ukwu ga-abiaghachite.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg