Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ibi ndụ n'okwukweIhe Atụ

Ibi ndụ n'okwukwe

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Iwu a na-agbarọ maka nchere

Alaeze Chineke bụ ebe nnọkwasi ya ebe Chineke na-achị eze na achị isi. Usoro na nkwalite nke ịmata alaeze Chineke na-emetụta nke ụdịdị na ngosipụta onwe nke Chineke. Chineke anyị bụ mmụọ dịka Akwụkwọ Nsọ sịrị kowapụta ya nke ọma n'akwụkwọ Jọn 4:24. Chineke bụ mmụọ ndị na-akpọ isi ala nye ya aghaghị ịkpọ isi ala n'ime mmụọ na eziokwu. Na mmekọrịta nke anyị na Chineke anyị ga-agba mbọ nwee nghọta na Chineke bụ eze nke mmụọ ọ bụghị odibo nke mmụọ. Ya mere tupu anyị erite ihe ọ bụla gbasara Chineke n'uru, anyị ga-agba mbọ bụrụ ndị nwere usoro iwu a na-agbaso maka nchere. Chineke bụ Eze kachasị eze, ọ bụkwanu onye na-eme ihe masịrị ya. Onye ọka abụ dere, Ma Chineke anyị nọ n'eluigwe, ọ na eme ihe chọrọ ime. Iwu a na-agbaso maka nchere bụ iwu nke jupụtara na ndụ okwukwe. Ihe ọgụgụ dị iche iche e dere n'akwụkwọ nke ụbọchị taa kọwara nke ọma na Hibru 10:35-36, N'ihi na ntachiobi dị ụnụ mkpa ka ọ ga-abụ mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ. N'ihi ya, na nwa mgbe nta onye na-abịa ga-abịa n'egbughị oge, anyị ga-amụta ka esi enwe ndịdị ma chere mmezu nkwa nke Chineke. Ọ ga-abịa na mgbe ọ bụla bụ oge dị mma.

Ịwụ a na-agbaso maka nchere nke Chineke, onye bụ eze nke mmụọ chọrọ ka anyị na-enwe nchere n'ebe anyị na eje ozi. Mgbe ị na-echere Chineke n'ihe niile, mụta ka esi atụkwasi ya obi, otu ụzọ anyị si ezipụta na anyị nwere ntụkwasị obi na Chineke bụ ikwudosi ike n'ije ozi maka ebumnuche o jiri ke pụta ụwa. Ezinaụlọ Zekaraya na Elizabeti bụ ndị na-enweghị nwa mana ha chere na Chineke, na-aga n'ihu n'ije ozi nke Chineke Iwu. a na-agbaso maka nchere nke alaeze Chineke gụnyere na anyị ga-anọgide n'oso ụzọ nke ezi omume na-enweghị obi abụọ. Otu ihe ka chasi wee sie ike n'alaeze Chineke bụ nchere nke oge Chineke. Mgbe ị na-eche, ụfọdụ ndị mmadụ nwere ike na-akwa gi na Chineke gị emo. Mana mgbe ọbula mara ka esi ada jụụ n'ime mmụọ gị. Na-ekwupụta ma kwụrụ chịm na nkwa niile nke Chineke maka na nkwupụta nwere ụzọ o si ewuli okwukwe maka nweta. N'agbanyeghị oteela aka ọ mebeghi, chere Chineke, n'ikpe ekpere na ebu ebu ọnụ. Job bụ nwoke gabigara oke nsogbu na ndụ ya nke ruru ihe dịka afọ iri isii dịka ndị na-amụ maka akwụkwọ Nsọ kwuru: mana n'ikpeazụ, ọnọdụ ya mechara gbanwee n'ụzọ dị mma. Ọ kwupụtara n'akwụkwọ Job 14:14. Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ ọ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị niile nke obubu agha m ka m ga-eche ruo mgbe mgbanwe m gga-abị.

Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Isaiah 40:29-31, Abụ Ọma 46:10, Abụ Ọma 40:1, Abụ Ọma 115:3, Luk 1:5-14.

Ekpere: Chineke m, e kwere nkwa ichere na gị ụbọchị niile oge nke ịhọtara m ruo mgbe mgbanwe m ga-abịa. Nyere m aka site n'amara gị ichere n'aha Jizọs.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ibi ndụ n'okwukwe

Atụmatụ e wepụtara gbadoro ụkwụ na mkpughe nke ihe niile maka onye kwere ekwe na njem ezi ọnọdụ nwa oge n'elu ụwa. Ibi ndụ n'okwukwe, bụ arịlịka nke mmadụ nke a kpọọ nwa nwere okwukwe, mgbe Nna ya ukwu ga-abiaghachite.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg