Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MGBAGHARAIhe Atụ

MGBAGHARA

ỤBỌCHỊ 3 NKE 3

ÒFÙFÈ NRÒ URU NKE MGBAGHARA

Mgbaghara na-agbanwe ndụ anyị ka anyị wee nwee ike ịhụ Chineke n'anya n’ụzọ dị omimi, ma hụkwa ndị ọzọ n'anya n’ezie, karịa etu ikike mmadụ hadebe. Ụfọdụ uru mgbaghara bara gụnyere:

• Anyị na Chineke ịdị n’udo: Ndị Rom 5:1

• Na-ewulite mmekọrịta dị mma: (Ilu 17:9 )

• Na-eweta ọgwụgwọ: Mgbaghara na-ewepụ ihe mgbu, ụfụ, ụ́fū-ōbì, nchegbu na obi ilu,
nke nwere ike imetụta, nke na-abụghị naanị mmekọrịta anyị na Chineke na mmadụ,
kamakwa ọ nwere ike imebi ahụ ike anyị. Dị ka Johnhopkinsmedicine.org si kwuo,
“Nnchọcha achọpụtala na mgbaghara nwere ike iweta nnukwu ụgwọ ọrụ ahuike gị, na-
ebelata ihe egwù nke obi nkolopu; na-akwalite ụra nà ogo kolestọrọl; na ibelata ihe
mgbu, ọbara mgbali elu, na ogo nke nchekasị, ịda mbà n'obi na nrụgide." Enweghị
mgbaghara na-ebute ọtụtụ ihe na-adịghị mma, ọkachasị n'ebe onye e mejọrọ nọ, bụ
onye họọrọ ijigide mmejọ.

Mgbe anyị gbaghaara, anyị na-eṅomi ọdịdị Chineke.

Uru mgbaghara bara enweghị ọgwụgwụ. Ya mere, anyị ga-ebute ma ịchọ ma inye mgbaghara ụzọ. Mgbe ọbụla ọ dị mkpa ime otú ahụ, rịọ mgbaghara, ọ bụrụgodi n’aka Chineke, enyi gị, onye ọrụ ibe gị, maọbụ onye ọbụla i mejọrọ. Ọzọkwa, na-emesapụ aka ịgbaghara ndị nọ gị gburugburu. Nke a dị mkpa maka ahụike nke ndụ ime mmụọ gị.

Ọ dịkwa mkpa inwe obi sara mbara nke na-enye ohere maka ezughị okè na mmejọ nke ndị ọzọ, na-eweliteghi ihe ojoo ha mere mgbe ọbụla ohere dapụtara. Dị ka Chineke na-agbaghara anyị kpam kpam, na-echeghị ka ọ kụọ anyị ntu na ya oge ọzọ anyị metọrọ ihe, anyị aghaghịkwa inye ndị ọzọ mgbaghara na-agbakwụnyeghị ihe ọbụla.

Echiche nke mgbaghara dị ukwuu; ka o sila dị, ime ya n'ezie nwere ike ịyị egwu. Ọ bụrụgodi ịrịọ mgbaghara maọbụ inye ndị ọzọ mgbaghara, ọ bụ otu n’ime akụkụ kacha sie ike na mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ma ọ dị oké mkpa ná ndụ ndị Kraịst.

Anyị ga-agbalisi ike kwa ụbọchị irube isi n’iwu mgbaghara a, iji na-elekọta mmekọrịta anyị na Chineke nwere anya, mee ka ọ na-aga nke oma, ma hụ na anyị na mmadụ dị n’udo. Chineke na-enye onye ọbula, ma nke kacha mma bụ na ọ naghị echetakwa mmehie gị ọzọ! A ga-agbaghara omebiiwu ọbụla ji obi mwute bịakwute ya, emee ya ka ọ dị ọcha karịa snow. Dịka anyị na-anata mgbaghara, Mmụọ Nsọ na-enye anyị ike ịnye mgbaghara.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

MGBAGHARA

Mgbaghara bụ otu ibe dị oke mkpa na ndụ onye Kraịst, maka iji nwee udo na udi mmekọrịta na-eto eto n’ebe ya na Chineke na mmadu nọ. Ọ bụghị naanị na Jizọs ji ndụ ya kọwarịgharịa mgbaghara site na nkuzi ya, o nyekwazịrị amara achọrọ iji nara ma nyekwa mgbaghara site na Mmụọ ya. Enyela nwa Chineke ọbụla ike irube isi n’iwu Chineke nyere ka agbaghara ndị ọzọ otu e si gbaghara ha.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/