Alụmdi na Nwunye dịka Chineke si ZubeIhe Atụ
Okike nke Alụmdi na Nwunye
Chineke haziri alụmdi na nwunye maka mmezu na ime nke ọma nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma n'agbanyeghị na alụmdi na nwunye na-ada ada n'akụkụ mbà ụwa ụfọdụ, ọ ka so n’ezi atụmatụ Chineke nwere maka ndị Ya. Ụfọdụ ndị mmadụ kwenyere na alụmdi na nwunye bụ ewumewu pụrụla n’egwu nke na-amachibido mmadụ iwu, ebe ndị ọzọ na-eche maka alumdi na nwunye dị ka nke ịhụnanya na-ejubiga ókè n’ime ya, echiche nke na-eduga n’ọgba aghara. Ma Chineke zubere ka alụmdi na nwunye bụrụ mmekọrịta ịhụnanya nke na-adị ogologo ndụ, nraranye onwe, na-eṅomi ịhụnanya Jizọs nke na-adịgide, bụ nke O nwere n'ebe nwunye Ya, bụ́ Nzukọ nso nọ. N'ihi ya, alụmdi na nwunye bụ ihe anyị kwesịrị iji kpọrọ ihe.
Alụmdi na nwunye mbụ ahụ weere ọnọdụ na mmalite oge, n’ime ogige Iden, n’etiti Adam na Iv. E si n’aja kee Adam, tupu Iv abata n’ihe a na-eme, Chineke gwara Adam ka ọ rụọ ọrụ n’ụwa ma chebe ya. Ya mere, e sizi n’Adam wee kee Iv (Anyị nwere ike ịsị na Adam bụ ‘ihe nlereanya’, ebe Iv bụ ụdị mbụ!) Ọ dị mkpa iburu n’obì na nwoke ahụ kwesịrị ịbụ onye na-arụ ọrụ maọbụ onye na-eweta ihe ndị be ya ga na-eri, na ọ ga-abụkwa onye nchebe - otu. onye na-elekọta ma na-achọ ọdịmma nke ndị niile gbara ya gburugburu. Tupu mmadụ adaba na mmehie, Chineke nyere anyị ọrụ anyị ga-arụ ma kpọọ ya ihe ọma.
Ka Chineke nyechara Adam ọrụ inye na nchebe, O kwupụtara nchegbu Ya banyere etu Adam si nọrọ naanị ya. Nke a bụ naanị ihe na-adịghị mma n’ime ụwa zuru okè, na-enweghị mmehie. Nke a na-arụga aka n’ezie mkpa alụmdi na nwunye dị. Anyị chọrọ ibe anyị!
Ọ bụkwa ihe na-adọrọ mmasị na Adam abịarughị Chineke nso ịchọ onye ga-anọnyere ya. Ọ bụ Chineke ghọtara mkpa Adam ma wee nye ya ihe dị ya mkpa. Ọ bụ ezie na Adam nwere ubi mara mma nke na-eme nri, nwekwaa ìgwè nnụnụ na anụmanụ, ọ dị ihe na-efunahụ ya. Akụ na ụba na ihe onwunwe ezughị. Adam chọrọ onye inye aka, onye ga-anọnyere ya, onye ya na ya ha, bụ nke ya na ya ga-enwe ike ịkparịta nkata nakwa onye o nwere ike ịgbasa izu. Anyị nwere ike isi na nke a nweta agbamume. Chineke maara anyị, Ọ maara ihe dị anyị mkpa karịa ka anyị onwe anyị si mata, O nwekwaziri ike inye anyị ihe ahụ dị anyị mkpa.
Ọ bụrụ na ị lụbeghị di maọbụ nwunye ma chọọ ịlụ, na-ekpe ekpere kwa ụbọchị ka Chineke mee ka ị mata onye nke Ị ga-alụ. Wepụta oge iji nye ekele n’ihi na alụmdi na nwunye abụghị ihe mmadụ kere. Ọ bụ onyinye sitere n'aka Chineke iji nyere anyị aka ime nke ọma n’obodo ma mata mmekọrịta anyị na onye ọzọ n’ụzọ miri emi. Alụmdi na nwunye bụ ewumewu ochie - ma ọ bụghị nke pụgoro n’egwu. Site n’etu e si kee anyị, anyị nwere mkpa ka anyị na onye ọzọ na-adịghị ka anyị na-enwe mmekọ. Ọ bụ ezi echiche Chineke iji mma nke nkwa ogologo ndụ gọzie anyị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ma ị lụọla di maọbụ nwunye maọbụ na ị ka chọrọ ịlụ alụ, atụmatụ ịgụ akwụkwọ ụbọchị atọ a ga-enyere gị aka ịchọpụta ezigbo atụmatụ Chineke maka ofufe nrù ndụ niile nke di na nwunye. Mụta ka esi ele enyo ịhụnanya Jizọs nwere maka nwunye ya, bụ Nzukọ nsọ, site n'ịchọgharị isiokwu nke mmekọrịta, ịmụ nnwa, mkpọsa, ịdị ọcha na ihe ụtọ.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kip' Chelashaw maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://christchurchke.org/