MGBAGHARAIhe Atụ
ÒFÙFÈ NRÒ, GỊNỊ KPATARA M GA-EJI GBAGHARA?
Jizọs tụrụ ilu banyere odibo nke ji nna ya ukwu nnukwu ụgwọ mana o nweghị ike ịkwụghachi ya. Nna ya ukwu nyere iwu ka ekee ya agbụ tụbà ya n’ụlọ mkpọrọ rue mgbe ọ ga-akwụ ụgwọ. Ka o sila dị, odibo ahụ bere akwa ka emeere ya ebere, nna ya ukwu enwee ọmịiko n’ebe ọ nọ; gbaghaara, ma kagbuo ụgwọ o ji.
Odibo ahụ kelere ya wee pụọ. Ozigbo ọ pụtara, ọ hụrụ otu odibo ibe ya na-ejighi ya nnukwu ụgwọ, nke enweghịkwa ike ịkwụ ya. Kama imere odibo ahụ ebere etú e si meere ya, ajọ odibo a ejichie odibo ibe ya n’akpịrị ma kpọchie ya n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe o nwere ike ịkwụ ụgwọ o ji, nke mere ka iwe wee odibo ndị ọzọ.
Ịhụ etu obi si kpọọ ya nkụ, odibo ndị ọzọ weere iwe kpesara nna ha ukwu, onye were iwe nke ukwuu n’ebe odibo ahụ nọ n’ihi na o nyeghị ihe e nyere ya. Nke a mere ka o cheta ụgwọ niile o ji ma kwuo ka a kpọchie ya na ezinaụlọ ya ruo mgbe ọ kwụrụ ụgwọ niile o ji ruo na peni nke ikpeazụ. Ihe atụ a bụ ihe mmụta banyere mkpa mgbaghara dị.
Mgbe mmadụ jụrụ ịgbaghara, Chineke na-ele ha anya ka ndị gbara ajọ ma kwuo na ya ga-anarakwa ha mgbaghara ahụ ha natara. Ịnagide enweghị mgbaghara na-eduga n'ụfụ-obi, iwe, o nwekwara ike ibute ọrịa. Ọ na-etiwa mmekọrịta ma na-eduga n'agha jụrụ oyi megide ọchịchọ Chineke. Otu onye kwuru na enweghị mgbaghara dị ka ịṅụ nsí ma na-atụ anya ka onye nke ọzọ nwụọ. Ọ na-egbu onye e mejọrọ karịa onye mejọrọnụ.
Ịjụ ịgbaghara mmehie bụ ịkpacha anya họrọ inupụrụ Chineke isi. Nke a nwere ike imebi mmekọrịta anyị na Ya n'ụwa ebe a, ma nwee ike ikewapụ anyị na Ya ebighị ebi.
Akụkụ ekpere nke Onye nwe anyị na-agụ, “… ma gbaghara anyị njehie anyị ka anyị na-agbaghara ndị mejọrọ anyị…” Nke a pụtara na iru ka Chineke gbaghara anyị dabeere na mkpebi anyị ịgbaghara ndị ọzọ. Ọ ga-abụ ihe na-ezighị ezi ịnata mgbaghara n'aka Chineke, ma jụ ịgbaghara ndị ọzọ. Chineke na-atụ anya ka anyị nye ihe anyị natara.
Akwụkwọ Nsọ kwuru, “Ma ọ buru na unu agbagharaghị mmadụ ndahie niile ha, Nna unu agaghị agbaghara unu ndahie unu.”
Ya mere, gịnị mere m kwesịrị iji gbaghara? N'ihi na Chineke nyere ya n’iwu. Ịhọrọ ịhapụ ihe mgbu na ụfụ nke mmejọ, ma nye mgbaghara abụghị adịghị ike maọbụ nzuzu, kama, ọ bụ ịhọrọ ịkwanyere Chineke ùgwù ma rube isi ná ntụziaka ya. Ọ bụ maka ọdịmma anyị. Amara Chineke zuru ezu iji nyere anyị aka ịgafe usoro ahụ.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Mgbaghara bụ otu ibe dị oke mkpa na ndụ onye Kraịst, maka iji nwee udo na udi mmekọrịta na-eto eto n’ebe ya na Chineke na mmadu nọ. Ọ bụghị naanị na Jizọs ji ndụ ya kọwarịgharịa mgbaghara site na nkuzi ya, o nyekwazịrị amara achọrọ iji nara ma nyekwa mgbaghara site na Mmụọ ya. Enyela nwa Chineke ọbụla ike irube isi n’iwu Chineke nyere ka agbaghara ndị ọzọ otu e si gbaghara ha.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Mount Zion Faith Ministry maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://mountzionfilm.org/