Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MGBAGHARAIhe Atụ

MGBAGHARA

ỤBỌCHỊ 1 NKE 3

ÒFÙFÈ NRÒ GỊNỊ BỤ MGBAGHARA?

Chekene echiche maka onye ekperima mebiri nnukwu iwu megide steeti, ma kwesị ịnwụ; mana tupu ekpebie ikpe ya, Ọ̀kaikpe ahụ enwee ọmịiko, kama inye ya ntaramahụhụ kwesịrị ya o kpebie ime ebere site n'ịgbaghara ya. Onye ikpe mara enwere onwe ya - atọhapụ ma hapụ ya na mmebi iwu ya niile; enye ya ohere nke abụọ na ndụ.

Mgbaghara, nke bụ inye ebere na amara, bụ ihe tọrọ atọ ma kwụrụ ọtọ.

Mgbaghara kwụ ọtọ bụ mgbaghara anyị natara site n’ọnwụ Kraịst, bụ nke mere ka iwe Chineke dajụọ nke na kama ịnara ụgwọ ọrụ nke mmehie, Ndị Efesọs 1 amaokwu 7 aghọrọ eziokwu anyị.

“Nʼime ya, anyị nwere mgbapụta site nʼọbara ya, bụ mgbaghara nke njehie niile anyị; dị ka ịba ụba nke amara ya si dị,”

Enweghị ike inweta ụdị mgbaghara a ebe ọzọ abụghị n’ime Kraịst. Ọ bụ ihe na-eme ka anyị na Chineke dị ná mma, na-emekwa ka anyị nwee ike iji obi ike banye n’ebe nsọ dị n’ime ebe nsọ n’ihi na a gbagharala anyị. Ịnata mgbaghara a dị mkpa iji bụrụ Onye Kraịst. Mgbaghara nke a bụ ihe na-agbanwe onye mmehie jọgburu onwe ya, mee ya onye nsọ nke na-ebi ndụ kwa ụbọchị iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ. Ọ bụ n'efu; ị nweghị ike inweta ya site n’ọrụ maọbụ kwesi ya. Jizọs bụ àjà na-enyere anyị aka ịnata mgbaghara a. N'agbanyeghị etu mmehie gị si jọka njọ, ọ̀ gaghị akarị Chineke. Ozigbo ị bịakwutere ya na ezi nchegharị, ị ga-enweta nnaghara na mgbaghara.

Mgbaghara tọrọ atọ n’aka nke ọzọ bụ ihe Chineke nyere anyị iwu inye ndị ọzọ na mmekọrịta anyị na ndị mmadụ kwa ụbọchị. Pita n’ịgbalị̣ ịghọta etú mmadụ nwere ike isi meere onye mmejọ ebere na amara, jụrụ Jizọs ugboro ole o kwesịrị ịgbaghara onye mejọrọ ya na Matiu 18:21. Nzaghachi Jizọs gosiri etú anyị kwesịrị isi na-agbaghara mmehie n’irube isi. ".…Ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa. Jizọs kpọrọ anyị òkù ka anyị bie ndụ nke obiọma na obi ọmịiko n'ebe ndị ọzọ nọ.

Inwe ike ịgbaghara ndị ọzọ bụ ọrụ nke nghọta ị nwere banyere etu mgbaghara ị nwetagoro hà. Ịhọrọ ịhapụ mmetụta nke iwe maọbụ ọchịchọ nke ịbọ ọbọ n'ebe onye mejọrọ gị nọ, bụ irube isi n'iwu Chineke nyere igbaghara. Nke a apụtaghị na ị gaghị echeta mmejọ ahụ, kama mgbaghara pụtara na ncheta ya anaghịzi afụ ụfụ, nke a na-enwe ọchịchọ imegwara. Ugbu a, naanị ihe ị na-eche n'ebe onye ahụ mejọrọ nọ bụ ọmịiko na obiọma, nke na-akpali gị ka gị na ha na-emekọrịta n'ịhụnanya, ma ha arịọla mgbaghara maọbụ na ha arịọghị.

Nke a nwere ike iyi ihe na-agaghị ekwe omume, mana n’ime Chineke, mgbaghara na-asị, "Ekwere m omume". Banye n'ime enyemaka Chineke site na Mmụọ Nsọ ịtọhapụ onye ọbụla ị ji ugbua na mkpọrọ nke enweghị mgbaghara n'ihi na a na-atụ anya na ndị agbaghaara mmehie ga-agbaghara ndị ọzọ makana mgbaghara gbanyere mkpọrọgwụ n'àjà ọnwụ Jizọs chụrụ iji nye anyị mgbaghara.

Agbagharala gị? Ònye ka i kwesịrị ịgbaghara taa? Rịọ Chineke amara.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

MGBAGHARA

Mgbaghara bụ otu ibe dị oke mkpa na ndụ onye Kraịst, maka iji nwee udo na udi mmekọrịta na-eto eto n’ebe ya na Chineke na mmadu nọ. Ọ bụghị naanị na Jizọs ji ndụ ya kọwarịgharịa mgbaghara site na nkuzi ya, o nyekwazịrị amara achọrọ iji nara ma nyekwa mgbaghara site na Mmụọ ya. Enyela nwa Chineke ọbụla ike irube isi n’iwu Chineke nyere ka agbaghara ndị ọzọ otu e si gbaghara ha.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/