Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nye Chineke Ọnọdụ MbụIhe Atụ

Nye Chineke Ọnọdụ Mbụ

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

“Atụmatụ Ise maka Ibi Ndu Mmeri”.

Nkebi a na-enye atụmatụ 5 nke dabeere na Bible maka imegide mmehie na ọnwụnwa nke ọma. Itinye atụmatụ a n'ọrụ bụ otu ụzọ ọzọ isi nye Chineke ọnọdụ mbụ na ndụ gị!

1. GHỌTA NA CHINEKE NA-AHỤ GỊ DIKA ONYE ZURU OKE, DI NSỌ NA ENWEGHI NTỤPỌ, site n'ọrụ nke Jizọs Kraịst. (Gụọ II Ndị Kọrịnt 5:21.) Ọtụtụ mgbe, obi amamikpe na ihere bụ ihe kacha emebi ihe n’ime ihe mmehie na-akpata. Ịghọta na ọ dịghị amamikpe dịrị ndị nọ na Kraịst, n'agbanyeghị mmehie ahụ, bụ ihe dị mkpa maka mmeri (Ndị Rom 8:1).

2. KWUPỤTA MMEHIE GỊ. (Gụọ I Jọn 1:9.) Ikwupụta mmehie anyị pụtara ibu ụzọ kwete na anyị mehiere n’ime obi anyị na n’uche anyị ma kwupụta ha n’ihu Chineke. Ikwupụta mmehie anyị apụtachaghị ime ka ndị ọzọ mara ha. Nkwuputa dị n'etiti gị na Chineke.

3. BỤRỤ ONYE NA-AZARAỌNỤ YA. (Gụọ Jemes 5:16.) Ịchọta ezigbo enyi, pastọ ma ọ bụ onye ezinụlọ gị bụ́ Onye Kraịst ị tụkwasịrị obi bụ́ onye ị pụrụ ịkọrọ ihe nzuzo gị bụ ụzọ dị irè isi webata nzaraọnụ na nkwado ekpere n’agha ahụ.

4. ZERE ỤZỌ ỌNWỤNWA SI ABỊA. (Gụọ Jemes 1:13-15.) Nke a bụ akuku na-esikari ike, ọ na-achọkwa echiche okike na omume atụmatụ ụfọdụ ime. Nke bụ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ị nwere ike ịgbanahụ ọnwụnwa ahụ, ị ga-ezere mmehie ahụ.

5. GỤỌ OKWU CHINEKE. (Gụọ Abụ Ọma 119:11.) Okwu Chineke na-agwa anyị hoo-haa na ka anyị ‘na-ezobe ya n’obi anyị,’ ọ na-enye ume pụrụ iche ịgbanarị ọnwụnwa na mmehie.

Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nye Chineke Ọnọdụ Mbụ

Inye Chineke ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị abụghị ihe omume otu mgbe . . . ọ bụ usoro nke ogologo ndụ nke Onye Kraịst ọ bụla. Ma ị bụ onye ọhụrụ n’okwukwe ma ọ bụ onye “nara eso ụzọ Kraịst”, ị ga-ahụta atụmatụ a ka ọ dị mfe nghọta na itinye n’ọrụ, yana atụmatụ dị irè nke ukwuu maka ibi ndụ Ndị Kraịst na-emeri.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig