Alụmdi na Nwunye dịka Chineke si ZubeIhe Atụ
Isiokwu Alụmdi na Nwunye Ise
Iji ghọta nke ọma ihe Chineke bu n’obi mgbe Ọ ghaziri mmekọrịta dị ebube bụ nke na-adịru ogologo ndụ dị n’etiti nwoke na nwaanyị, ọ bara uru ịtụle isiokwu ise a na-esonụ nke alụmdi na nwunye.
Isiokwu nke mbụ bụ Mmekọrịta, dịka anyị gụgoro n'ime ụbọchị ole na ole gara aga. Adam nwere ezi ihe na-agara ya nke ọma n’ogige Iden, tupu Iv abata. N'agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị mma ka ọ nọrọ naanị ya. Ma ọ ghọtara maọbụ na ọ ghọtaghị, ọ chọkwara onye inye aka na onye ya na ya ga na-akpakọrịta dị iche.
Isiokwu nke abụọ nke alụmdi na nwunye bụ Ọ̀mụ̀mụ̀. Chineke gọziri Adam na Iv, gwa ha ka ha mụọ ụmụ, bụ́ ndị ga-amụba ụmụ, site etu a jupụtakwa n’ụwa. N'ihi ọtụtụ ihe, ọ bụghị di na nwunye ọbụla nwere ụmụ, mana alụmdi na nwunye na ezinaụlọ bụ ezigbo atụmatụ nke Chineke tụpụtara iji kee mmadụ.
Isiokwu nke atọ nke alụmdi na nwunye bụ Mkpọsa. Alụmdi na nwunye bụ ihe nnọchianya dị ndụ na-eku ume nke Kraịst na Nzukọ nsọ. Ịdịgide adịgide, ịdị n’otu, na mmekọrịta chiri anya dị nnọọ mkpa n’alụmdi na nwunye, dị ka anyị na-atụle ọkpụkpọ òkù anyị nwere igosipụta ịhụnanya na nkwenye Jizọs n’ebe ụwa nọ site n’alụmdi na nwunye anyị.
Isiokwu nke anọ nke alụmdi na nwunye bụ Ịdị Ọcha. Onyinye Chineke magburu onwe ya bụ inwe mmekọedina, bụ nke e mebere ka ọ bụrụ na mgbe a ga-emepe ya bụ naanị n'ime nchekwa na ịdị nsọ nke alụmdi na nwunye. Alụmdi na nwunye bụ ụzọ Chineke dobere iji chebe anyị pụọ na adịghị ọcha na ịkwa iko. .
Isiokwu nke ise nke alụmdi na nwunye bụ Obi Ụtọ (nke metụtara Ịdị Ọcha). Otu n'ime ngọzi magburu onwe ya nke alụmdi na nwunye na-enye bụ ihe ùgwù, nke igori njikọ anụ ahụ na nchebe nakwa n’ọnọdụ kwụsiri ike. Ị gaghị enwe ike imeghe onwe gị maọbụ amata gị nke ọma karịa mgbe gị na mmadụ na-enwe mmekọedina, alụmdi na nwunye na-enye nke ahụ n’ebe e nwere ntụkwasị obi na ịhụnanya. Ọ bụ nke a mere na ekwesịghị ntụkwasị obi na-ebemi ebemi. O bu igharipu onye gi na ya kacha chiri anya.
Alụmdi na nwunye bụ onyinye magburu onwe ya n'ihi na o si n’aka Onye kere anyị nke jupụtara n'ịdị mma. Anyị niile kwesịrị ịchọta ụzọ isi kwanyere alụmdi na nwunye ùgwù - etú anyị si ekwu banyere ya, etú anyị si achụso ya, etú anyị si ebi ndụ na ya, na etú anyị si agba ndị nọ n’ime ya ume. Anyị ga-eme nke a n’ihi na alụmdi na nwunye si n’aka Chineke, ọ na-ekwukwa banyere Chineke. Ọ bụkwa otu ụzọ maka nkwenye ogologo ndụ nye otu onye n’ikwesị ntụkwasị obi na ịhụnanya - foto nke ịhụnanya Kraịst nwere maka, na nkwenye na, Nzukọ nsọ Ya. Ka otuto diri Chineke n’ihi nnukwu onyinye a O nyere.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ma ị lụọla di maọbụ nwunye maọbụ na ị ka chọrọ ịlụ alụ, atụmatụ ịgụ akwụkwọ ụbọchị atọ a ga-enyere gị aka ịchọpụta ezigbo atụmatụ Chineke maka ofufe nrù ndụ niile nke di na nwunye. Mụta ka esi ele enyo ịhụnanya Jizọs nwere maka nwunye ya, bụ Nzukọ nsọ, site n'ịchọgharị isiokwu nke mmekọrịta, ịmụ nnwa, mkpọsa, ịdị ọcha na ihe ụtọ.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kip' Chelashaw maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://christchurchke.org/